Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 50


Nkeji 50

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, Mee 1831 (History of the Church, 1:170–173). Onye-amụma kwuru na ụfọdụ ndị okenye aghọtaghị ngosipụta nke mụọ dị iche-iche na mba ndị-ọzọ n’elu ụwa ma na mkpughe nke a ka e nyere n’ọzịza nye njụta ya pụrụ-iche n’okwu a. Nke a kpọrọ ihe-omume nke mụọ abụghị ihe n’adịghị n’etiti ndị-otu, ụfọdụ n’ime ha na-ekwu na ha na-enweta ọ́hụ̀ nile na mkpughe nile.

1–5, Ọtụtụ mụọ ụgha nile nọ na mba nile n’ụwa; 6–9, Ahụhụ ga-adịrị ndị iru-abụọ na ndị e bepụrụ site na Nzukọ-nsọ; 10–14, Ndị okenye nile ga-ekwusa ozi-ọma site na Mụọ; 15–22; Ma ndị na-ekwusa ozi-ọma ma ndị na-ege ntị kwesịrị ịnweta ama site na Mụọ; 23–25, Nke ahụ n’adịghị ebuli mụọ-elu abụghị nke sitere na Chineke; 26–28, Ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweta ihe nile; 29–36, Ekpere nile nke ndị asachara ka a na-aza; 37–46, Kraịst bụ Ezi Onye-ọzụzụ atụrụ ahụ na Nkume nke Israel.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, ma gee ntị n’olu Chineke dị ndụ; ma nụrụ okwu nile nke amamihe nke a ga-enye unu, dịka unu rịọworo ma kwere dịka ihe gbasara nzukọ-nsọ, na mụọ nile ndị gaworo na mba nile n’ụwa.

2 Lee, a sị m unu, na e nwere ọtụtụ mụọ ndị bụ amụọ ụgha, ndị gapụworo n’ụwa na-eduhie ụwa nile.

3 Ma kwa aSetan achoworịị iduhie unu, ka o wee merie unu.

4 Lee, mụ, Onye-nwe, elekwasịwo unu anya, ma ahụwokwa ihe arụ nile dị n’ime Nzukọ-nsọ nke ana-ekwupụta aha m.

5 Mana ngọzi ga-adịrị ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị-ọbi ma ana-anọgide, ma-ọbụ na ndụ ma-ọbụ n’ọnwụ n’ihi na ha ga-eketa ndụ ebighi-ebi.

6 Mana ahụhụ na-adịrị ha bụ andị na-eduhie na ndị iru-abụọ, n’ihi na, otu a ka Onye-nwe kwuru, a ga m ama ha ikpe.

7 Lee, n’ezie a sị m unu, e nwere andị iru-abụọ n’etiti unu, ndị duhieworo ụfọdụ, nke nyeworo bonye iro cike; mana lee ụdị dndị dị otu a ka a ga-akpọghachita.

8 Mana ndị iru-abụọ nile ka a ga-amata ma abepụ, ma-ọbụ na ndụ ma-ọbụ n’ọnwụ, ọbụna dịka m chọrọ; ma ahụhụ na-adịrị ha ndị e bepụrụ site na nzukọ-nsọ m, n’ihi na ndị ahụ ka ụwa ga-emeri.

9 Ya mere, ka onye ọbụla kpachara anya ka ọ ghara ime ihe n’anọghị n’ezi-okwu ma, ezi-omume n’iru m.

10 Ma ugbua a bịa, ka Onye-nwe kwụrụ, site na Mụọ, nye ndị okenye nke nzukọ-nsọ ya, ka anyị atụgharịakota uche, ka unu nwee nghọta.

11 Ka anyị tụgharịakọta uche ọbụna dịka mmadụ na ibe ya na-atụgharịkọta uche iru na iru.

12 Ụgbụ a, mgbe mmadụ na-atụgharị uche mmadụ ibe ya na-aghọta ya, n’ihi na ọ na-atụgharị uche dịka mmadụ; ọbụna otu a ka mụ, Onye-nwe, ga-atụgharịkọta uche mụ na gị ka unu wee nwee anghọta.

13 Ya mere, mụ Onye-nwe na-ajụ gị ajụjụ nke a—nye gịnị ka aechiri gị echichi?

14 Ikwusa ozi-ọma nke m site na aMụọ, ọbụna bOnye-nkasị-obi nke e zipụtara ịkuzi ezi-okwu ahụ.

15 Ma mgbe ahụ unu natara amụọ nile nke unu n’aghọtaghị, ma nabata ha ka nke sitere na Chineke; ma n’ime nke a ikpe ọmaghị unu?

16 Lee unu ga-aza ajụjụ nke a n’onwe unu; otu ọ sila dị, a ga m emere unu ebere; ya onye na-adịghị ike n’etiti unu ka a ga-eme ka o asie ike.

17 N’ezie a sị m unu, onye e chiri echichi site na m ma zipụkwa ya aikwusa okwu nke ezi-okwu site n’Onye-nkasị-obi ahụ, n’ime Mụọ nke ezi-okwu, ọ na-ekwusa ya site na bMụọ nke ezi-okwu ka ọ bụ n’ụzọ ọzọ?

18 Ma ọ bụrụ na ọ bụ n’ụzọ ọzọ ọ bụghị nke Chineke.

19 Ma ọzọ, onye ahụ nke na-anata okwu nke ezi-okwu, ọ na-anata ya site na Mụọ nke ezi-okwu ka ọ bụ site n’ụzọ ọzọ?

20 Ọ bụrụ na ọ bụ n’ụzọ ọzọ ọ bughị nke Chineke.

