Akwụkwọ nsọ
Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ 1


Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ—1

Nye Onye ọbụla Ọ Gbasara:

N’ihi na ndị nta-akụkọ ezipụwori akwụkwọ akụkọ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị site na Salt Lake City, nke a gbasaworo mbara, nke mere na òtù na-elekọta ntuli-aka ọchịchị na Utah, n’ime ndepụta mkpesa ha na nso a nye ode-akwụkwọ nke ime obodo, na-ekwusi-ike na ịlụ ọtụtụ nwunye ka a na emere emume-nsọ ruo ugbụ a ma n’alụlụ di na nwunye iri anọ dị otua ka a haziworo na Utah ke mgbe Jun gara-aga ma-ọbụ n’ime afọ gara-aga, ọzọ kwa na mkparịta-ụka nile n’ọha, ndị ndu nile nke Nzukọ-nsọ akụziwo, nyewokwa agbam-ume, na kwado ọgan’iru nke emume alụlụ karịrị otu nwunye—

Ya mere, mụ onwe m, dịka Onye-isi nduzi nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, na-eji ebe a na-omume dịkasị mkpa, na-ama-ọkwa na ebubo nile ndị a bụ ụgha. Anyị adịghị akụzi alụlụ karịa otu nwunye, ma-ọbụ alụlụ ọtụtụ nwunye, anyị adịghị enye onye ọbụla ikike ịba n’ime omume ya, na ana m agọ sị na-ọdịghị ma-ọbụ iri anọ ma-ọbụ ọnụ-ọgụgụ alụlụ ọtụtụ nwunye ọbụla e meworo emume nsọ ha n’ime Temple anyị nile n’oge nke ahụ ma-ọbụ n’ebe ọzọ ọbụla n’ime mpaghara obodo a.

Otu okwu ka-enyere mkpesa banyere ya, n’ime ya nke ndị nile nke a gbasara na-ekwusi ike na-emere alụlụ di na nwunye a, n’ime Ụlọ Onyinye dị nsọ, n’ime Salt Lake City, na mmalite udu mmiri 1889, mana enwebeghi m ike ịmata onye mere emume a; ihe ọbụla emere n’okwu a bụ nke a na-amataghị. N’ihi ihe nke a e kwusịrị ike na o mere, Ụlọ Onyinye di nsọ ahụ site na ntụzi aka m ka a kwaturu na-egbughị oge.

N’ihi na Ụlọ-Ome Iwu etinyela iwu níle igbochi alụlụ ọtụtụ nwunye, iwu nke ụlọ ikpe okwusịa ọgwụ kwupụtaworo na o nwere nkwado akwụkwọ ukwu nke iwu nke obodo, a nọ m ebe a na-ekwupụta ọchịchọ m ikwenye n’iwu nile ndị ahụ, na n’iji ike nke na-esi n’ime m tinyere ndị nile nke Nzukọ-nsọ nke m nọ n’isi nduzi ya ime ka ha mee otu aka ahụ.

Ọdịghị ihe ọbụla dị na ozizi m nile nye Nzukọ-nsọ ma-ọbụ na nke ndị mụ na ha na-arụkọ-ọrụ, n’ime oge nke a kpọtụrụ ọnụ, bụ nke e nwere ike ikọwa nke ọma na-ọ na-akwagide ma-ọbụ na-agba ume nye alụlụ karịa otu nwunye; na mgbe onye Okenye ọbụla nke Nzụkọ kwuru okwu ọbụla nke dika nkụzi dị otu a dị na ya, a na-eme ngwa ngwa katọọ onye ahụ. Na ugbụ a ana m ama ọkwa n’ọha na ndụmọdụ m nye Ndị-nsọ nile nke ụbọchị-ikpeazụ a, bụ ka ha wezuga onwe ha na-ịhazị alụlụ ọbụla nke iwu obodo megidere.

Wilford Woodruff

Onye-isi nduzi Nzụkọ nke Jisus Kraịst
nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a

Onye-isi nduzi Lorenzo Snow nyere nke a na-eso:

Ana m emesi ike sị, ebe anyị kọtara na Wilford Woodruff bụ Onye-isi nduzi Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, na onye ọbụ nanị ya n’elu ụwa n’oge ugbụ a bu onye ji ọtụghe-ụzọ nile nke emume-nsọ nile nke nrachi, anyị kwetere na o nwezuru ikike site n’ihi ọnọdụ ya ị wepụta akwụkwọ ngosipụta-uche nke agụworo k’anyị nụrụ, na nke e nyere oge ya ka Septemba 24, 1890, na dịka Nzukọ-nsọ n’Ọgbakọ Ntụgharịkọta uche zuru ọha, anyị na-anabata ịma ọkwa ya banyere alụlụ ọtụtụ nwunye nile dịka ihe nwere ikike na nke na-ahaghị ime.

