Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 46


Nkeji 46

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma nye Nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio, 8 Maach 1831 (History of the Church, 1:163–165). Na mbido-oge nke a nke Nzukọ-nsọ, ihe nlere anya ejikọrọ-ọnụ maka nduzi nke ofufe-nro nile nke Nzukọ-nsọ apụtabeghi. Otu o sila dị, omenala nke eji akpọbata nanị ndị-otu na ezi ndị nnyocha Nzukọ-nsọ na nzukọ oriri-nsọ nile na ọgbakọ nile ndị ọzọ nke Nzukọ-nsọ abụrụwo ihe dịka o zuru ọha. Mkpughe nke a kwupụtara ọchịchọ nke Onye-nwe gbasara ịchịkọta na idu nzukọ nile.

1–2, Ndị-okenye ga-edu nzukọ nile dịka Mụọ Nsọ si na-eduzi; 3–6, Ndị na-achọ ezi-ọkwụ ekwesịghị ka e wezụga ha site na ofufe-nro nile nke oriri-nsọ; 7–12, Jụọ nụ Chineke ma choo onyinye nile nke Mụọ; 13–26, Ndepụta nke ụfọdụ onyinye ndị a ka e nyere; 27–33, Ndị ndu nile nke Nzukọ-nsọ ka e nyere ike ịmata ihe dị iche n’onyinye nile nke Mụọ.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị nzukọ-nsọ m; n’ihi na n’ezie a sị m unu na ihe ndịa nile ka e kwuworo nye unu maka nrite auru na ọmụmụ-ihe unu.

2 Mana n’agbanyeghị ihe ndị ahụ nile nke e deworo, a na-enyekarị ya rịị andị okenye nke nzukọ-nsọ site na mmalite, ma oge nile ka ọ ga-adị, bidu nzukọ nile dịka ha na-enweta ntụzi-aka na nduzi site n’aka Mụọ Nsọ.

3 Otu o sila dị, e nyere unu iwu ka unu ghara aịchụpụ onye ọbụla site na nzukọ mmadụ nile, nke a na-eme n’iru-ụwa.

4 Unu ka e nyekwara iwu ka unu ghara ịchụpụ onye ọbụla bụ onye anzukọ-nsọ site na nzukọ oriri-nsọ unu nile; otu o sila dị, ọbụrụ na onye ọbụla ejehiewo, ka ọ ghara biketa-oke ruo mgbe o mere udo.

5 Ma ọzọ a sị m unu, unu agaghị achụpụ onye ọbụla site na nzukọ oriri-nsọ unu nile bụ ndị na-achọsi ala-eze ahụ ike—a na m ekwu nke a gbasara ndị ahụ n’abụghị ndị nzukọ-nsọ.

6 Ma ọzọ a sị m unu gbasara nzukọ nile nke aime onye-otu unu, na ọbụrụ na ọ dị ndị n’abụghị ndị nzukọ-nsọ, ndị ji ọchịchọ ha maka ala-eze kpọrọ ihe, unu agaghị achụpụ ha.

7 Mana a na-enye unu iwu n’ihe nile aịrịọ Chineke, onye na-enye n’akpaghị oke; ma nke ahụ nke Mụọ gbara-ama nye unu ọbụna otu a ka m chọrọ ka unu mee bn’ịdị-nsọ nile nke obi, na-agazi ije n’iru m, cna-atụgharị uche n’ọgwụgwụ nke nzọpụta unu, na-eme ihe nile n’ekpere na dịtụ mmamma, ka unu ghara ịbụ ndị ajọọ-mụọ nile ega-edufu, ma-ọbụ ozizi nile nke fekwensu nile, ma-ọbụ giwu nile nke ndị mmadụ; n’ihi na ụfọdụ bụ nke ndị mmadụ ma ndị ọzọ nke ekwensu nile.

8 Ya mere, kpachara-anya ka unu ghara ịbụrụ ndị eduhiere; ma ka a ghara iduhie unu achosie nụ onyinye nile kachasị mma ike, na-echeta oge nile ihe mere eji nye ha;

9 N’ihi na n’ezie a sị m unu, e nyere ha n’ihi nrite-uru nke ndị ahụ hụrụ m n’anya ma na-edebe iwu-nsọ m nile, na onye nke na-achọ ime otu a; ka mmadụ nile wee rite uru bụ ndị na-achọ ma-ọbụ ndị na-arịọ m, na-arịọ site n’aka, m ma ọbụghị maka ihe aịrịba-ama ka ha wee bmefuo ya n’ọchịchọ nile nke anụ arụ ha.

