Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 90


Nkeji 90

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, e nyere na Kirtland, Ohio, 8 Maach 1833 (History of the Church, 1:329–331). Mkpughe nke a bụ nzọ ụkwụ ịga-n’iru n’ihiwe Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ (lee isi-ọkwu nke nkeji 81); n’ihi nke a, ndị ndụmọdụ ahụ e kwuru ka e chiri echichi na 18 Maach 1833.

1–5, Ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ka e nyefechasịrị n’aka Joseph Smith ma site n’aka ya rute Nzukọ-nsọ; 6–7, Sidney Rigdon na Frederick G. Williams ga-arụ ọrụ n’Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ; 8–11, Ozi-ọma ka a ga-ekwusa nye mba nile nke Israel, nye ndị Jentaịlụ nile, na nye ndị Juu, Onye ọbụla na-anụ ya n’asụsụ nke ya; 12–18, Joseph Smith na ndị ndụmọdụ ya ga-edozi nzukọ-nsọ n’ụsọrọ; 19–37, Ndị mmadụ dị iche iche ka e nyere ndụmọdụ site n’aka Onye-nwe ka ha gazie-ije ma rụọ ọrụ n’ala-eze ya.

1 Otu a ka Onye-nwe kwuru, n’ezie, n’ezie a sị m gị nwa m nwoke, a agbagharawo gị mmehie gị nile, dịka arịrịọ gị siri dị, n’ihi na ekpere gị nile na ekpere nile nke ụmụnna gị nwoke abịaruwo baa na ntị m abụọ.

2 Ya mere, a gọziwo gị site ugbụ a gị onye ji aọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze nke e nyere gị; bala-eze ahụ nke n’alọghachi oge nke ikpe-azụ.

3 N’ezie a sị m gị, ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze nke a enweghi mgbe a ga-ewere ya site n’aka gị, mgbe ị nọ n’ụwa, ọbụghị ma-ọbụ n’ụwa nke na-abịa;

4 Otu ọ sila dị, site n’aka gị ka a ga-enye onye-ọzọ amkpughe nile, e, ọbụna nye nzukọ-nsọ.

5 Ma ha nile ndị na-anata mkpughe nile nke Chineke, ka ha akpachara-anya ụzọ ha ji ejide ha ka ha ghara ịgụ ha ka ihe dị mfe, ma bụrụ ndị bịara n’ọmụma-ikpe site n’otu a, ma kpọbie-ụkwụ ma daa mgbe ebili mmiri na-ada, ma ịkụkụ efee, ma bmmiri ezoo, ma maa n’elu ụlọ ha.

6 Ma ọzọ, n’ezie a sị m ụmụnna gị nwoke, Sidney Rigdon na Frederick G. Williams, a gbagharawo ha mmehie ha nile kwa, ma a na-agụ ha dịka ndị dị ahata-aha gị na ha n’ijide ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ikpe azụ a;

7 Dịka kwa site na nlekọta gị, ọtụghe-ụzọ nile nke aụlọ akwụkwọ nke ndị-amụma; nke m nyeworo iwu ka ahazie;

8 Na site otu a ha ga-enwe ike izu-oke n’ije-ozị maka nzọpụta nke Zaịọn, na nke mba nile nke Israel, na nke Jentaịlụ nile, ka ha ra bụ ndị ga-ekwere;

9 Na site na nlekọta nke gị ha ga-anata okwu ahụ, ma site na nlekọta nke ha okwu ahụ ga-aga n’iru ruo na nsọtụ nile nke ụwa, aburu ụzọ ruo bndị Jentaịlụ, ma mgbe ahụ, lee, ma hụrụ, ha ga-atụgharị rute ndị Juu.

10 Ma mgbe ahụ ka ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe ogwe aka nke Onye-nwe ga-abụ ihe aekpughere n’ike iji mee ka mba nile, mba ọgọ-mụọ nile, ụlọ nke bJoseph kwere n’ozi-ọma nke nzọpụta ha.

11 N’ihi na ọ ga-eru n’ụbọchị ahụ, na onye ọbụla aga-anụrụ uju nke ozi-ọma n’ire nke ya, ma n’asụsụ nke ya, site n’aka ndị ahụ nke e bchiri echichi baa cn’ike nke a, site na nlekọta nke dOnye-nkasi-obi ga-enwukwasị n’elu ha maka mkpughe nke Jisus Kraịst.

12 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, e nye m unu iwu-nsọ ka unu nọgide an’ije-ozị ma n’otu ndị-isi nduzi.

13 Ma mgbe unu tụgharịsịrị asụsụ nke akwụkwọ nke ndị-amụma, unu ga-amalite site mgbe ahụ gaa n’iru aịnọdụ n’isi ihe nile nke nzukọ-nsọ ma bn’ụlọ-akwụkwọ;

14 Ma site n’oge ruo n’oge, dịka onye-nkasi-obi ga-eme ka ọ pụta ìhè, ị ga-anata amkpughe nile, iji kpughee bihe-omimi nile nke ala eze ahụ;

15 Na dozie nụ n’usoro nzukọ-nsọ nile, ma agụọ-akwụkwọ, ma bmụta ihe, ma bịa n’ịmata banyere akwụkwọ ọma nile, na banyere casụsụ nile, ire nile, ma ndị mmadụ.