Ntuli-aka nke e ji kwado nke a nwetara nkwekọrịta nke madụ nile.

Salt Lake City, Utah, Ọktoba 6, 1890

Ndepụta Okwu a Họọrọ site na Ụzọ Okwu Atọ nke
Onye-isi Nduzi Wilford Woodruff
Kwusara Gbasara Akwụkwọ Ngosipụta-uche ahụ

Onye-nwe agaghị ekwe ka m ma-ọbụ nwoke ọzọ onye ga-eguzo dịka Onye-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ duhie unu ụzọ. Ọ dịghị na atụmatụ ahụ. Ọ dịghị n’uche obi Chineke. Ọ bụrụ na m anwaa ime nke ahụ, Onye-nwe ga-ewezuga m site n’ọnọdụ m, na otu aka ahụ ka ọ ga-ewezuga nwoke ọzọ site n’ọnọdụ ya, bụ onye nwara i duhie ụmụ nke mmadụ site na mkpughe nile nke Chineke, na site n’ọrụ ha (Ọgbakọ Ntụgharịkọta uche ọha nke Nzukọ mpaghara afọ Iri isii na otu, Ụbọchị mbụ, Ọktoba 6, 1890, Salt Lake City, Utah. E depụtara n’akwụkwọ akụkọ uhuda chi Deseret Evening News, Ọktoba 11, 1890, p. 2.)

Ọdịghị mkpa na onye na-adị ndụ, ma-ọbụ onye na-anwụ anwụ, ma-ọbụ onye a kpọrọ ka ọ na-eduzi Nzukọ-nsọ a, ha ga-eduzi ya site na nkwalite nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile. Ọ bụrụ na ha emeghị ya n’ụzọ ahụ, ha agaghị eme ya ma-ọlị.…

Enwetawo m mkpughe ụfọdụ na nso a, ma ndị dị mkpa hie nne nye m, na a ga m agwa unu ihe Onye-nwe kwuworo nye m ka m weta uche unu nile n’ebe ihe a kpọrọ akwụkwọ ngosipụta-uche.…

Onye-nwe agwawo m ka m jụọ Ndị-nsọ nile nke ụbọchị-ikpeazụ a otu ajụjụ, na Ọ gwawo kwa m si na ọbụrụ na ha ga-ege ntị n’ihe m kwuru nye ha, na zaa ajụjụ nke ajụworo ha, site na Mụọ n’ike nke Chineke, azịza ha nile ga-eyi otu-ihe, na nkwenye ha nile ga-eyi gbasara okwu nke a.

Ajụjụ ahụ bu nke a: Olee ụzọ nke kachasị n’amamihe nye Ndị-nsọ nile Ụbọchị-Ikpeazụ a ị chụso—ị ga n’iru n’alụlụ ọtụtụ nwunye, ebe iwu nile nke mba megidere ya na mmegide nke iri nde mmadụ isii, na ọnụ ahịa nke iji ike weghara na nfunarị nke Temple nile, na ikwụsị emume-nsọ nile dị n’ime ya tinyere nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ, na itinye Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụ na ndị-isi ezi n’ụlọ nile nke Nzukọ-nsọ n’ụlọ-mkpọrọ, na iji ike weghara arịa nke ndị mmadụ ahụ nwe n’onwe ha (ebe ọbụ ihe ndị a nile n’onwe ha ga-akwụsị omume ahụ); ma-ọbụ, mgbe anyị mesịrị na tasịa ahụhụ nke anyị nwere site na ịnọgidesike n’ụkpụrụ nke a, anyị abịa kwụsị omume ahụ, bịa n’okpuru iwu, na site na-ime otu a hapụ ndị Amụma nile, Ndị-ozi nile, na ndị nna nile n’ụlọ, ka ha nwe ike na-enye ndị mmadụ ntụzi aka, na-eleba anya n’ọrụ nile nke Nzukọ-nsọ, na hapụ kwa Temple nile n’aka nile nke ndị nsọ, ka ha wee na-eleba anya n’ọrụ nke emume-nsọ nile nke Ozi-ọma, n’ihi ndị dị ndụ na kwa ndị nwụrụ anwụ?

