Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 2


Nkeji 2

Ndepụta sitere n’okwu nile nke mụọ-ozi Mononaị nye Joseph Smith Onye-amụma mgbe ọ nọ n’ime ụlọ nna nke Onye-amụma na Manchester, New York, mgbe anyasị 21 Septemba 1823 (History of the Church, 1:12). Moronaị bụrịị onye nke ikpe-azụ na ahịrị ndị ọkọ-akụkọ ndị nke mere ndekọta nke a nọ ugbụ a n’iru ụwa dịka Akwụkwọ nke Mọmọn. (Tulee Malakaị 4:5–6; na kwa nkeji nile 27:9; 110:13–16; na 128:18.)

1, Elaịja ga-ekpughe ọkwa nchụ-aja ahụ; 2–3, Nkwa nile nke ndị-nna nile ka a kụrụ n’ime n’obi ụmụ ha nile.

1 Lee, a ga m ekpughe nye unu Ọkwa Nchụ-aja ahụ, site n’aka nke aElaịja onye-amụma, tutu ọbịbịa nke bnnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onye-nwe.

2 Ma a ga-akụnye n’ime obi ndị bụ ụmụ bnkwa nile e kwere ndị nna ha, ma obi ndị bụ ụmụ ga-atụgharịkwute ndị bụ nna ha.

3 Asị na ọ bụghị otu a, ụwa nile ga-abụ ihe lara n’iyi n’ọbịbịa nke Onye-nwe.