Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 19


Nkeji 19

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, na Manchester, New York, Maach 1830 (History of the Church, 1: 72–74). N’ime akụkọ ya, Onye-amụma kọwara ya dịka “iwu-nsọ nke Chineke ma ọbụghị nke mmadụ, nye Martin Harris, nke e nyere ya site n’aka nke onye dị ebighi-ebi” (History of the Church, 1:72).

1–3, Kraịst nwere ike nile; 4–5, Mmadụ nile garịrị echegharị ma-ọbụ taa ahụhụ; 6–12, Ntaram ahụhụ mgbe ebighi-ebi bụ ntaram ahụhụ Chineke; 13–20, Kraịst tara ahụhụ maka mmadụ nile, ka ha ghara ịta ahụhụ ma ọbụrụ na ha echegharịa; 21–28, Kwusaa ozi-ọma nke nchegharị; 29–41, Kwupụta ozi ọma nile.

1 Mụ onwe m bụ aAlfa na Omega, bKraịst Onye-nwe; e, a bụ m Onye ahụ, mmalite na ọgwụgwụ, Onye-mgbapụta nke ụwa.

2 Mu, ebe m mezuru, ma arụchaa uche ya Onye nke m bụ nke ya ọbụna Nna ahụ, gbasara mụ—ebe m mesịworo nke a ka m wee bdoo ihe nile n’okpuru m—

3 Idota aike nile, ọbụna ruo na bmbibi nke Setan na ọrụ ya nile cn’ọgwụgwụ nke ụwa, ma oke ụbọchị ikpe-azụ nke ikpe, nke m ga-ewetara ndị nile bi na ya, dna-ekpe onye obula ikpe dịka eọrụ ya na omume ya nile nke o mere.

4 Ma n’ezie onye ọbụla garịrị aechegharị ma-ọbụ btaa ahụhụ, n’ihi mụ, Chineke, abụ m cagwụgh-agwụ.

5 Ya mere, a naghị m aewepụ site n’ikpe nile nke m kpere, kama ahụhụ ga-aga n’iru, ịkwa-akwa, bịkwa arịrị na ịta ikikere eze, e, nye ndị ahụ a chọtara cn’aka ekpe m.

6 Otu osila dị, e adeghi ya na-agaghị enwe ọgwụgwụ nke ịta-ahụhụ a, kama e dere ya ịta ahụhụ bagwụgh-agwụ.

7 Ọzọ, e dere ya ọmụma ikpe ọkụ ala-mụọ aebighi-ebi; ya mere o doro anya karịa akwụkwọ-nsọ ndị ọzọ, ka o nwee ike ịrụ-ọrụ n’obi nile nke ụmụ ndị mmadụ, ihe nile n’ihi otuto nke aha m.

8 Ya mere, a ga m akọwara unu ihe omimi nke a; n’ihi na o kwesịrị ka unu mata ọbụna dịka ndị-ozi m.

9 A na m ekwuru unu bụ ndị ahọpụtara n’ihe nke a, ọbụna dịka otu, ka unu wee banye an’ezumike m.

10 N’ihi na, lee, aihe omimi nke ndụ iyi-Chineke, oke ịdị ukwuu ọ dị! N’ihi na, lee, a bụ m agwụgh-agwụ, ma ntaram-ahụhụ nke e nyere site n’aka m bụ ntaram-ahụhụ agwụgh-agwụ, n’ihi na bAgwụgh-agwụ bụ aha nke m. Ya mere—

11 Ntaram-ahụhụ aebighi-ebi bụ ntaram-ahụhụ nke Chineke.

12 Ntaram-ahụhụ agwụgh-agwụ bụ ntaram-ahụhụ nke Chineke.

13 Ya mere, e nye m gị iwu ka i chegharịa, ma debe aiwu-nsọ nile nke ị natara site n’aka odibo m Joseph Smith, Nta, n’aha m;

14 Ma ọ bụ site n’ike nke pụrụ ime ihe nile ka ị nataworo ha:

15 Ya mere e nye m gị iwu ka ị chegharịa—chegharia, m’ọbụghị otua etie m gị ihe site na ndele nke ọnụ m, ma site n’oke iwe m, ma site n’iwe m, ma aahụhụ gị nile siri ike—isi-ike nke ị maghị, oke ịmamma ya ị maghị, e, isi-ike nke nnagide ya ị maghị.

16 N’ihi na lee, mụ, Chineke, atara ahụhụ ihe ndia nile n’ihi mmadụ nile, ka ha ghara bịta ahụhụ m’ọbụrụ na ha cga-echegharị;

17 Mana ọbụrụ na ha agaghị echegharị ha garịrị aata-ahụhụ ọbụna dịka m;

18 Ahụhụ nke mere ka mụ onwe m, ọbụna Chineke, onye kachasị elu, maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma arụ ma na mụọ—ma chọọ ka m aghara ịn̄ụ n’iko ilu, ma wee laa azụ.

