Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 109


Nkeji 109

Ekpere ekpere na emume e ji rara Temple Kirtland, Ohio, nye Chineke na 27 Maach 1836 (History of the Church, 2:420–426). Dịka nkọwasi nke Onye-amụma dere, ekpere nke-a ka e nyere ya site na mkpughe.

1–5, Temple Kirtland ahụ ka-arụrụ ka ebe Ọkpara nke Mmadụ ga-abata; 6–21, Ọ ga-abụ ụlọ nke ekpere, ibu-ọnụ, okwukwe, mmụta, otuto, na usoro, na ụlọ nke Chineke; 22–33, Ka ndị n’echegharịghị ndị na-emegide ndị nke Onye-nwe nwe mgbagwọ-ju-anya; 34–42, Ka ndị nsọ pụọ n’ike ikpọkọta ndị ezi-omume baa na Zaịọn; 43–53, Ka anapụta ndị nsọ nile site na ihe dị egwu nile a ga-awụsa n’elu ndị ajọọ-mmadụ n’ụbọchị ndị ikpeazụ; 54–58, Ka mba nile na mmadụ nile na nzukọ-nsọ nile dịrị na njikere maka ozi-ọma; 59–67, Ka ndị Juu, ndị Leman, na Israel nile bụrụ ndị agbapụtara; 68–80, Ka ndị nsọ bụrụ ndị ekpubere okpu-eze nwere ebube na ugwu na nwee nzọpụta ebighi-ebi.

1 aEkele nile dịrị aha gị, O Onye-nwe Chineke nke Israel, onye na-edo bọgbụgba ndụ na gosi ebere nye ụmụ-odibo gị ndị na-aga ije ziri-ezi n’iru gị, jiri obi ha nile.

2 Gị onye nyeworo ndị odibo gị iwu aịrụ ụlọ n’aha gị n’ebe a [Kirtland].

3 Na ugbụ a i hụwo, O Onye-nwe, na ụmụ odibo gị emewo dịka iwu-nsọ gị-siri dị.

4 Na ugbua anyị na arịọ gị, Nna dị nsọ, n’aha Jisus Kraịst, Ọkpara ahụ nke obi gị, onye nani n’aha ya ka nzọpụta ga-esi erute ụmụ nke mmadụ, anyị na-arịọ gị, O Onye-nwe, ka ị nabata aụlọ nke a, bọrụ-aka nke aka anyị nile, ụmụ odibọ gị, nke i nyere anyị iwu ka anyị wuo.

5 N’ihi i matara na anyị arụwo-ọrụ nke a site na nnukwu mkpagbu; na site na ị da ogbenye anyị, anyị enyewo ihe anyị nwere iji wuo otu aụlọ nye n’aha gị, ka Ọkpara nke Mmadụ wee nwee-otu ebe ọ ga-egosipụta onwe ya nye ndị nke ya.

6 Na dịka i kwuworo n’ime otu amkpughe, inyeworo anyị, na-akpọ anyị ndị enyi gị, na-asị-kpọọ nụ ọgbakọ ofufe nro, dịka m nyere unu n’iwu;

7 Na dịka mmadụ nile enweghi okwukwe, jiri nụ irụsi-ọrụ ike chọọ na kuziere otu onye nye ibe ya okwu nile nke amamihe, e chọọ nụ site n’akwụkwọ nile kachasị mma okwu nile nke amamihe, chọọ mmụta ọbụna site n’imụ ihe na kwa site na okwukwe;

8 Hazie nụ onwe unu; kwadobe ihe nile dị mkpa, na hiwe otu ụlọ, ọbụna ụlọ nke ekpere, ụlọ nke obubu ọnụ, ụlọ nke okwukwe, ụlọ nke ọmụmụ-ihe, ụlọ nke ebube, ụlọ nke usoro, ụlọ nke Chineke;

9 Ka mbata unu nile wee bụrụ n’aha nke Onye-nwe, ka ọpụpụ unu nile wee bụrụ n’aha nke Onye-nwe, ka ekele unu nile wee bụrụ n’aha nke Onye-nwe, jiri aka nile achiliri-elu nye Onye Kachasị Elu—

10 Na ugbua, Nna dị nsọ, anyị na-arịọ gị ka i nyere anyị aka, ndị gị, site na amara gị, n’ịkpọkọta ọgbakọ ofufe nro anyị, ka e mee ya nye nnukwu ugwu gị na nye nnabata gị dị nsọ;

11 Na n’ụzọ nke a ga-ahụta anyị ka ndị kwesịrị ekwesị, n’iru gị, iji nweta mmezu nke ankwa nile nke ikweworo anyị, ndị gị, n’ime mkpughe nile e nyereworo anyị.

