Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 7


Nkeji 7

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Oliver Cowdery, na Harmony, Pennsylvania, Epril 1829, mgbe ha jụrụ site na Urim na Tumim ma Jọn, onye na-eso-ụzọ ahụrụ n’anya, ma ọ dị ndụ n’anụ arụ ma-ọbụ na ọ nwụwọ. Mkpughe a bụ ntụgharị-asụsụ nke akụkọ-ndekọta Jọn dere n’akpụkpọ-anụ ọhịa ma zoo kwa ya n’onwe ya (History of the Church, 1:35–36).

1–3, Jọn Onye ahụrụ n’anya ga-adị ndụ ruo mgbe Onye-nwe ga-abịa; 4–8, Pịta, Jemes, na Jọn ji ọtụghe-ụzọ nile nke ozi-ọma.

1 Ma Onye-nwe sịrị m: Jọn, onye m ahụrụ n’anya, gịnị ka ị bchọrọ? N’ihi na ọbụrụ na ị ga-arịọ ihe ọbụla ị chọrọ, a ga-enye gị ya.

2 Ma a sịrị m ya: Onye-nwe, nye m ike karịrị aọnwụ, ka m wee nọrọ ndụ ma na-enweta ọtụtụ mkpụrụ-obi nye gị.

3 Ma Onye-nwe sịrị m: N’ezie, n’ezie, a sị m gị, n’ihi na ị chọrọ nke a ị aga-anọ ruo mgbe m ga-abịa bn’ebube m, ma cga-ebu amụma n’iru mba nile, ebo nile, asụsụ nile na ndị mmadụ nile.

4 Ma n’ihi nke a Onye-nwe sịrị Pịta: Ọbụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ bụ gịnị n’ebe ị nọ? N’ihi na ọ chọrọ ka ọ nọrọ na-eweta ọtụtụ mkpụrụ obi nye m, mana ị chọrọ ka ị bịakwụte m ọsọ-ọsọ an’ala-eze m.

5 A sị m gị, Pịta, nke a bụ ọchịchọ ọma; kama onye m hụrụ n’anya achọwo ka o mee karịa, ma-ọbụ ọrụ dị nnukwu karịa n’etiti mmadụ karịa ihe o meworo na mbụ.

6 E, ọ nakwerewo ịrụ ọrụ dị nnukwu karịa; ya mere a ga m eme ya dịka ọkụ na-enwu enwu na mụọ-ozi ana-ezi ozi-ọma; ọ ga-ezi ndị ahụ ga-abụ bndị-nketa nke nzọpụta ndị nke nọ n’elu cụwa ozi-ọma.

7 Ma a ga m eme gị ka ị zisaara ya nakwa n’ihi nwanne gị nwoke Jemes; ma nye unu atọ a ga m enye ike nke a na aọtụghe-ụzọ nile nke mgbasa ozi-ọma nke a ruo mgbe m ga-abịa.

8 N’ezie a sị m unu, unu abụọ ga-enwe dịka ọchịchọ unu siri dị, n’ihi unu abụọ na-enwe aọn̄ụ n’ime ihe ahụ unu chọworo.