Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ—1


Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ—1

E bipụtara n’ibe akwụkwọ ndị mmechi nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, mpaghara nke mbụ nke Ima Ọkwa nke Ụlọ-ọrụ—1 ka a maakwara dịka Akwụkwọ-ngọsipụta-uche ahụ. Onye wepụtara ya bụ Onye-isi nduzi Wilford Woodruff na nyefee ya ndị otu Nzukọ-nsọ n’Ọgbakọ ntụgharịkọta uche zuru ọha na 6 Ọktoba 1890. Malite na 1862, ọtụtụ iwu nile n’ime iri afọ abụọ na ise na-abịa mere ka ịlụ ọtụtụ ndị nwunye bụrụ ihe iwu na-akwadoghị n’ime United States. Onye-nwe gosiri Wilford Woodruff site n’ọ̀hụ́ na mkpughe ihe gaara eme ma ọbụrụ na ndị-nsọ a kwụsịghị omume nke ịlụ ọtụtụ ndị nwunye. Akwụkwọ ngosipụta uche ahụ kwupụtara n’ịpụta ìhè na-adịghị eme kwa emume ịlụ ọtụtụ ndị nwunye.