Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 106


Nkeji 106

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 25 Novemba 1834 (History of the Church, 2:170–171). Mkpughe nke a ka enyere maka Warren A. Cowdery, Onye bụ nwanne nwoke okenye nke Oliver Cowdery.

1–3, Warren A. Cowdery ka akpọrọ dịka onye-ọrụ ga-anọ n’isi na ebe a; 4–5, Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ agaghị agafe ụmụ nke ìhè dịka onye ori; 6–8, Nnukwu ngọzi nile na-eso ọrụ kwesịrị ntụkwasị-obi n’ime Nzukọ-nsọ.

1 Ọ Bụ uche m ka nwa odibo m Warren A. Cowdery bụrụ onye ahọpụtara ma chie ya echichi onye isi nduzi ndị-isi nchụ-aja na-elekọta nzukọ-nsọ m n’ala nke aFreedom na mpaghara ya nile gbaa gburugburu.

2 Na, ọ ga-ekwusa ozi-ọma mgbe nile na-adigide m ma welite olu ya ma nye ndị mmadụ ndụmọdụ, ọbụghị nani n’ebe nke ya, mana na mpaghara nile nọ nso ya gbaa gburugburu.

3 Ma nye oge ya nile n’ọkpukpọ-oku a dị-elu na dịkwa nsọ, nke m na-enye ya ugbụ a, ana-achọsi ike bala-eze nke elu-igwe na ezi-omume ya nile, na ihe nile ndị kwesịrị ka a ga-atụkwasịrị ya, n’ihi na conye-ọrụ kwesịrị ụgwọ-ọrụ ya.

4 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, aọbịbịa ahụ nke Onye-nwe bdịkwa nso, na ọ ga-agafe ụwa ahụ, dịka conye-ori, n’abali—

5 Ya mere, kee ihe-okike n’ukwu gị, ka unu wee bụrụ ụmụ nke aìhè, na ka ụbọchị ahụ ghara bịgafe unu dịka onye-ori.

6 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu ọn̄ụ dịrịị n’elu-igwe mgbe nwa odibo m Warren kpọrọ isi ala nye mkpa n’aka nke m, ma wepụta onwe ya na aghụghọ nke ndị mmadụ.

7 Ya mere ngọzi na-adiri nwa odibo m Warren, n’ihi a ga m eme ebere n’ebe ọ nọ, na, n’agbanyeghị aihe efu nke obi ya, a ga m ebuli kwa ya elu ma ọ bụrụ raa na ọ ga-adi umeala n’iru m.

8 Ma a ga m enye ya aamara na nkwesi-ike nke ọ ga-eji guzo; na gaa-n’iru ị bụ onye-ama kwesịrị ntụkwasị-obi na ìhè nye nzukọ-nsọ, akwadowo m okpu-eze maka ya n’ime bebe obibi nile nke Nna m. Ọ bụna otua. Amen.