Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 54


Nkeji 54

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Newel Knight, na Kirtland, Ohio, Jun 1831 (History of the Church, 1:180–181). Ndị-otu Nzukọ-nsọ na ngalaba dị na Thompson, Ohio, nwere nkewa n’ajụjụ ndị metụtara nnyefechasị arịa nile. Ịchọ-nke onwe na oke-ọchịchọ pụtara ìhè, ma Leman Copley emebiwo ọgbụgba-ndụ ọ gbara inyefechasị nnukwu ubi ya dịka ihe-nketa nke Ndị-nsọ na-abịarute site na Colesville, New York. Ezra Thayre bịakwara daba n’ime arụmarụ ụka ahụ. N’ihi nke a, Newel Knight (onye-isi nduzi ngalaba dị na Thompson) na ndị okenye ndị ọzọ bịakwutere Onye-amụma na-ajụ otu a ga-esi aga-n’iru. Onye-amụma jụrụ Onye-nwe ma nata mkpughe nke a. (Lee nkeji 56, nke be ebe okwu a gara n’iru.)

1–6, Ndị-nsọ nile aghaghị idebe ọgbụgba-ndụ ozi-ọma iji nweta ebere; 7–10, Ha aghaghị inwe ndidi n’ime mkpagbu.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru, ọbụna aAlfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ ọbụna ya onye ahụ nke a bkpọgburu maka mmehie nile nke ụwa.

2 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m gị, nwa odibo m Newel Knight, ị ghaghị iguzosike n’ọkwa-ọrụ nke ahụ m hopụtaara gị.

3 Ma ọ bụrụ na ụmụ nne gị nwoke chọrọ ịgbanarị ndị iro ha nile ka ha chegharịa site na mmehie ha nile, ma dịrị aumeala n’ezie n’iru m ma nwekwa mụọ nke nchegharị.

4 Ma dịka aọgbụgba-ndụ ha mere n’iru m e mebiworị, ọbụna otu a ọ bụrụwo bihe efu n’abaghị kwa n’ihe.

5 Ma ahụhụ ga-adịrị ya bụ onye ammebi iwu a ga-esi n’aka ya bịa, n’ihi na ọ kara ya mma na o mikpuru n’ogbu nke oke osimiri.

6 Mana ngọzi na-adịrị ndị debere ọgbụgba-ndụ ma debekwa iwu-nsọ, n’ihi na ha ka a ga-emere aebere.

7 Ya mere, gaa nụ ugbua gbapụ n’ala ahụ, ka ndị iro unu ghara ịbịakwute unu; ma gaa nụ njem unu, ma họpụta onye unu chọrọ ka ọ bụrụ onye-ndu unu, ma kwụọrọ unu ego unu nile.

8 Ma otu a ka unu ga-aga njem unu baa na mpaghara nile n’ọdịda anyanwụ, ruo n’ala nke aMissouri, ruo n’oke ala nile nke ndị Leman.

9 Ma mgbe unu gasịrị-njem, lee, a sị m unu, chọọ nụ ụzọ aibi ndụ dịka ndị mmadụ, ruo mgbe m dozichaara unu ebe.

10 Ma ọzọ, nwee andidi n’ime mkpagbu ruo mgbe m bga-abịa; ma, lee a na m abịa ọsọ-ọsọ, ma ụgwọ ọrụ m dịkwa n’aka m, ma ndị nke cchọrọ m site na mbụ ga-enwe dezumike nye mkpụrụ-obi ha nile. Ọbụna otu a. Amen.