10 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, a chọrọ m ka unu cheta oge nile, ma debegide oge nile an’echiche unu ihe bonyinye ndị ahụ nile bụ, ndị e nyere nzukọ-nsọ.

11 N’ihi na mmadụ nile enweghi onyinye nile e nyere ha; n’ihi na e nwere ọtụtụ onyinye, na nye ammadụ ọbụla ka e nyere otu onyinye site na Mụọ nke Chineke.

12 Ụfọdụ bụ ndị e nyere otu, ma ụfọdụ ka e nyere ọzọ, ka mmadụ nile rite uru site otu a.

13 Ụfọdụ e nyere ha site na Mụọ Nsọ aịmata na Jisus Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke, ma na a kpọgburu ya n’ihi mmehie nile nke ụwa.

14 Ndị ọzọ ka e nyere aikwere n’okwu ha nile, ka ha wee nweta kwa ndụ ebighi-ebi ọbụrụ na ha gaa n’iru n’ikwesị ntụkwasị-obi.

15 Ma ọzọ, ndị ụfọdụ ka e nyere site na Mụọ Nsọ ịmata aọdị-iche nile nke ije-ozị, dịka ọ ga-amasị otu Onye-nwe ahụ, dịka ọchịchọ nke Onye-nwe siri dị nke kwesịrị ebere ya nile dịka ọnọdụ nile nke ụmụ nke mmadụ siri dị.

16 Ma ọzọ, e enyere ya site na Mụọ Nsọ nye ụfọdụ ịmata ịdi iche iche nile nke ọrụ nile, ma ha bụkwa nke Chineke, ka e wee nye onye ọbụla ngosipụta nile nke Mụọ irite uru site na ha.

17 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ụfọdụ ka e nyere, site na Mụọ nke Chineke, okwu nke aamamihe.

18 Onye ọzọ ka e nyere okwu nke aọmụma-ihe, ka mmadụ nile bụrụ ndị a kụziiri ịma-ihe na inwe ọmụma-ihe.

19 Ma ọzọ, ụfọdụ ka e nyere inwe aokwukwe ka a gwọọ ha.

20 Ma ndị ọzọ ka e nyere inwe okwukwe an’ịgwọ ọrịa.

21 Ma ọzọ, ụfọdụ ka e nyere ịrụ ọrụ nile nke aọrụ-ebube;

22 Ma ndị ọzọ ka e nyere aibu amụma;

23 Ma ndị ọzọ aịghọta mụọ dị iche iche.

24 Ma ọzọ, e nyere ya ụfọdụ aịsụ-asụsụ dị iche iche;

25 Ma onye ọzọ ka e nyere ịsụgharị asụsụ dị iche iche.

26 Ma aonyinye ndị a nile bịara site na Chineke, maka nrite-uru nke bụmụ nke Chineke.

27 Ma nye aụkọchukwu nke nzukọ-nsọ, ma nye ndị Chineke ga-ahọpụta ma chie echichi ilekọta nzukọ-nsọ na ka ha bụrụ ndị okenye nye nzukọ-nsọ, ga-enwe kwa nke e nyere ha bịghọta onyinye ndị ahụ nile, adịghị-ama-ama e nwee onye ọbụla n’ime unu nke na-ekwupụta mana, ọ bụghi nke Chineke.

28 Ma ọ ga-eru na onye nke rịọrọ na aMụọ ga-anata na Mụọ;

29 Na ụfọdụ ka e nwere ike inye onyinye nile ndị ahụ, ka e wee nwee onye isi, inwe ike ime ka onye-otu ọbụla rite uru site otu a.

30 Ya onye arịọrọ na bMụọ, rịọrọ dịka cọchịchọ nke Chineke siri dị; ya mere a na-eme ya ọbụna dịka onye ahụ rịọrọ.

31 Ma ọzọ, a sị m unu, aghaghị ime ihe nile n’aha nke Kraịst, ihe ọbụla unu na-eme na Mụọ;

32 Ma unu aghaghị ịnye Chineke aekele n’ime Mụọ n’ihi ngọzi ọbụla e jiri gọzie unu.

33 Ma unu aghaghị, ime aezigbo-omume na bịdị-nsọ n’iru m mgbe nile. Obuna otu a. Amen.