Onye-nwe egosiwo m n’ọhụ na mkpughe kpọm kwem ihe gaara eme m’ọbụrụ n’anyị akwụsịghị omume nke a. Ọbụrụ n’anyị akwusịghịrị nke a, o nweghị ihe anyị ga-eji ndị nwoke no n’ime temple nke a dị na Logan mee, n’ihi na emume-nsọ nile ka a ga-akwusị n’ime akụkụ nile nke Zaịọn. Ọgba-aghara ga-achị n’ime akụkụ nile nke Isreal na ọtụtụ ndịkom ka a ga-eme ndị mkpọrọ. Nsogbu nke a gaara a bịakwasị Nzukọ-nsọ nile, na a gaara amanye anyị amanye ị kwụsị omume ahụ. Ugbụ a ajụjụ ahụ bụ nke a, na o kwesịrị e kwesi ka akwụsị ya na-ụdị a ma-ọbụ n’ụzọ nke Onye-nwe gosipụtara nye anyị, na hapụ ndị Amụma anyị nile na Ndị-ozi nile, na ndị nna nile i nwere onwe ha, na temple nile n’aka nile nke ndị mmadụ, ka ndị nwụrụ anwu wee nwee mgbapụta. Ọnụ-ọgụgụ dị ukwuu e nwetawori nnaputa site n’ụlọ-mkpọrọ n’ime ala mụọ site n’aka ndị mmadụ a, na ọrụ a ọ ga-aga n’iru ma-ọbụ kwusị? Nke a bu ajụjụ m na atọgbọ n’iru Ndị-nsọ nile nke Ụbọchị-ikpeazụ a. Unu ga-ekpe ikpe a nye onwe unu nile. Achọrọ m ka unu zaa ya nye onwe unu. Agaghị m aza ya, mana asị m unu na nke ahụ bu kpọm kwem ọnọdụ anyị dịka ndị mmadụ gaara anọ n’ime ya, ma ọbụrụ n’anyị agbasoghi ụzọ nke anyị gbasoworo.

…Ahụrụ m kpọm kwem ihe gaara eme ọbụrụ na-onweghị ihe e mere. Enwereworị m mụọ nke a n’arụ m ogologo oge. Mana achọrọ m ikwu nke a: Agaara m ahapụ ka temple nile si n’aka anyị nile pụọ, agaara m aga mkpọrọ n’onwe m, na hapụ nwoke ọbụla ọzọ ka ọ gaa ebe ahụ, ma-ọbụghị na Chineke nke elu-igwe nyere m iwu nsọ ka m mee ihe m meworo, na mgbe oge awa ahụ bịara mgbe e nyere m iwu ka m mee nke ahụ, o dosiwo m anya. M wee gaa n’iru Onye-nwe na edere m ihe Onye-nwe gwara m ka m dee.

Ahapụrụ m nke a nye unu ka unu tulee na tugharịa n’uche. Onye-nwe nọnyeere anyị n’ọrụ (Ọgbakọ ntụgharịkọta uche nke Cache Stek, Logan, Utah, Ụbọchị ụka, Novemba 1, 1891. E depụtara na akwụkwọ akụkọ ịzu-ụka Deseret Weekly, Novemba 14, 1891.)

Ugbụ a aga m agwa unu ihe e gosipụtaworo nye m na ihe Ọkpara Chineke rụworo n’ime ihe nke a.… Ihe ndị a nile gaara emezu, dịka Chineke Pụrụ Ime Ihe nile na-adị ndụ, ọbụrụ na-enyeghị akwụkwọ ngosipụta ahụ. Ya mere na-ọmasịrị Ọkpara Chineke na e wepụtara ihe ahụ nye Nzụko-nsọ na nye ụwa n’ihi ihe nile dị n’uche nke ya. Onye nwe enyewo iwu ọkụ nke e ji ewulite Zaịọn. O nyewo iwu ọkụ ịrụchapụ temple nke a. O nyewo iwu ọkụ na a ga-enye nzọpụta nke ndị nwuru anwụ n’ime ndagwurugwu nile ndịa nke ugwụ ahụ nile. Na Chineke Pụrụ Ime Ihe nile enyewo iwu ọkụ na Ekwensu agaghị egbochi ya. Ọbụrụ na unu ga-aghọta nke ahụ, nke ahụ bụ ọtụghe-ụzọ nye ya. (E wetara nke a site na mkparịta ụka na ọgbakọ nke isii nke nnyefe nsọ nke Salt Lake Temple, Epril 1893. Mbipụta akwụkwọ nile nke ofufe nnyefe nsọ, ebe nchekwa nile nke Ngalaba Akukọ Nzukọ-nsọ, Salt Lake City, Utah.)