12 Ka aebube gị dakwasị n’elu ndị gị, na n’elu ụlọ gị nke a, nke anyị na-arara nye gị ugbụ a, ka e doo ya nsọ na bụrụ ihe enyefechasịrị ka ọ dị nsọ, na ka iru gị dị nsọ dịrị mgbe nile n’ime ụlọ nke a;

13 Na ka ndị nile ndị ga-abata n’ọnụ ụzọ nke ụlọ Onye-nwe wee nwee mmetụta nke ike gị, na nwee mkwagide nke ikwere na gị edowo ya nsọ, na kwa ọ bụ ụlọ gị, otu ebe nke ịdị nsọ gị.

14 Na mee ka ị nakwere, Nna dị nsọ, ka ndị nile ndị ga-ekpere gị n’ụlọ nke a bụrụ ndị a ga-akụziri okwu nile nke amamihe site n’akwụkwọ nile kachasị nma, na ka ha chọọ mmụta ọbụna site n’ịmụ-ihe, ma kwa site n’okwukwe, dị ka ị kwuworo;

15 Na ka ha tolite na gị, na nata uju nke Mụọ Nsọ, na bụrụ ndị ahaziri dịka iwu gị nile siri dị, na dịrị na-njikere inweta ihe nile dị mkpa;

16 Na ka ụlọ nke a wee bụrụ ụlọ nke ekpere, ụlọ nke obubu ọnụ, ụlọ nke okwukwe, ụlọ nke otuto na nke Chineke, ọbụna ụlọ gị;

17 Ka mbata nile nke ndị gị, n’ime ụlọ nke a, wee bụrụ n’aha nke Onye-nwe;

18 Ka ọpụpụ ha nile site n’ụlọ nke a wee bụrụ n’aha nke Onye-nwe;

19 Na ka ekele ha nile wee bụrụ n’aha nke Onye-nwe; jiri aka nile dị-nsọ, achiliri nye Onye Kachasị Elu;

20 Na ka aghara-ikwe ihe ọbụla an’adịgh ọcha ịbata n’ime ụlọ gị ị merụ ya;

21 Na mgbe ndị gị jehiere, onye ọbula n’ime ha, ka ha chegharịa ọsọ-ọsọ na lọghachikwute gị, na chọta iru-ọma n’iru gị, na bụrụ ndị akpọghachiri ịnata ngọzi nile nke ikwadoro a ga-awụsa n’elu ndị ahụ ndị aga-asọpụrụ gị n’ime ụlọ gị.

22 Na anyị na-arịọ gị, Nna dị nsọ, ka ndị odibọ gị gara pụọ site n’ụlọ nke a bụrụ ndị a akwadoro site n’ike gị, na ka aha gị dịkwasị n’elu ha, na ka ebube gị dịrị gburu-gburu ha, na ka andị mụọ ozi gị bụrụ ndị na-eche ha nche;

23 Na site n’ebe a ha ga agba-ama nnukwu oke ihe dị ebube, n’ezi-okwu, ruo ansọtụ nile nke ụwa, ka ha wee mara na nke a bụ ọrụ gị, na kwa ị setịpụwo aka gị, imezu ihe ahụ nke gị onwe gị kwuru site n’ọnụ ndị amụma, gbasara ụbọchị ndị ikpeazụ.