21 Ya mere, gịnị mere unu enweghi ike ighọta ma mata na onye na-anata okwu ahụ site na Mụọ nke ezi-okwu na-anata ya dịka ọ na-ekwusa ya site na Mụọ nke ezi-okwu?

22 Ya mere, onye na-ekwusa na onye na-anata, na-aghọta onwe ha, ma ha abụọ ka a ana-ebuli mụọ ha elu ma ha bna-an̄ụrịkọta on̄ụ.

23 Ma nke ahụ na-adịghị ebuli mụọ elu abụghị nke Chineke, ma bụ aọchịchịrị.

24 Nke ahụ bụ nke Chineke bụ aìhè; ma onye natara ìhè, ma bnọgide n’ime Chineke, ga-anata ìhè ckarịa; ma ìhè ahụ ga na-amuke karịa ma na-amuke karịa tutu ruo ụbọchị ahụ zuru oke.

25 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ma a na m ekwu ya ka unu wee mata aezi-okwu, ka unu wee chụpụ ọchịchịrị site n’etiti unu;

26 Ya onye e chiri echichi site na Chineke ma e zipụkwa ya, onye ahụ ka a họpụtara ka ọ bụrụ aonye kachasị, na-agbanyeghị ọ kachasị nta ma bụrụ bodibo mmadụ nile.

27 Ya mere, ọ bụ aonye nwere ihe nile; n’ihi na ihe nile nọ n’okpuru ya, ma n’elu-igwe ma n’ụwa, ndụ ahụ na ìhè ahụ, Mụọ ahụ na bike ahụ, e zipụrụ site n’ọchịchọ nke Nna site na Jisus Kraịst, Ọkpara ya.

28 Mana onweghị onye nwere ihe nile m’ọbụghị ma a asachara ya ma bmee ka ọdị ọcha site na mmehie nile,

29 Ma ọbụrụ a sachara ma mee ka unu dị ọcha site na mmehie nile, unu aga-arịọ ihe ọbụla unu chọrọ n’aha nke Jisus ma a ga-eme ya.

30 Mana mata nke a, a ga-enye unu ihe unu ga-arịọ; ma otu a a họpụtara unu an’isi, mụọ nile ahụ ga-anọ n’okpuru unu.

31 Ya mere, ọ ga-eru, na ọ bụrụ na unu hụ ngosipụta nke amuọ nke unu anaghị aghọta, ma unu anabataghị mụọ ahụ, unu ga-arịọ Nna n’aha nke Jisus; ma ọbụrụ na o nyeghị unu mụọ ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-amata na ọ bụghị site na Chineke.

32 Ma a ga-enye unu aike karịrị mụọ ahụ; ma unu ga-ama ọkwa megide mụọ ahụ n’olu ike na ọ bụghị site na Chineke.

33 Ọ bụghị iji aokwu ọjọọ mmegide, ka aghara imeri unu, ma-ọbụ bitu-ọnụ ma-ọbụ an̄ụrị, ka e wee ghara ijichi unu ebe ahụ.

34 Ya onye natara site n’aka Chineke, ka ọ gụọ ya dịka ihe sitere na Chineke; ma ka ọ n̄ụrịa na ọ bụ onye a gụrụ tozuru-oke ịnata site na Chineke.

35 Ma site n’ikwere na ime ihe ndị a nke unu nataworo, na nke unu ga-anata ma emesịa—ma aala-eze bụ nke Nna nyeworo unu, ma bike imeri ihe nile a na-esiteghị na ya chie.

36 Ma lee, n’ezie a sị m unu ngọzị na-adịrị unu ndị na-anụ okwu m ndị a ugbụ a site n’ọnụ nwa odibo m n’ihi na mmehie unu ka a agbagharaworo unu.

37 Ka nwa odibo m Joseph Wakefield, onye ihe ya dị m ezi mma, na nwa odibo m aParley P. Pratt gagharịa n’etiti nzukọ-nsọ nile ma gbaa ha ume site n’okwu bagbam ume;

38 Na kwa nwa odibo m John Corrill, ma-ọbụ ka ha ra bụ ndị odibo m ndị e chiri echichi n’ọkwa-ọrụ nke a, ma ka ha rụọ ọrụ n’ime aubi vine; ma ka onye ọbụla ghara igbochi ha ime nke ahụ m họpụtaworo ha—

39 Ya mere, n’ime ihe a, nwa odibo m aEdward Partridge abụghị onye ikpe na-amaghị; otu o sila dị ka o chegharịa ma a ga-agbaghara ya.

40 Lee, unu bụ ụmụ-ntakịrị ma unu agaghị aanagide ihe nile ugbụ a; unu aghaghị bito cn’amara ma na ọmụma-ihe nke dezi-okwu.

41 aAtụla ụjọ, bụmụ-ntakịrị n’ihi na unu bụ nke m, ma cemeriwo m ụwa, ma unu so n’ime ndị ahụ Nna m dnyeworo m;

42 Ma onweghị otu n’ime ndị a Nna nyere m aga-efu.

43 Ma Nna na mụ bụ aotu. A nọ m n’ime Nna, ma Nna nọ n’ime m; ma ọbụrụraa na unu anabatawo m, unu nọ n’ime m ma mụ n’ime unu.

44 Ya mere, a nọ m n’etiti unu, ma a bụ m aezi onye-ozuzu-atụrụ ahụ, na bnkume nke Israel. Onye wuru ụlọ n’elu cnkume nkea dapụghị ịda.

45 Ma ụbọchị ahụ na-abịa mgbe unu ga-anụ olu m na ahụ m, ma mata na a bụ m.

46 aChee nche, ya mere, ka ị wee nọrọ na bnjikere. Ọbụna otu a. Amen.