Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 129


Nkeji 129

Ndụmọdụ nile sitere n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Nauvoo, Illinois, 9 Februarị 1843, nke kọwara ọtụghe-ụzọ atọ pụrụ-iche e ji-egosi ihe di iche n’ezi udị okike nke mụọ-ozị nile na-ekwusa ozi na mụọ nile (History of the Church, 5:267).

1–3, E nwere ma arụ nke biliri n’ọnwụ na arụ nke mụọ n’elu-igwe; 4–9, ọtụghe ụzọ nile ka e nyere nke e ji amata ndị-ozi sitere na-agafee akwa mgbochi ahụ.

1 E nwere ụdị mmadụ abụọ an’elu-igwe, n’ikpọ ya aha: bMụọ ozi nile, ndị bụ ndị cbilitere n’onwụ, ndị nwere arụ nile nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile—

2 N’ihe atụ, Jịsus sịrị: Bitụnụ m aka na hụrụ, n’ihi na mụọ enweghi aanụ arụ na ọkpụkpụ nile, dịka unu hụrụ na mụ onwe m nwere.

3 Nke abụọ: amụọ nile nke ndị bezi-omume ahụ emeworo ka ha zuo-oke, ha ndị n’ebilitaghị n’onwụ, mana ha ketara otu ebube ahụ.

4 Mgbe onye ozi biara n’asị na ya nwere ozi sitere n’aka Chineke, nye ya aka gị na rịo ya ka okwee gị n’aka.

5 Ọburu mụọ-ọzi ọ ga-eme otu a, ma ị ga-enwe mmetụta aka ya.

6 Ọbụrụ na ọ bụ mụọ nke onye ezi-omume e meworo ka o zuo-oke ọ ga-abia na ebube ya, n’ihi nke ahụ bụ nanị ụzọ o nwere ike ị pụta—

7 Rịọ ya ka o kwee gị n’aka, mana o gaghị e megharị arụ, n’ihi o megidere usoro nke elu-igwe ka onye ezi-omume ghọọ-aghụghọ, mana ọ haghị inye kwa ozi ya.

8 Ọbụrụ na ọ bụ aekwensu ahụ dịka mụọ-ozi nke ìhè, mgbe ị riọrọ ya ka o kwee gị n’aka ọ ga-enye gị aka ya, ma ị gaghị enwe mmetụta ịhe ọbụla, ya mere inwere-ike ịchọpụta ya.

9 Ndị a bụ ọtụghe-ụzọ atọ pụrụ-iche nke ị ga-eji ama ma nkwusa ozi ọbụla o si n’aka Chineke.