24 Anyị na-arịọ gị, Nna dị nsọ, ka ihiwe ndị ga-ekpere gị, na nwee nkwanye-ugwụ na aha na ọnọdụ n’ụlọ nke gị nke a, rute ọgbọ nile ma ruo mgbe ebigh ebi;

25 Ka a ghara inwe ngwa-agha ọbụla aakpụrụ megide ha ga-eme nke ọma, ka onye ahụ nke gwuworo bọlụlụ maka ha daba n’ime ya na onwe ya;

26 Ka aghara inwe mgbakọ-aka nke ajọọ-omume ga-enwe ike ibilite na amegide ndị nke gị ndị a ga akpọkwasị baha gị ma tinye n’ime ụlọ nkea;

27 Na ọbụrụ na ndị ọbụla ebilie imegide ndị nke a, ka iwe gị bilie megide ha;

28 Na ọ bụrụ na ha ga-ebuso ndịa agha ị ga-ebuso ha agha; ị ga-alụ ọgụ maka ndị nke gị dịka i mere n’ụbọchị agha ka ha nwee ike ibụ ndị anapụtara site n’aka ndị iro ha nile.

29 Anyị na-arịọ gị, Nna dị nsọ, ka ịgbagwọjuo ha anya, na mee ha ihe ịtụ-na-anya, na n’iwetara ha ihere na aghara, ndị nile gbasaworo akụkọ ụgha nile na mba ndị ọzọ, na ụwa nile, megide nwa odibo gị ma-ọbụ ndị odibọ gị, ọ bụrụ na ha agaghị echegharị, mgbe aga ama ọkwa nke ozi-ọma mgbe nile na-adigide na nti ha nile;

30 Na ka ọrụ ha nile wee bụrụ ihe efu, na bụrụ ihe aụzụ mmiri sọpụrụ, ma site n’ikpe nke i ga-ezita n’isi ha n’iwe gị, ka ewe nwee ọgwụgwọ nye bụgha nile na nkatọ nile megide ndị gị.

31 N’ihi ị mara, O Onye-nwe, na ndị odibọ gị enweghi ụta n’iru gị n’ịgba-aka-ebe nke aha gị, nke ha siri n’ihi ya na-ata ahụhụ ndị a.

32 Ya mere anyị na-arịọ n’iru gị maka nnapụta juru-eju ma zuo oke site an’ibu arụ nke a;

33 Gbajipụ ya, O Onye-nwe, gbajipụ ya site n’olu nile nke ụmụ ọdịbọ gị, site n’ike gị ka anyị wee bilie n’etiti ọgbọ nke a na rụọ ọrụ nke gị.

34 O Jehova, nwee-ebere n’ebe ndị a nọ, na dịka mmadụ nile ana-eme mmehie gbaghara njehie nile nke ndị gị, na ka ehichapụ ha ruo mgbe nile.

35 Kwee ka aite-mmanụ nke ndị ozi gị rapara n’elu ha, jiri ike si n’elu.

36 Kwee ka e mezuo ya n’elu isi ha, dịka n’isi ndị ahụ n’ụbọchị nke Pentikọst; kwee ka onyinye ahụ nke aasụsụ dị iche-iche bụrụ ihe awụkwasiri n’elu isi ndị nke gị, ọbụna ire bchara acha dịka nke ọkụ, na ntụghari-okwu si na ya.

37 Na kwee ka ụlọ gị ju, dịka jiri oke ifufe mberede, jiri aebube gị.

38 Yikwasị ndị odibo gị aigba-ama ahụ nke ọgbụgba ndụ ahụ, ka mgbe ha pụrụ na maa ọkwa-okwu gị, ha ga barachi iwu ahụ, na kwado obi nile nke ndị nsọ gị maka ikpe ndị ahụ nile nke ị na-akwado izita, n’oke iwe gị, n’elu ndị nile bi cn’ụwa, n’ihi njehie ha nile, ka ndị gị wee ghara ịda-mba n’ụbọchị nke nsogbu.

