Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 73


Nkeji 73

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Hiram, Ohio, 10 Jenuarị 1832 (History of the Church, 1:241–242). Site na oge mmalite nke Disemba gara-aga, Onye-amụma na Sidney nọgidesiri ikwusa ozi-ọma, ma site n’otu a ha rụrụ nnukwu ọrụ n’ibelata mmetụta echiche ọgbachi nke maliteworo megide nzukọ-nsọ (lee isi-ọkwu Nkeji 71).

1–2, Ndị Okenye ga-aga n’iru ikwusa ozi-ọma; 3–6, Joseph Smith na Sidney Rigdon ga-aga n’iru ịtugharị asụsụ Bible ruo mgbe ọ ga-agwụ.

1 N’ihi na n’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru, ọ dị m mkpa na aha ga aga n’iru ikwusa ozi-ọma ahụ, na ịgba-ume nye nzukọ-nsọ nile dị na mba nile gbara gburu gburu, rue n’oge ọgbakọ;

2 Ma mgbe ahụ, lee ọ ga-eme ka ha mata, site an’olu nke ọgbakọ, ozi dị iche iche.

3 Ugbụ a, n’ezie a sị m unu ndị odibo m, Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon, ka Onye-nwe, kwuru ọ adị m mkpa unu bịtụgharị kwa asụsụ ọzọ;

4 Ma, ọ burura na ọ ga-ekwe mee, ikwusa ozi-ọma na mpaghara nile gbara gburu gburu rue n’oge ọgbakọ; ma mgbe nke ahụ gasịrị ọ dị mkpa ka ọrụ ntụgharị asụsụ gaa n’iru rue mgbe ọ gwụrụ.

5 Ma ka nke a bụrụ ihe nlere anya nye ndị okenye rue mgbe mmata-ihe ọzọ, ọbụna dịka e deworo ya.

6 Ugbụ a agaghị m enye unu ọzọ n’oge a. aKee ihe-okike n’ukwu unu ma nweenụ anya ụdo. Ọbụna otu a. Amen.