Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 66


Nkeji 66

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma na Orange, Ohio, 25 Oktoba 1831 (History of the Church, 1:219–221). Nke a bụ ụbọchị nke mbụ nke ọgbakọ dị mkpa. N’okwu mmalite nke mkpughe a Onye-amụma dere, “N’arịrịọ nke William E. McLellin, a jụrụ m Onye-nwe, ma nata nke a na-eso” (History of the Church, 1:220).

1–4, Ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide ahụ bụ uju nke ozi-ọma; 5–8, Ndị okenye ga-ekwusa ozi-ọma, gbaa ama, ma tụgharịa-uche ha na ndị mmadụ; 9–13, Ije-ozị nkwusa ozi-ọma nke ịkwesị ntụkwasị obi ga-eme ka e nweta ihe-nketa nke ndụ ebighi-ebi.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye nwa odibo m William E. McLellin—Ngozi dịịrị gị, ọbụrụraa na ị tụgharịwo site n’ajọọ-omume gị nile, ma nabatawo ezi-okwu m nile, ka Onye-nwe Onye-mgbapụta gị kwuru, Onye-nzọpụta nke ụwa, ọbụna nke ka ha ra bụ ndị akwere n’aha m.

2 N’ezie a sị m gị, ngozi dịịrị gị maka ịnabata aọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide m, ọbụna uju nke ozi-ọma m, e zipụrụ nye ụmụ nke mmadụ, ka ha nwee bndụ ma bụrụ ndị ga-eketa oke site n’ebube nke a ga-ekpughe n’ụbọchị ndị ikpeazụ, dịka e deworo ya site n’aka ndị-amụma na ndị-ozi n’ụbọchị ndị ochie.

3 N’ezie a sị m gị, nwa odibo m William, na ị dị ọcha, ma ọbụghị n’ihe nile; chegharịa, ya mere, n’ihi ihe ndị ahụ n’adịghị mma n’iru m, ka Onye-nwe kwuru, n’ihi na Onye-nwe aga-egosi ha nye gị.

4 Ma ugbua, n’ezie, mụ, Onye-nwe ga-egosi ha nye gị ihe m chọrọ gbasara gị; ma-ọbụ ihe bụ uche m gbasara gị.

5 Lee, n’ezie a sị m gị, na ọ bụ uche m ka ị gaa akwusaa ozi-ọma m site n’ala rute n’ala, ma site na nnukwu obodo rute na nnukwu obodo, e, na mpaghara ndị ahụ nile gbara gburu-gburu ebe a n’ekwusabeghi ya.

6 Anọla, ọtụtụ ụbọchị n’ebe a; a ga-kwala n’ala nke Zaịọn ugbụ a; mana ọbụrụraa na i nwere ike izipu, zipu; ma ọbụghị otu a, echekwala maka ihe-onwunwe gị.

7 aGaa n’ala ndị ọwụwa anyanwụ nile, bgbaa ama n’ebe nile, nye mmadụ nile ma n’ime ụlọ-nzukọ ha nile na-atụgharị uche gị na ndị mmadụ.

8 Ka nwa odibo m Samuel H. Smith jee gị na ya, ma ahapụ kwala ya, ma nye ya ndụmọdụ gị nile; ma onye ahụ nke kwesịrị ntukwasị obi ka a ga-eme ka o sie aike n’ebe nile; ma mụ, Onye-nwe, ga-esoro unu jee.

9 Bịkwasị ndị ọrịa aaka ma arụ ha ga-adị kwa bike ọzọ. Alọghachila ruo mgbe mụ, Onye-nwe ga-ezigara gị. Nwee ndidi n’ime nsogbu. cRịọ, ma ị ga-anata, kụọ aka, ma a ga-emeghere gị ya.

10 Enwela mmasị n’ibu arụ. Hapụ ajọọ-omume nile. aAkwala iko—ọnwụnwa nke na-enye gị nsogbu.

11 aDota okwu ndị a nile, n’ihi na ha bụ ezi-okwu ma kwesị ntụkwasị-obi; ma ị garịrị ebulite ọkpụkpọ gị, ma nuba ọtụtụ mmadụ baa na bZaịọn jiri cukwe nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide n’elu isi ha.

12 aGaa n’iru n’ihe ndịa nile ọbụna ruo ọgwụgwụ, ma ị ga-enwe bokpu-eze nke ndụ ebighi-ebi n’aka nri nke Nna m, Onye nke jupụtara n’amara ma n’ezi-okwu.

13 N’ezie, otu a ka Onye-nwe gị aChineke gị, Onye-mgbapụta gị kwuru, ọbụna Jisus Kraịst. Amen.