39 Na obodo-ukwu ọbụla nke ndị odibọ gị ga-aba, ma ndị obodo-ukwu ahụ anabata ịgba-ama ha, ka udo gị na nzọpụta gị dakwasị obodo-ukwu ahụ; ka ha wee kpọpụta site n’obodo-ukwu ahụ ndị ezi-omume, ka ha pụta na aZaịọn, ma-ọbụ stek ya nile, ebe nke ị họpụtara, jiri abụ nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide;

40 Na ruo mgbe a ga-emezu nke a, ekwela ka ikpe gị nile dakwasị obodo-ukwu ahụ.

41 Na obodo-ukwu ọbụla ndị odibo gị ga-aba, ma ndị obodo ahụ anabataghị igba-ama nke ndị odibo gị, ma ndị odibo gị adọọ ha aka-na-nti ka ha zọpụta onwe ha site n’ọgbọ ndị ekwe-ekwe, ka ọ dị kwara obodo-ukwu ahụ dịka nke ahụ ikwuworo site n’ọnụ nile nke ndị-amụma gị.

42 Mana gị napụta, O Jehova, anyị na-arịọ gị, ụmụ odibo gị site n’aka ha nile, na sachapụ ha site n’ọbara ha.

43 O Onye-nwe, anyị enweghị obi ụtọ na-mbibi nke ndị mmadụ ibe anyị, amkpụrụ-obi ha nile dị oke-ọnụ-ahịa n’iru gị;

44 Mana okwu nke gị aghaghị-imezurịrị. Nyere ụmụ odibo gị aka ikwu, site na aamara gị na-enyere ha aka: Ka emee uche gị, O Onye-nwe, na ọbụghị nke anyị.

45 Anyị maara na ị kwụwo site n’ọnụ ndị-amụma gị ihe nile dị-egwu gbasara ndị ajọọ-mmadụ, n’ụbọchị ndị aikpeazụ-na i ga-awụpụ ikpe gị nile, n’enweghị atụ;

46 Ya mere, O Onye-nwe napụta ndị gị site na ọdachi nile nke ajọọ-mmadụ; gbaa ndị odibọ gị ume ịrachị iwu ahụ, na kechie ihe ịgba-ama ahụ; ka ha wee nọrọ na-njikere maka ụbọchị ahụ nke nrepịa.

47 Anyị na-arịọ gị, Nna-dị-nsọ, ka ị cheta ndị ahụ ndị bi na ógbè Jackson, Missouri, achụpụrụ site n’ala nile nke nketa ha na, gbajipụ, Ọ Onye-nwe ibu-arọ nke mkpagbu nke a nke a nyakwasịrị n’isi ha.

48 gị onwe gị maara, O Onye-nwe, na ha nọ n’aka mkpagbu na nsogbu site n’aka ndị ajọọ-mmadụ; na obi anyị nile ajupụtara n’iri-uju n’ihi nnukwu ibu-arọ ha nile.

49 O Onye-nwe aruo ole mgbe ka i ga-ahapụ ndị nke a iburu mkpagbu nke a, na akwa nile nke ndị ha n’enweghi-ụta ka ọgbago rute ntị gị abụọ na kwa bọbara ha gbagoo n’igba-ama n’iru gị, na ghara igosipụta igba-ama gị n’ọnọdụ ha?

50 Mee aebere, Onye-nwe, nye ndị ajọọ otu ọgba-ghara ahụ, ndị chụpụworo ndị gị, ka ha kwụsị mbibi, ka ha chegharịa site na mmehie ha nile m’ọbụrụ na a ga-achọta nchegharị;

51 Mana ọbụrụ na ha agaghị akwusi, gbaa ogwe aka gị ọtọ, O Onye-nwe, na agbapụta ndị ahụ gị onwe gị họpụtaara Zaịọn nye ndị gị.

52 Na ọbụrụ na ọgaghị adị ụzọ ọzọ, ka olile anya ndị nke gị ghara ịda n’iru gị, kwee ka iwe gị malite, na kwa iwe-ọkụ gị dakwasị ha, ka ha nile bụrụ ndị ekpochapụrụ ma mgbọrọgwụ ma alaka site n’okpuru elu-igwe;

53 Mana ọ bụrụraa na ha ga-echegharị, ị bụ onye amara na obi ebere, na ga-ewezuga oke-iwe gị mgbe ilere-anya n’iru Onye Itere mmanụ.

