Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121


Nkeji 121

Ekpere na ibu-amụma nile nke Joseph Smith Onye-amụma dere mgbe ọ bụ Onye-mkpọrọ n’ulọ mkpọrọ nọ na Liberty, Missouri, e nyere oge ya ka 20 Maach 1839 (History of the Church, 3:289–300). Onye-amụma na ufọdụ ndị-n’eso ya anọwo ọtụtụ ọnwa n’ime ụlọ mkpọrọ. Akwụkwọ maka ikpe mkpegharị na arịrịọ nile ha nke e nyere ndị-ọrụ ọchịchị na ndị ngalaba-ikpe enwegh-ike iwetara ha enyem-aka.

1–6, Onye-amụma na-ario Onye-nwe maka Ndị-nsọ nile na-ata ahụhụ; 7–10, Onye-nwe kwuru udo nye ya; 11–17, nkọcha ga-adịrị ndị nile na-eti mkpu-mmehie ụgha megide ndị nke Onye-nwe; 18–25, Ha agaghị enwe oke n’ọkwa nchụ-aja, na a ga-ama ha ikpe; 26–32, Mkpughe nile dị ebube ka e kwere na nkwa nye ndị nile nọgidere n’idi ike; 33–40, Ihe kpatara ọtụtụ ka akpọrọ ma ole na ole ka-a họọrọ; 41–46, Ọkwa nchụ-aja ga-abụ, ihe a ga-eji nanị n’ezi-omume.

1 O Chineke, Olee ebe i nọ? Na olee ebe ụlọ-ntu n’ekpuchita ebe anzuzo gị nọ?

2 aRuo ole mgbe ka a ga-edebe aka gị, na anya gị, e, mkpụrụ-anya ọma gị, ga-ele site n’elu-igwe nile nke ebighi-ebi, mmejọ nile nke ndị gị na ndị odibo gị nile, ma ntị gị emepee site na akwa ha nile?

3 E, O Onye-nwe, aruo ole mgbe ka ha ga-ata ahụhụ mmejọ nile ndị a na, ọchịchị-aka-ike iwu n’akwadoghị, tutu obi gị adị nro n’ebe ha nọ, na afọ gị nile enwe ọmiko n’ebe ha nọ?

4 O Onye-nwe Chineke aPụrụ Ime Ihe nile onye kere elu-igwe, ụwa na mmiri nile, na ihe nile dị n’ime ha, onye nwere ike ịtụzi aka na weda ekwensu n’okpuru ya, na abalị ahụ, na ọchịchịrị nke ike ọchịchị Sheol—setipụ aka gị, ka anya gị mepee; ka ewekọrọ ụlọ-ntu, ka ebe bnzuzo gị, ghara ibụ ihe ekpuchiri, tọọrọ m nti gị n’ala, ka obi gị dị nro, na afọ gị nile nwee ọmiko n’ebe anyị nọ.

5 Ka iwe gị wee dị ọkụ megide ndị iro anyị na, n’ọnụma nke obi gị, jiri mma agha abọọrọ anyị ọbọ mmejọ nile e mejọrọ anyị.

6 Cheta ndị-nsọ nọ n’ahụhụ, O Chineke anyị, na ụmụ odibo gị ga-an̄ụrị n’aha gị ruo mgbe nile.

7 Nwa m udo dịrị mkpụrụ obi gị, aihe isi-ike gị na nsogbu nile gị ga-abụ maka nwa oge nta.

8 Ma mgbe ahụ, ọ bụrụ na ị anagide ya nke ọma, Chineke ga-ebuli gị n’elu, i ga-emeri ndị iro gị nile.

9 aNdị enyi gị nile ga-eguzogide gị, ma ha ga-ekele gị ọzọ jiri obi ọnụnụ-ọkụ nile na aka nile nke ndị enyi.

10 Ị dịbeghị ugbụ a ka aJob; ndị enyi gị agbaghị kwa mbọ megide gị, ma-ọbụ gụọ ịwu njehie megide gị, dịka ha mere Job.

11 Na ha ndị ahụ na-agụrụ gị iwu njehie, olile-anya ha ga-ala n’iyi, na ezi ọdịn’iru obi ha nile ga-agbaze dịka aigirigi n’agbaze n’ihi ikike anyanwụ na-awalite;

12 Na kwa na Chineke e doziwo aka ya na nrachi ya igbanwe mgbe nile na aoge nile, na ikpu-ha-isi n’echiche ha, ka ha ghara ịghọta ọrụ ya nile dị ịtụ-n’anya, ka O wee nwaa kwa ha na jichie ha n’aghụghọ onwe ha nile;

13 Na n’ihi na obi ha nile ruru-inyi, na ihe nile ha dị na njikere iweta maka ịdakwasị ndị-ọzọ, na hụ n’anya ime ka ndị-ọzọ taa ahụhụ ha, nwee ike ịdakwasị aonwe ha ruo na uju ya nile.