16 Ma nke a ga-abụ ọrụ unu na ije-ozị unu na-ndụ unu nile, ị nọ-n’isi na kansul, ma dozie n’usoro ihe nile nke nzukọ-nsọ na ala-eze.

17 aIhere emela unu, ọbụghị ma-ọbụ inwe mgbagwọ-ju-anya; mana ka a dọọ unu aka na ntị n’ime isi-ike unu nile na bmpako, n’ihi na ọ na-eweta ọnya na-ejichi mkpụrụ-obi unu nile.

18 Dozie n’usoro ụlọ unu nile; debe aumengwụ na badịghị-ọcha ebe dị anya site ebe unu nọ.

19 Ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ka e nwee ebe e nwetara ngwa-ngwa o kwere mee, maka ezi na ụlọ nke onye-ndụmọdụ gị na ode akwụkwọ, ọbụna Frederick G. Williams.

20 Na ka nwa aagadi odibo m, Joseph Smith, Ukwu, nọgide ya na ezi na ụlọ ya n’ebe ahụ o bi ugbụ a; ma ka aghara ire ya ruo mgbe ọnụ nke Onye-nwe ga-ekwu.

21 Ma ka onye-ndụmọdụ m, ọbụna Sidney aRigdon, nọrọ ebe ahụ o bi ruo mgbe ọnụ nke Onye-nwe ga-ekwu.

22 Ma ka ụkọchukwu jiri mgbalị chọọ inweta onye annọchite-anya, ma ka ọ bụrụ nwoke onye nwere bakụ n’ime ụlọ-akụ—onye nke Chineke, na nke okwukwe siri ike—

23 Na site otu a ka o nwe ike ịkwụsị ụgwọ ọbụla; ka ụlọ-akụ nke Onye-nwe, ghara ị bụ ihe n’enweghi ùgwù n’iru mmadụ.

24 Chọọ na amgbalị, bkpee ekpere oge nile, ma bụrụ onye nwere okwukwe, ma cihe nile ga-arụkọ-ọrụ ọnụ maka ọdị-nma nke unu, ọbụrụ na unu agazie-ije na-echeta dọgbụgba-ndụ ahụ nke unu gbara otu onye na ibe ya.

25 Mee ka ezi na ụlọ unu dị antakịrị nke ka nke, nke nwa agadi odibo m Joseph Smith, Ukwu, dịka gbasara ndị ahụ n’abụghị ndị ezi na ụlọ unu;

26 Ka ihe ndị ahụ nile nke e dotaara unu, iweta na mmezu ọrụ nke m, ghara ibu ihe anapụrụ unu ma nye ya ndị ekwesighi ekwesị—

27 Ma site otu a unu a bụrụ ndị egbochiri site n’ịrụzu ihe ndị ahụ ndị nke m nyeworo unu n’ịwụ.

28 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọ bụ mmasị m ka oru m nwanyị Vienna Jaques nata ego maka mmefu ya nile, ma gaa ruo n’ala nke Zaịọn;

29 Ma ego nke fọdụrụ ka a ga-edo nsọ nye m, ma a ga-enye ya ụgwọ-ọrụ n’ozuzu oge nke m.

30 N’ezie a sị m unu, na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị n’anya abụọ m na ọ ga-aga n’ala nke Zaịọn, ma nata ihe-nketa site n’aka nke onye-ụkọchukwu;

31 Ka o wee nwee ike ibiri n’udo ọbụrụra na o kwesi ntụkwasị-obi, ma hara ịnọ-n’efu n’ụbọchị ya nile site ugbụ a gaa n’iru.

32 Ma lee, n’ezie a sị m gị, na i ga-ede ịwụ-nsọ nke a, ma gwa ụmụnna gị nwoke na Zaịọn, n’ekele nke ịhụnanya, na akpowo m gị ị anọ-n’isi nke Zaịọn n’ozuzu oge nke m.

33 Ya mere, ka ha kwụsị isogbu m gbasara okwu nke a.

34 Lee, a sị m gị ka ụmụ nna unu ndị nwoke na Zaịọn malite ichegharị, ma ndị mụọ ozi na-an̄urị-ọn̄ụ n’ihi ha.

35 Otu o sila dị, e nweghị m obi-ụtọ dị mma banyere ọtụtụ ihe; ma enweghị m obi ụtọ dị mma n’ebe nwa odibo m aWilliam E. McLellin nọ, ọbụghị ma-ọbụ na nwa odibo m Sidney Gilbert; na ụkọchukwu kwa, ma ndị ọzọ nwere ọtụtụ ihe ha nwere, ichegharị site na ha.

36 Mana n’ezie a sị m unu, na mụ, Onye-nwe ga-alụ ọgụ megide aZaịọn, ma na-arịọ ndị ya dị-ike, ma btaa ya ahụhụ rue mgbe ọ ga-emeri ma dị cọcha n’iru m.

37 N’ihi na a gaghị ewepụ ya site n’ọnọdụ ya mụ, Onye-nwe e kwuwo ya. Amen.