54 Mee ebere, O Onye-nwe, n’elu mba nile nke ụwa; mee ebere n’isi ndị-ọchịchị nke ala anyị; kwee ka ụkpụrụ nile ndị ahụ, nke echekwara na-nnukwu ugwu na oke omume, n’ikpọ ya aha, aakwụkwọ iwu ahụ nke ala anyị, site na nna anyị ha, bụrụ ihe ehiwere ruo mgbe nile.

55 Cheta ndị-eze, ndị ọkpara eze, ndị ama-ama, na ndị ukwu nile nke ụwa, na ndị mmadụ nile, na nzukọ-nsọ nile, ndị ogbenye nile, ndị nwere mkpa, na ndị nile nọ na mkpagbu nke ụwa;

56 Ka obi ha nile wee dị nro mgbe ndị odibọ gị ga-apụ, site n’ụlọ gị, O Jehova, igba-ama nke aha gị; ka ikpe n’ezigh ezi ha wee nye-ohere n’iru aezi-okwu, ka ndị nke gị wee nata iru-ọma n’iru anya nke ndị nile;

57 Ka nsọtụ nile nke ụwa wee mara na anyị, ndị odibo gị, a anụwo olu gị, nakwa na ọbụ gị zipụrụ anyị;

58 Na site n’ime ndị a nile, ụmụ odibo gị, ụmụ nile nke Jekọb ga-achikọta ndị ezi-omume iji wulite obodo-ukwu dị-nsọ nye aha gị, dịka inyeworo ha n’iwu.

59 Anyị na-arịọ gị ka ị họpụtara Zaịọn astek ndị-ọzọ n’akụkụ nke a, nke i họpụtaworo, ka bmkpọkọta nke ndị gị wee gaa n’iru na nnukwu ike na ụdị-eze, ka ọrụ gị bụrụ ihe egbubiri cmkpụmkpụ n’ezi-omume.

60 Ugbụ a okwu ndị a, O Onye-nwe, anyị ekwuwo n’iru gị, gbasara mkpughe nile na iwu-nsọ nile nke ị nyeworo anyị, ndị ahụtara ama ka andị Jentaịlụ.

61 Mana i mara na i nwere oke ịhụnanya maka ụmụ nke Jekọb, ndị ekposasịrị n’elu-ugwu nile n’oge dị anya, n’ụbọchị nke igwe-ojii na ọchịchịrị.

62 Ya mere anyị na-arịọ gị ka i mee-ebere n’isi ụmụ nke Jekọb, ka aJerusalem, site na awa nke a, wee malite i bụ ndị agbapụtara.

63 Na ibu-arụ nke ịbụ oru wee malite ịbụ ihe anyakwasịrị site n’ụlọ nke aDevid.

64 Na ka ụmụ nke aJuda wee malite ilọghachi bn’ala nile nke ị nyere Abraham, nna ha.

65 Na mee ka andị nke fọdụrụ na ndị nke Jekọb, ndị abụworo-ọnụ na tie-kwa ihe oti-ti n’ihi njehie ha, bụrụ ndị bagbanwere site na ọnọdụ, ndị ime-ọhịa na nsogbu baa n’uju nke ozi-ọma mgbe nile na-adigide;

66 Ka ha tọgbọ ngwa-ọgụ ha nile nke ikwafu-ọbara, ma kwụsị nnupụ-isi ha.

67 Na ka ndị nile fọdụrụ na ndị ekposasịrị n’ụlọ nke aIsrael, ndị nke achụpụrụ ruo nsọtụ nile nke ụwa, bịa n’ọmụma nke ezi-okwu ahụ, kwere na Mesaịa, na bụrụ ndị agbapụtara site na-mkpagbụ, na n̄ụrịa ọn̄ụ n’iru gị.

68 O Onye-nwe, cheta nwa odibo gị, Joseph Smith, Nta, na ntaram ahụhụ ya nile na mkpagbu ya nile-otu o siri agbaa ọgbụgba-ndụ ya na bJehova, ma kwe gị nkwa, O Chineke ukwu nke Jekọb—na iwu-nsọ nile ahụ nke i nyeworo ya, na kwa nke o jisiri-ike n’ezie iji gbalịa mee uche gị.