14 Ka ha ghara inweta ihe ha bu n’obi kwa, na ka olile-anya ha nile bụrụ ihe lara n’iyi;

15 Na mgbe ọtụtụ afọ n’agaghị site ugbụ a, ka ha na ụmụụmụ ha bụrụ, ndị ehichapụrụ site n’okpuru elu-igwe, ka Chineke kwuru, ka enwela otu n’ime ha nke ga-eguzo n’agịga mgbidi.

16 Nkọcha ga-adịrị ndị ahụ nile ga-eweli ikiri-ụkwụ ha imegide ndị m aetere-mmanụ, ka Onye-nwe kwuru, na tie-mkpu na ha bemehiewo mgbe ha n’emehieghị n’iru m, ka Onye-nwe kwuru, mana ha emewo ihe dị mma n’anya m nile, bụ nke m nyere ha n’iwụ.

17 Mana ndị ahụ na-eti mkpu njehie na-eme ya n’ihi na ha bụ ụmụ odibo nke mmehie, na bụrụ aụmụ nke nnupụ-isi ha onwe ha.

18 Na ndị ahụ na-an̄ụ iyi ụgha megide ndị odibo m, ka ha nwe-ike iwebata ha n’ịbụ-oru na ọnwụ—

19 Ahụhụ ga-adiri ha, n’ihi ha aemehiewo ndị nta nke m, a ga-ewepụ ha site na bemume-nsọ nile nke ụlọ m.

20 aAbọ ha a gaghị ejụ, ụlọ ha nile na ọba ha nile ga-ala n’iyi, ma ha onwe ha ga-enweta ịkpọ-asị site na ndị ahụ toro ha otuto n’esighi n’obi.

21 Ha a gaghị enwe nketa na aọkwa nchụ-aja, ma-ọbụ ụmụụmụ ha mgbe ha gasịrị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

22 Ọ ga-adịrị ha amma rịị karịa na e weere nkume-igwe-nri kwụba ha rịị n’olu nile, ma ha emikpuo n’ogbu nke oke osimiri.

23 Ahụhụ ga-adịrị ndị ahụ nile na-enye ndị m nsogbu na chụpụ, na gbuo, na gbaa-ama megide ha, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha kwuru; aọgbọ nke ajụ-ala agaghị agbanarị ọmụma-ikpe nke ala mụọ.

24 Lee, anya nile nke m ana-ahụ na mara ọrụ ha nile, na e nwere m na nchekwa bikpe ọsọ ọsọ n’oge ahụ na-abia, maka ha nile.

25 N’ihi e nwere aoge ahọpụtara maka onye ọbụla, dịka bọrụ ya nile siri dị.

26 Chineke ga-enye unu aọmụma-ihe site na bMụọ Nso ya, e, site na conyinye ahụ n’anaghị ekwu-okwu nke Mụọ Nsọ, nke n’ekpughebeghị ke mgbe ụwa dịịrị ruo ugbụ a;

27 Nke ndị nna-nna anyị ha jiri olile-anya nchekasi-ahụ, na-echere ka e kpughee n’oge ikpe-azụ nile, nke e duuru uche ha nile gaa site na mụọ-ozi nile, dika e dotara na-nchekwa maka uju nile nke ebube ha.

28 Otu oge ga-abia mgbe an’enweghị ihe a ga-ejichi, ma-ọbụ na e nwere otu Chineke ma-ọbụ ọtụtụ bchi nile, a ga-egosiputa ha.

29 Oche-eze nile na ọtụtụ ebe ọchịchị, ala-ọkpara-eze nile na ike nile, ka a ga-aekpughe, na yikwasị ya ndị nile nọgidere n’ịdị ike maka ozi-ọma ahụ nke Jisus Kraịst.

30 Na kwa ọ bụrụ na e nwere aoke nke elu-igwe nile ma-ọbụ nke oke osimiri nile, ma-ọbụ nke ala-akọrọ, ma-ọbụ nke anyanwụ, ọnwa ma-ọbụ kpakpando nile—

31 Oge nile nke ntụgharị ha, ụbọchị nile nke akara-aka, ọnwa nile, na afọ nile, na ụbọchị nile nke ụbọchị ha nile, ọnwa nile, na afọ nile, na ebube ha nile, iwu nile, na oge akara, aka, ka a ga-ekpughe n’ụbọchị nile nke aọgbọ nke ozuzu oge nile akara aka—

32 Dịka nke ahụ echiri echichi n’etiti ndị aKansụl nke bChineke Mgbe ebighi-ebi nke chi nile ndị ọzọ tutu ụwa nke a adịrị, nke edotara na nchekwa rụọ na nsọtụ na ọgwụgwụ nke ya, mgbe onye ọbụla ga-abanye n’ime ciru ebighi-ebi ya na n’ime dizu-ike anwụ-anwụ ya.

