Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mkpughe


Mkpughe

Igbasa ozi sitere na Chineke rute ụmụ ya n’elu ụwa. Mkpughe nwere ike ịbịa site n’Ị̀hè nke Kraịst na Mụọ Nsọ site n’ụzọ nkwalite nke mụọ, ọ̀hụ́ nile, nrọ nile, ma-ọbụ nleta nke ndị mụọ-ozi. Mkpughe na-enye nduzi nke nwere ike iduga ndị nwere okwukwe na nzọpụta ebighi-ebi n’ime ala-eze selestịal.

Onye-nwe na-ekpughere ndị-amụma ya ọrụ ya ma mesie ya ike nye ndị kwere-ekwe na mkpughe nile ahụ bụ ezi-okwu (Emọs 3:7). Site na mkpughe, Onye-nwe na-enye onye ọbụla chọrọ nụ nduzi nke onwe ya na onye nwere okwukwe, na-echegharị, na nwee nrube-isi nye ozi-ọma nke Jisus Kraịst.“Mụọ Nsọ bụ onye mkpughe”, ka Joseph Smith kwuru, na “ọ dịghị onye ga-anata Mụọ Nsọ na-anataghị mkpughe nile”.

N’ime Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ bụ ndị-amụma, ndị ọhụ-ụzọ, na ndị mkpughe nye Nzukọ-nsọ na nye ụwa. Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ bụ nanị otu onye nke Onye-nwe nyere ikike ịnata mkpughe maka Nzukọ-nsọ (OznỌd. 28:2–7). Onye ọbụla nwere ike ịnata mkpughe nke onwe maka ọdị mma nke onwe ya.