Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 75


Nkeji 75

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Amherst, Ohio, 25 Jenuarị 1832 (History of the Church, 1:242–245). Oge ahụ bụ oge ọgbakọ nke e yiworo eyi. N’ọgbakọ nke a akwadoro Joseph Smith ma chiekwa ya echichi dịka Onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja nke dị Elu. Ụfọdụ ndị okenye, ndị nweworo ihe-isi-ike na-ime ka ndị mmadụ ghọta ozi ha, chọrọ ịmụta n’omimi karịa gbasara ihe ha ga eme dịka ọgbasara ọrụ ha nile ugbụ a. Mkpughe nke a sochiri.

1–5, Ndị okenye ndị kwesịrị ntụkwasị-obi ndị na-ekwusa ozi-ọma ga-enweta ndụ ebighi-ebi; 6–12, kpee ekpere ịnata Onye-nkasị-obi, onye nke na-akụzi ihe nile; 13–22, Ndị okenye ga-anọdụ n’ikpe nye ndị ahụ n’anabataghị ozi ha; 23–36, Ezi na ụlọ nile nke ndị mgbasa ozi-ọma ga-anata enyem-aka site na Nzukọ-nsọ.

1 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, mụ onye nke na-ekwu okwu ọbụna site an’olu nke Mụọ m, ọbụna bAlfa na Omega, Onye-nwe unu na Chineke unu—

2 N̄aa-ntị, O unu ndị nyeworo aha unu ka ọ pụa ikwusa ozi-ọma m, na aibecha bubi vine nke m.

3 Lee, a sị m unu na ọ bụ echiche m na unu ga-aga ma ghara inọrọ, ọbụghị ma unu ga-anọ ana-efu kama rụọ ọrụ ka ume unu ha—

4 Na-ewelite olu unu nile dị ka olu oke opi, ana-ama ọkwa bezi-okwu ahụ dịka mkpughe nile na iwu-nsọ nile nke m nyeworo unu siri dị.

5 Ma otu a, ọ bụrụ na unu ekwesị ntụkwasị obi a ga-achiju aukwu ọka n’azụ unu, a ga-bekpube unu cnnukwu ùgwù, na debube, ena-anwụghịanwụ, na fndụ ebighi-ebi.

6 Ya mere, n’ezie a sị m, nwa odibo m William E. McLellin, e aweghachiwo m ikike nke m nyeworo ya ịga na mba nile nọ na ọwụwa-anyanwụ;

7 Ma e nye m ya ikike ọhụrụ na iwu-nsọ ọhụrụ, n’ime nke mụ, Onye-nwe, aga-ata ya ahụhụ maka bntamu nile nke obi ya;

8 Ma o mehiere; otu osila dị, agbagharawo m ya ma sị ya ọzọ, Gaa nụ n’ime mba nile dị na ọdịda anyanwụ.

9 Ma ka nwa odibo m Luke Johnson soro ya jee, ma maa-ọkwa ihe nile ndị m nyeworo ha n’iwu—

10 Na-akpọku aha nke Onye-nwe maka aOnye-nkasị-obi, nke ga-akụziri ha ihe nile nke dị mkpa maka ha—

11 aNa-ekpe ekpere oge nile ka ha ghara ịda mba, ma ọ bụrụraa na ha emee nke a, a ga m anọnyere ha ọbụna ruo n’ọgwụgwụ.

12 Lee, nke a bụ echiche nke Onye-nwe Chineke unu gbasara unu. Ọbụna otu a Amen.

13 Ma ọzọ, n’ezie otu a ka Onye-nwe sịrị, ka nwa odibo m aOrson Hyde na nwa odibo m bSamuel H. Smith gaa njem baa n’ime mba nile dị n’ọwụwa anyanwụ, ma kwusaa ihe nile nke m nyeworo ha n’iwu; ma ọbụrụra na ha ekwesị ntụkwasị obi, lee, a ga m canọnyere ha ọbụna rue n’ọgwụgwụ.

14 Ma ọzọ, n’ezie a sị m nwa odibo m Lyman Johnson, na nwa odibo m aOrson Pratt, ha ga-aga kwa njem ha baa na mba nile dị n’ọwụwa anyanwụ; ma lee, ma hụrụ, a nọnyere m ha kwa, ọbụna rue n’ọgwụgwụ.

15 Ma ọzọ, a sị m nwa odibo m Asa Dodds, na nwa odibo m Calves Wilson, na ha kwa ga-aga njem ha baa na mba nile dị n’ọdịda anyanwụ, ma kwusaa ozi-ọma m, ọbụna dịka m nyeworo ha n’iwu.

