Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 37


Nkeji 37

Mkpughe e nyere Joseph Smith onye-amụma na Sidney Rigdon, na-nso Fayette, New York, Disemba 1830 (History of the Church, 1:139). N’ebe a ka e nyere iwu-nsọ nke mbụ gbasara mkpọkọta n’ọgbọ nke a.

1–4, Ndị-nsọ ka akpọrọ ka ha gbakọọ na Ohio.

1 Lee, a sị m unu na ọdịghị m mkpa ka unu gaa-n’iru na antụgharị-ọzọ ruo mgbe unu ga-aga Ohio, ma nke a maka ndị-iro na maka unu onwe unu.

2 Ma ọzọ, a sị m unu ka unu ghara ị ga-ruo mgbe unu kwusara ozi-ọma m n’ebe ahụ, ma gbaa nzukọ-nsọ ume ebe ọbụla a chọpụtara ya, ma nke kachasị na aColesville; n’ihi, lee, ha na-ekpe ekpere jiri nnukwu okwukwe nye m.

3 Ma ọzọ a ga m enye nzukọ-nsọ iwu-nsọ, na ọdị m mkpa na ha ga-agbakọta na aOhio na-echere oge mgbe nwa odibo m Oliver Cowdery ga-alọkwuta ha.

4 Lee, n’ebe a ka amamihe dị, ma ka nwoke ọbụla ahọrọ nke onwe ya ruo mgbe m ga-abịa. Ọbụna otu a. Amen.