Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 30


Nkeji 30

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye David Whitmer, Peter Whitmer, Nta, na John Whitmer, na Fayette, New York, Septemba 1830, mgbe e mesịrị ọgbakọ ụbọchị atọ na Fayette, mana tutu ndị okenye nke Nzukọ-nsọ a nọrọ rịị iche-iche (History of the Church, 1:115–116). Na mbụ, e bipụtara ozị a dịka mkpughe atọ, emekọtara ya n’otu nkeji site n’aka Onye-amụma n’ihi ụdị mbipụta nke 1835 nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile.

1–4, David Whitmer wee taa ahụhụ maka ịda mba ya n’ife ofufe ya n’irusi ọrụ ike; 5–8, Peter Whitmer, nta, ga-esoro Oliver Cowdery jee ozi nye na ndị Leman; 9–11, John Whitmer ka akpọrọ maka ịkwụsa ozi-ọma.

1 Lee, a sị m gị aDavid na ị btụrụ mmadụ ụjọ ma ị cdabereghị na m maka ike dịka i kwesịrị.

2 Kama uche gị nọkwarịị n’ihe nile nke aụwa karịa n’ihe nile nke m, Onye meworo gị, na ịgbasa ozi nke a kpọworo gị, ma ị geghị ntị n’olu nke mụọ m, ma nye ndị edoro ịlekọta gị kama ị kwenyeere ndị m na-enyeghị ịwu.

3 Ya mere, a hapụrụ gị ka ị jụọ maka onwe gị n’aka m, ma atụgharịa uche n’ihe ndị ị natara.

4 Ma ebe obibi gị ga-abụ n’ụlọ nna gị ruo mgbe m ga-enye gị iwu-nsọ ndị ọzọ. Ma ị ga-aga aije ozi n’ime nzukọ-nsọ ma n’iru ụwa ma na mpaghara nile gbara ebe ahụ gburu-gburu. Amen.

5 Lee, a sị m gị aPeter, na ị bga-eje ije gị na nwanne gị nwoke Oliver, n’ihi na coge ahụ eruwo mgbe m chere dị mkpa na ị ga-emeghepụ ọnụ gị kwusaa ozi-ọma nke m, ya mere atụla ụjọ, kama dnụrụ okwu m nile na ndụmọdụ nke nwanne gị nwoke, nke ọ ga-enye gị.

6 Ma ka a kpagbuo gị na mkpagbu ya nile, na-ewelite obi gị mgbe nile nye m n’ekpere na okwukwe, n’ihi nnapụta gị na ya; n’ihi na e nyewo m ya ike iwulite anzukọ-nsọ m elu n’etiti bndị Leman;

7 Ma onweghị onye m nyere ọkwa ka ọbụrụ ya onye ndụmọdụ an’isi ya na nzukọ-nsọ, gbasara okwu nzukọ-nsọ nile, m’ọbụghị nwanne ya nwoke, Joseph Smith, Nta.

8 Ya mere, nụrụ ihe ndị a nile, ma rụsị ọrụ ike n’idebe iwu-nsọ m nile, ma a ga-agọzi gị ruo na ndụ ebighi-ebi. Amen.

9 Lee, a si m gị, nwa odibo m John, na ịga-amalite site na ugbu a gaa-n’iru aịma-ọkwa ozi-ọma nke m, dịka iji bolu nke opi.

10 Ma ọrụ gị ga-abụ n’ụlọ nwanne gị Philip Burroughs, ma na mpaghara nile gbara ebe ahụ gburu gburu, e, ebe nile ha ga-ege nti ruo mgbe mụ nyere gị iwu ka isite ebe ahụ laa,

11 Ma ọrụ gị nile ga-abụ na Zaịọn, jiri mkpụrụ obi nile, site ugbu a ga-n’iru, e, ị ga emepe ọnụ gị mgbe nile n’ọrụ m, ana-atụghị egwu ihe bmmadụ nwere ike ime, n’ihi na mụ onwe m cnọnyeere gị. Amen.