19 Otu osila dị, otuto dịrị Nna, a n̄ụrụ m ma amesịa njikere m nile nye ụmụ nke mmadụ

20 Ya mere, e nye m gị iwu ọzọ ichegharị, m’ọbụghị otua a ga m eme gị ịdị obi umeala sịte n’ike m nke pụrụ ime ihe nile; ma ka i akwupụta mmehie gị nile, m’ọbụghị otua ị ga-enwe ntaram-ahụhụ ndị a nke m kwuworo, nke n’ime nke kachasị ntakịrị ha, e ọbụna n’ogo a nke kachasị ntakịrị ị detuworo ire oge ahụ m wezugara Mụọ m.

21 Ma e nye m gị iwu ka i ghara aikwusa ihe ọzọ m’ọbụghị nchegharị, ma begosikwala ụwa ihe ndị a nile rue mgbe ọ bụ amamihe n’ime m.

22 N’ihi ha apụghị aịnagide anụ ugbụ a, kama bmmiri-ara ka ha pụrụ ịnata; ya mere, ha agaghị ama ihe ndịa, m’ọbụghị otu a ha alaa n’iyi.

23 Mụta ihe gbasara m, ma gee ntị n’ọkwụ m nile; ajee-ije bn’ịdị nwayọ nke Mụọ m, ma ị ga-enwe cudo n’ime m.

24 A bụ m aJisus Kraịst; a bịara m site n’uche nke Nna, ma a na m eme uche ya.

25 Ma ọzọ, e nye m gị iwu ka gị enwela aanya-ukwu n’ebe bnwunye onye agbata-obi gị nọ; ma-ọbụ chọọ ndụ nke onye agbata-obi gị.

26 Ma ọzọ, e nye m gị iwu ka ị ghara inwe anya-ukwu n’ebe akụ gị nọ, kama nye ya n’efu maka mbipụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn, nke nwere aezi-okwu na okwu nke Chineke—

27 Nke bụ okwu m nye andị Jentaịlụ, na nso-nso a ka o nwee ike gakwute bndị Ju, ndị ahụ ndị Leman bụ nke cfọdụrụ, ka ha nwee ike kwere n’ozi-ọma, ma hapụ ile-anya dMesaịa ga-abịa onye bịasiwoworịị.

28 Ma ọzọ, e nye m gị iwu na ị ga ana-ekpe puta ekpere bn’ọlu-okwu gị na kwa n’obi gị; e, n’iru ụwa ma na nzuzo, n’iru ọha nakwa mgbe nanị gị nọ.

29 aga-ekwụpụta ozi ọma nile, e, mee ka a nụ ya n’elu ugwu nile, ma n’elu n’ebe ọbụla dị elu, ma n’etiti ndị ọbụla nke a ga-ekwe ka ị hụ.

30 Ma ị ga-eme ya n’obi dị umeala, na-enwe antụkwasị-obi na m, n’ekwughị megide ndị nkwutọ.

31 Maka aụkpụrụ nile i gaghị ekwu, kama ị ga-ekwupụta nchegharị na bokwukwe n’Onye-nzọpụta, na cnsachapụ nke mmehie nile site dn’ime baptism, na site en’ọkụ, e, ọbụna fMụọ Nsọ.

32 Lee, nke a bụ aiwu-nsọ ukwu na nke ikpeazụ nke m ga-enye gị gbasara okwu a; n’ihi na nke a ga-ezuru gị n’ije gị kwa ụbọchị, ọbụna rue ọgwụgwụ nke ndụ gị.

33 Ma nhuju-anya ka ị ga-anata m’ọbụrụ na i jighi andụmọdụ nile ndịa kpọrọ ihe, e, ọbụna mbibi nke onwe gị na akụ gị nile;

34 aNyee akụkụ akụ gị, e, ọbụna akụkụ nke ala gị nile, ma ihe nile ewezuga nke iji-akwado ezi na ụlọ gị.

35 Kwụọ aụgwọ i bkwetara ịkwụ onye-mbipụta akwụkwọ. Tọghapụ onwe gị site cn’ibu-oru.

36 aHapụ ụlọ gị na ebe-obibi gị, ewezuga mgbe ị chọrọ ịhụ ezi na ụlọ gị

37 Ma akwuo ọbụghị na nzuzo nye mmadụ nile; e, kwusaa, gbaa ume, kwupụta bezi-okwu, ọbụna n’olu na-adasi-ike, n’olu an̄ụrị, na-eti—Hosanna, Hosanna, ngọzi na-adịrị aha nke Onye-nwe Chineke.

38 aKpee-ekpere oge nile, m bga-awụpụta Mụọ m n’elu gị, ma ngọzi gị nile ga-adị ukwuu—e, ọbụna karịa ma ọbụrụ na inweta akụ nile nke ụwa ma ire-ure ebe nile oruru.

39 Lee, i nwere ike ịgụ nke a n’an̄ụrịghị ọn̄ụ ma welite obi gị elu n’obi-ụtọ?

40 Ma-ọbụ i nwere ike ịgbagharị ọsọ ogologo oge karịa dịka onye-odudu kpuru-isi?

41 Ma-ọbụ ị nwere ike inwe aumeala ma dịkwa nwayọ, ma jie onwe gị n’ụzọ onye maara ihe n’iru m? E, bbịakwute m Onye-nzọpụta gị. Amen.