69 Mee ebere, O Onye-nwe, n’isi nwunye na ụmụ ya; ka ha bụrụ ndị e buliri elu n’iru gị, ma chekwaa site n’aka-ọzụzụ gị.

70 Mee ebere n’isi ndị nile ametụtara ha, ka ikpe n’ezighị-ezi ha nile bụrụ ihe gbajisiri na zafuo dịka ide mmiri; ka ha bụrụ ndị a gbanwere na gbapụta ha na Israel, na mara na gị bụ Chineke.

71 Cheta, O Onye-nwe, ndị-isi nduzi, ọbụna ndị-isi nduzi nile nke nzukọ-nsọ gị, na ka aka nri gị bulie ha, ha na ezi na ulo ha nile na ndị nile metụtara ha, ka aha ha bụrụ ihe ga adigide na bụrụ ihe ga-adị na ncheta mgbe nile na-adigide site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

72 Cheta nzukọ-nsọ gị nile, O Onye-nwe, ha na ezi na-ụlọ ha nile, na ndị nile metụtara ha, ha na ndị ọria ha nile na ndị nọ na mkpagbu, ya na ndị ogbenye nile na ndị dị nwayọ nke ụwa; ka aala-eze ahụ, nke iwulitere n’ejighi aka abụọ, ga-abụrụ oke ugwu na jupụta ụwa dụm.

73 Ka nzukọ-nsọ gị pụta íhè site na ọzara nke ọchịchịrị, na nwupụta na ịma-mma dịka aọnwa, mụkasịa dịka anyanwụ, na dị-egwu dịka usuu-ndị-agha ji ọkọlọtọ nile;

74 Na ka achọọ ya mma dịka nwanyị ọhụrụ-maka ụbọchị ahụ mgbe ọ ga-ekpughe elu-igwe nile ma mee ka ugwụ nile si n’iru gị asọfee, na bndagwurugwu nile ka a ga-ebuli elu, ebe nile na-akpọ ogwu ga-aghọ kwa ebe dị larịị; ka ebube gị wee jupụta ụwa.

75 Ka mgbe opi ahụ ga-ada maka ndị nwụrụ-anwụ, anyị ka a ga aewelikọ n’igwe-ojii ị bịakwute gị, ka anyị, na Onye-nwe nọrọ mgbe nile;

76 Ka uwe anyị nile wee dị-ọcha, ka anyị bụrụ ndị a ga-eyinye auwe-mwụda nke ezi-omume, jiri igu-nkwụ n’aka anyị, na bokpụ-eze nile nke ebube n’isi anyị nile, na ghọta cọn̄ụ nke ebigh ebi maka dahụhụ anyị nile.

77 O Onye-nwe Chineke Pụrụ Ime Ihe nile, nụrụ olu arịrịọ anyị ndị a, na zaa anyị site n’elu-igwe, ebe obibi gị dị nsọ, ebe ị nọ n’oche eze, jiri aebube, ugwu, ike, ụdị-eze, ume, ebe ọchịchị, ezi-okwu, ikpe-ziri ezi, mkpebi-ikpe, ebere, na uju agwụ-agwụ site na mgbe nile na-adigide ruo mgbe nile na-adigide.

78 O nụrụ, O nụrụ, O nụrụ olu anyị, O Onye-nwe! Ma zaa arịrịọ ndị a, na nara ido-nsọ nke ụlọ nke a enyefere gị, ọrụ nke aka anyị nile, nke anyị wuworo nye n’aha gị;

79 Na kwa nzukọ-nsọ nke a, iyikwasị ya aha nke gị. Na nyere anyị aka site n’ike nke Mụọ gị, ka anyị wee jikọ olu anyị nile na nke andị seraph na-acha ma na-amụkesi gburu-gburu oche-eze gị, jiri iti-mkpu nile nke ịja-mma, na-agụ Hosana dịrị Chineke na bNwa-atụrụ ahụ!

80 Na kwe ka ndị a, ndị gị ị etere manụ, bụrụ ndị aeyiwere uwe nzọpụta, na ka ndị nsọ gị tisie mkpu-ọn̄ụ ike. Amen na Amen.