Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mweghachi nke ozi-ọma


Mweghachi nke ozi-ọma

Nhiwegharị n’etiti ndị mmadụ nke ezi-okwu nile na emume-nsọ nile nke ozi-ọma ya nke Chineke hiwegharịrị n’elu ụwa. Ozi-ọma nke Jisus Kraịst furu-efu site n’ụwa site na ngọnarị okwukwe nke mere gbasoro igbasa ozi-ọma nke Ndị-ozi nke Kraịst. Ngọnarị okwukwe ahụ mere ka ọ dị mkpa bụ mweghachi nke ozi-ọma. Site n’ọ̀hụ́ nile, nkwusa-ozi-ọma nke ndị muọ-ozi, na mkpughe nye ndị mmadụ n’elu ụwa, Chineke weghachiri ozi-ọma ahụ. Mweghachi ahụ malitere n’aka Onye-amụma Joseph Smith (A—JS 1:1–75; OznỌd. 128:20–21) ma na-agakwa n’iru ruo ugbua site n’ọrụ nke ndị amụma dị ndụ nke Onye-nwe.