33 Rụọ ole mgbe ka mmiri na asọ-asọ ga-anọ n’adịghị ọcha? Ole ike ga-akwụsi elu-igwe nile? Ọzọ kwa mmadụ o nwere ike ịsetipụ ntakịrị aka ya ịkwụsị Osimiri Missouri n’ụzọ ya akara-aka, ma-ọbụ ịtụgharị mmịrị ahụ isi, iji kwụsị Onye Pụrụ Ime Ihe nile site na ịwụsa ammụta site n’elu-igwe n’isi nke Ndị-nsọ nke Ụbọchị-Ikpeazụ a.

34 Lee, ọtụtụ ka aakpọrọ mana ole na ole ka a bhọọrọ. Ma gịnị mere eji-họrọghị ha?

35 N’ihi obi ha nọ karịa n’ihe nile nke aụwa nke a, ma na-achọ bnnukwu-ugwu nile nke mmadụ mana ha amụtaghị otu ihe mmụta nke a—

36 Na aoke nile nke ọkwa nchụ-aja jikọrọ ọnụ n’enweghi ókè ya na bike nile nke elu-igwe, na kwa ike nile nke elu-igwe abụghi ihe a ga-atụzi aka ya ma-ọbụ metụ-aka ewezuga site n’ụkpụrụ nile nke cezi-omume.

37 Ka e nwee-ikike nyefee anyị ha, ọ bụ ezie; mana mgbe anyị nakweere aikpuchi bmmehie anyị nile ma-ọbụ ịmeta cmpako anyị mma, ọchịchọ nke ihe efu anyị, ma-ọbụ ịgosị ntụzi-aka ma-ọbụ ebe ọchịchị, ma-ọbụ nrụgide nye mkpụrụ obi nile nke ụmụ nke mmadụ, rụọ n’ogo ọbụla nke ajọọ-omume, lee, elu-igwe nile dewezuga onwe ha, Mụọ nke Onye-nwe enwee mwuta, na mgbe o wezugara onwe ya, Amen nye ọkwa nchụ-aja ma-ọbụ ikike nke nwoke nke ahụ.

38 Lee, tutu ya amata, a na ahapụrụ ya onwe ya, aịgba ihe ndụdụ nile ụkwụ, bisọgbu ndị nsọ nile na ịlụ-ọgụ megide Chineke.

39 Anyị amụtawo n’ụzọ dị mwute na ọ bụ aụdị okike na ndozi usoro nke ọfọdụrụ nta ịdị-n’ime mmadụ nile, na ngwa-ngwa ha nwetara ntakịrị ikike, dika ha chere, ha ga-amalite ọsọ-ọsọ ịchị ọchịchị ajọọ-omume.

40 Ya mere ọtụtụ ka akpọrọ mana ole na ole ka a họọrọ.

41 O nweghị ike ma-ọbụ ike na-arụ ọrụ n’ime nwere ike ma-ọbụ kwesịrị ịkwado n’ụzọ ezigbo omume ọkwa nchụ-aja, ewezuga site na aime ka-ekwere, site bn’ogọlogọ-ntachiobi, site na ịdị-umeala na ịdị nwayọ, na site n’ịhụ n’anya nke iru abụọ n’adịghị ya.

42 Site n’obi-ọma, na mmụta n’enweghị ntụpọ, nke ga-eme ka mkpụrụ obi buwanye n’ịdị ukwuu, n’enweghi airu abụọ, na n’enweghi baghụghọ.

43 aNa-ata ụta dị-ụfụ mgbe o kwesịrị, mgbe Mụọ Nsọ dakwasịrị, na mgbe ahụ n’egosipụta ma-emesịa mbawanye nke bịhụn’anya nye onye ahụ nke ị tara-ụta, ka ọ ghara ịkpọ gị onye iro ya.

44 Ka ọ wee mara na ikwesị-ntụkwasị-obi nke gị, dị ike karịa ụdọ nile nke ọnwụ.

45 Ka afọ gị nile kwa jupụta na afọ-ọma nye mmadụ nile na nye-ezi na ụlọ nke okwukwe, na ka aezigbo omume chọọ bechiche gị nile mma n’agwụghi agwụ, mgbe ahụ ka nchekwube gị ga-esi ike karịa n’iru Chineke, na ozizi nke ọkwa nchụ-aja ga-atasa na mkpụrụ obi gị dịka cigirigi site n’elu-igwe.

46 aMụọ Nsọ ga-abụkwa onye nso gị mgbe nile, na mkpa-na-aka gị, mkpa-na-aka na-anaghi agbanwe nke ezi-omume na ezi okwu, na bebe ọchịchị gị ga-abụ ebe-ọchịchị mgbe nile na-adigide, na n’enweghi ụzọ nke nkwagide, ọ ga-asọrutere gị ruo mgbe nile na mgbe nile.