Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 14


Nkeji 14

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye David Whitmer na Fayette, New York, Jun 1829 (History of the Church, 1:48–50). Ezi na ụlọ Whitmer enwewo nnukwu nmasị na ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Onye-amụma hiwere ebe-obibi ya n’ụlọ Peter Whitmer, Ukwu, ebe o biiri rue mgbe ọrụ ntụgharị-asụsụ gwụsịrị ma enwetakwa ikike-iwu akwụkwọ ahụ ga-abịa. Ụmụ nwoke atọ nke Whitmer, ebe nke ọbụla n’ime ha nwetaworo ọgbụgba-ama maka ezi-okwu nke ọrụ a, bịara nwee nmetụta dị omimi gbasara ọru nke onye ọbụla n’ime ha na-arụ. Mkpughe nke a na nkeji abụọ ndị na-eso (nkeji 15 na 16) ka e nyere n’ọzịza nke ajụjụ site na Urim na Tumim. David Whitmer mechara bụrụ otu n’ime Ndị-aka-ebe Atọ nye Akwụkwọ nke Mọmọn.

1–6, Ndị-ọrụ n’ubi-vine ga-enweta nzọpụta; 7–8, Ndụ ebighi-ebi bụ ihe nke kachasị ukwuu n’onyinye nile nke Chineke; 9–11, Kraịst kere elu-igwe nile na ụwa.

1 aOke ọrụ dị ịtụ n’anya na-abịa ị pụta n’etiti ụmụ nke mmadụ.

2 Lee, a bụ m Chineke; gee ntị n’ọkwu m, nke dị ndụ ma dịkwa ike, dị kwa nkọ karịa nma-agha ọbụla nke nwere iru abụọ, rue na nkewa nke ma njikọ nile na ụmị; ya mere gee nti n’okwu m.

3 Lee, ụbị ahụ chara-acha na-eche owuwe ihe-ụbị, ya mere, onye chọrọ ịghọ ka ọ tụba nma iwe ihe-ubi ya n’ike ya ma ghọọ mgbe oge dị, ka ọ wee kwadoro mkpụrụ-obi ya nzọpụta nke mgbe nile na-adigide n’ime ala-eze nke Chineke.

4 E, onye ọbụla ga-atụba nma iwe ihe-ubi ya ma ghọọ, onye ahụ bụ onye Chineke kpọrọ.

5 Ya mere, ọ bụrụ na ị ga-arịọ m ị ga-anata; ọbụrụ na ị ga-akụ aka a ga-emeghere gị.

6 Chọọ ka i wepụta ma hiwe Zaịọn m. Debe iwu-nsọ m nile n’ime ihe nile.

7 Ma, ọbụrụ na ị adebe iwu-nsọ m nile ma bnọgide ruo ọgwụgwụ ị ga-enwe cndụ ebighi-ebi, nke bụ onyinye nke kachasị ukwuu n’onyinye nile nke Chineke.

8 Ma ọ ga-eru, ma ọbụrụ na ị rịọ Nna n’aha m, n’okwukwe kwere, i ga-anata aMụọ Nsọ, nke na-enye ọnụ-okwu, ka i nwee ike guzoro dịka bonye-aka-ebe nke ihe ị cga-anụ ma hụkwa, nakwa ka ị nwee ike ikwupụta nchegharị nye ọgbọ nke a.

9 Lee, a bụ m aJisus Kraịst bỌkpara nke cChineke dị ndụ, onye dkere elu-igwe nile na eụwa, fìhè nke a n’apụghị izo-ezo gn’ọchịchịrị;

10 Ya mere, a garịrị m ewepụta ozi-ọma m an’uju site na bndị Jentaịlụ nye ụlọ nke Israel.

11 Ma lee, ị bụ David, ma a kpọrọ gị ka i nye-aka; ihe nke bụ ị mee, ma kwesị ntụkwasị-obi, a ga-agọzi gị n’ihe nke mụọ na nke arụ, ma ukwuu ka ụgwọ-ọrụ gị ga-adị. Amen.