16 Ma onye ahụ nke kwesịrị ntụkwasị-obi ga-emeri ihe nile, ma a aga-ebulikwa ya elu n’ụbọchị ikpeazụ.

17 Ma ọzọ, a sị m nwa odibo m Major N. Ashley, na nwa odibo m Burr Riggs, ka ha gaa njem ha kwa baa n’ime mba dị na ndịda.

18 E, ka ndị ahụ nile gaa njem ha, dịka m nyeworo ha n’iwu, na-aga site n’ụlọ rue n’ụlọ, ma site n’ọnụmara rue n’ọnụmara, ma site n’obodo-ukwu rue n’obodo-ukwu.

19 Ma n’ụlọ ọbụla unu bara, ma ha anabata unu hapụ nụ ngọzi unu n’ụlọ ahụ.

20 Ma n’ụlọ ọbụla unu batara ma ha a nabataghị unu, unu ga-apụ ngwa ngwa site n’ụlọ ahụ, ma atichapụ uzuzu dị n’ụkwụ unu ka ọ bụrụ ihe ịgba-ama megide ha.

21 Ma unu ga-ejupụta an’ọn̄ụ ma n’obi-ụtọ; ma mata nke a, na n’ụbọchị nke ikpe unu ga-abụ bndị-ikpe nke ụlọ ahụ, na makwa ha ikpe;

22 Ma ọ ga-akara ndị n’ekweghị ekwe mma n’ụbọchị nke ikpe, karịa ụlọ ahụ; ya mere, akee ihe okike n’ukwu gị ma kwesị nụ ntụkwasị-ọbi, ma unu ga-emeri; ihe nile, ma bụrụ ndị ebuliri elu n’ụbọchị ikpeazụ. Ọbụna otu a Amen.

23 Ma ọzọ otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu, O ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, ndị nyeworo aha unu ka unu mata uche ya gbasara unu—

24 Lee, a sị m unu, na ọ bụ ọrụ nke nzukọ-nsọ inye aka n’ịkwado ezi na ụlọ nke ndị ahụ, na kwa ịkwado ezi na ụlọ nke ndị a kpọrọ ma ọ dị mkpa ka ezipu ha n’ụwa ịma-ọkwa nke ozi-ọma nye ụwa nile.

25 Ya mere,mụ, Onye-nwe, na-enye unu iwu-nsọ nke a, ka unu nweta ebe-obibi nile maka ezi na ụlọ nile, ọbụrụra na ụmụnna unu dị na njikere imepe obi ha nile.

26 Ma ka ndị nwere ike inweta ebe-obibi nile maka ezi na ụlọ nile, na nkwado nke nzukọ-nsọ maka ha, ghara ịhapụ ịga n’ime ụwa, ma-ọbụ n’ọwụwa anyanwụ ma-ọbu n’ọdịda anyanwụ, ma-ọbụ n’elu elu, ma-ọbụ na ndịda.

27 Ka ha rịọ ma ha ga-anata, kụọ aka ma a ga-emeghere ha, ma mee ka amata site n’elu, obụna site n’aka aOnye-nkasị-obi, ebe ha ga-aga.

28 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, na nwoke obula kwesịrị aịkpata ihe maka bezi na ụlọ ya, ka ọ kpata, ma onweghị ụzọ ọ ga-esi tufuo okpu-eze ya; ma ka rụọ ọrụ n’ime nzukọ-nsọ.

29 Ma nwoke ọbụla arụsie ọrụ ike n’ihe nile. Ma bonye nọ nkiti agaghị enwe ọnọdụ n’ime nzukọ-nsọ m’ọbụghị ma o chegharịrị ma mezie ụzọ ya nile.

30 Ya mere, ka nwa odibo m Simeon Carter na nwa odibo m Emer Harris dị n’otu na mgbasa ozi-ọma ahụ;

31 Ma kwa nwa odibo m Ezra Thayre na nwa odibo m aThomas B Marsh;

32 Ma kwa odibo m Hyrum Smith na nwa odibo m Reynolds Cahoon;

33 Ma kwa nwa odibo m Daniel Stanton na nwa odibo m Seymour Brunson;

34 Ma kwa nwa odibo m Sylvester Smith na nwa odibo m Gideon Carter;

35 Ma kwa nwa odibo m Ruggles Eames na nwa odibo m Stephen Brunett;

36 Ma kwa nwa odibo m Michah B. Welton na nwa odibo m Eden Smith. Ọbụna otu a. Amen.