Otu akara nke nsọpụrụ miri-emi na nnukwu ùgwù maka Chineke Nna na Onye Nzọpụta Jisus Kraịst. Akara ahụ na-atụnyere ọnọdụ ha nile dịka ndị nna-ukwu kachasị elu, nwere ịhụnanya n’elu okike ha nile.
Ọ dịghị ihe karịrị Onye-nwe ike ime, Jen. 18:14 .
Onye-nwe wee gwa Moses okwu iru n’iru, Ọpụ. 33:11 .
Ị ga-ahụ Onye-nwe bụ Chineke gị na-anya, Deut. 6:5 (Mat. 22:37 ; Mak 12:30 ).
Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Onye-nwe ofufe, Josh. 24:15 .
Onye-nwe bụ onye na-azụ m dịka atụrụ, Abụọma 23:1 .
Onye-nwe bụ dimkpa na dike, nke bụ dike n’agha, Abụọma 24:8 .
Onye-nwe Jehova bụ ume m, Aịsa. 12:2 (2 Nif. 22:2 ).
Mụ onwe m Onye-nwe, bụ Onye-nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Aịsa. 60:16 .
Onye-nwe Chineke gị ka Ị ga-akpọ isi ala nye, Mat. 4:10 (Luk 4:8 ).
Ka ha si dị ukwuu bụ ihe nile Onye-nwe meworo, Mak 5:19 .
Otu Onye-nwe dị kwa Jisus Kraịst, 1 Ndị-Kọ 8:6 .
Otu Onye-nwe dị, otu okwukwe dị, otu baptism dị, Ndị-Efe. 4:5 .
Onye-nwe na Onwe-ya ga-esi n’elu-igwe rịdata, 1 Ndị-Tes. 4:16 .
Aga m eje mee ihe ndị ahụ Onye-nwe nyere n’iwu, 1 Nif. 3:7 .
N’ezi-omume ka Onye-nwe ga-ekpe ndị ogbenye ikpe, 2 Nif. 30:9 .
Onye-nwe Chineke, Chineke nke Abraham, napụtara ndị Israel site n’ịbụ-oru, Alma 29:11 .
Ọdịghị ihe ga-azọpụta ndị a ma-ọbụghị nchegharị na okwukwe n’Onye-nwe, Hil. 13:6 (Mosa. 3:12 ).
Gee ntị n’okwu nile nke Jisus Kraịst, Onye-nwe gị, OznỌd. 15:1 .
Chọọ iru nke Onye-nwe oge nile, OznỌd. 101:38 .
Uwe Onye-nwe ga-adị ọbara ọbara n’Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, OznỌd. 133:48 (Aịsa. 63:1–4 ).
Abraham kwurịtara okwu ya na Onye-nwe iru na iru, Abr. 3:11 .
Anyị kwere na ụkpụrụ mbụ nke ozi-ọma bụ okwukwe n’ime Onye-nwe Jisus Kraịst, Ndep. Ok 1:4 .