Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 29


Nkeji 29

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, n’iru ndị okenye isii, na Fayette, New York, Septemba 1830 (History of the Church, 1:111–115). E nyere mkpughe a ụbọchị ole na ole tutu ọgbakọ nke bidoro na 26 Septemba 1830.

1–8, Kraịst kpọkọtara ndị ọ họpụtara; 9–11, Ọbịbịa ya na-anabata oge Jisus ga-abịa n’ụwa Chịa otu puku afọ; 12–13, Iri na Abụọ ahụ ga-ekpe ndị Israel nile ikpe; 14–21, Ihe iriba-ama nile, ajọọ-ahụhụ nile na ntogbo n’efu nile sitere n’ụnwu ga-abịa tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ; 22–28, Mbilite n’ọnwu nke ikpe azụ, na ikpe nke ikpeazụ sochịrị oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa otu puku afọ; 29–35, Ihe nile bụ nke mụọ nye Onye-nwe; 36–39, Ekwensu na usuu-ndị-agha ya nile ka achụpụrụ n’elu igwe ka ọ nwaa mmadụ; 40–45, Ọdịda na aja mgbaghara mmehie wetara nzọpụta; 46–50, Ụmụ-ntakịrị ka agbapụtara site n’Aja mgbaghara mmehie.

1 Gee nti n’olu nke Jisus Kraịst onye mgbapụta gị, Nnukwu aA bụ M ahụ, onye ogwe aka bebere ya cchuworo aja mgbaghara mmehie n’ihi mmehie unu nile;

2 Onye aga-akpọkọta ndị ya ọbụna dịka nnekwu-ọkụkọ na-achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ, ọbụna ka ha ra bụ ndị ga-anụrụ olu m ma dị bumeala n’iru m, ma kpọkuo m n’oke ekpere.

3 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na n’oge a a agbagharawo unu mmehie unu, ya mere unu na-anata ihe ndị a, kama cheta e mehiekwala ọzọ, ka ihe ndị jọkarịrị njọ ghara ịbịakwasị unu.

4 N’ezie, a si m unu na unu bụ ndị ahọrọ site n’ụwa nile ịkwusa ozi-ọma m n’olu an̄ụrị dịka olu nke aopi.

5 Welitenụ obi unu elu ma nurịa, n’ihi a nọ m an’etiti unu, ma a bụ m bonye nkwụchịta unu n’ebe Nna nọ; ma ọ dị Nna ezi mma inye unu cala-eze ya.

6 Ma, dịka e dere ya—Ihe ọbụla unu aga-arịọ bn’okwukwe, cjikọta onwe unu ọnụ n’ekepere dịka m nyere n’iwu, unu ga-anata.

7 Ma a kpọrọ unu ka eweta na mmezu amkpọkọta nke ndị nke m bahọpụtara; n’ihi na ndị nke m ahọpụtara cn’anụ olu m ma ha anaghi-eme ka dobi ha sie ike.

8 Ya mere iwu ọkụ ahụ esiwo na Nna pụọ na a aga-akpọkọta ha n’otu ebe n’elu ala nke a, ka bakwado obi ha nile ma kwado n’ihe nile maka ụbọchị mgbe cmkpagbu na ntogbo n’efu e ziipụrụ megide ajọọ mmadụ.

9 N’ihi na oge ahụ dịkwa nso ma ụbọchị ahụ nọ n’ọba aka mgbe ụwa chara; ma ndị ampakọ nile na ndị na-eme ihe-ọjọọ ga-adi ka bahịhịa kpọrọ-nkụ; ma a ga m cakpọcha ha ọkụ, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị-agha kwuru, ka ajọọ-omume ghara ịdị n’elu ụwa;

10 N’ihi na oge ahụ dị nso, ma nke ahụ nke ndị-ozi m akwuru garịrị emezu; n’ihi na dịka ha si kwuo otu a ka ọ ga-esi emezu;

11 N’ihi na a ga m egosi onwe m site n’elu-igwe jiri ike na nnukwu ebube, ya na ausuu nile nke ndị agha n’ebe ahụ, ma biri bn’ezi-omume ha na ndị mmadụ n’elu ụwa cotu puku afọ, ma ndị ajọọ-omume agaghị eguzo.

12 Ma ọzọ, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, ma ọ pụwo na iwu ọkụ siri ike, site n’uche nke Nna, na andị ozi nke m, na Iri na abụọ ahụ mụ na ha nọọrọ n’ije ozi m na Jerusalem, ga-eguzoro n’aka nri m n’ụbọchị nke ọbịbịa m bn’ogidi-ọkụ, bụrụ ndị egbokwasiworo uwe mwuda nke ezi-omume, na okpu-eze nile nọ n’isi ha nile, na cebube ọbụna dịka m, dikpe ụlọ nile nke Israel ikpe, ọbụna ka ha ra bụ ndị hụrụ m n’anya ma debekwa iwu-nsọ m nile, ma onweghị onye ọzọ.

13 N’ihi na aopi ga-ada ogologo oge ma dasikwa ike ọbụna dịka n’Ugwụ Saịnaị, ma ụwa nile ga-ama jijiji, ma ha bga-apụta kwa-e, ọbụna cndị nwụrụ anwụ ndị nwụrụ n’ime m; ị nara dokpu-eze nke ezi-omume, ka eyikwasị ha uwe, eọbụna dịka m, ka mụ na ha nọrọ ka anyị bụrụ otu.

14 Mana, lee, a sị m unu na tutu oke aụbọchị a abịa banyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ma ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, ma kpakpando nile ga-ada site n’elu-igwe, ma a ga enwe nnukwu cihe iriba-ama n’elu-igwe dị n’elu ma n’elu ala dị n’okpuru ya;

15 Ma a ga-enwe ịkwa-akwa na airi-uju n’etiti ọtụtụ igwe mmadụ;

16 Ma a ga-enwe nnukwu aaku-mmiri-igwe ezipụrụ ibibi akụkụ nile nke ubi nile nke ụwa.

17 Ma ọ ga-eru, site ajọọ omume nke uwa na m ga-enwe aịbọ ọbọ megide bajọọ mmadụ n’ihi ha agaghị echegharị; n’ihi na iko nke iwe nke m ejuwo; n’ihi na lee, cọbara m agaghị asacha ha ma ọbụrụ na ha egeghị m ntị.

18 Ya mere, mụ Onye-nwe Chineke ga-ezipu ijiji nile n’elu iru nke ụwa, nke ga-ejide ndị nile bi n’ime ya ma ga-eri anụ arụ ha, ma mee ka ikpuru bịakwa n’ime ha.

19 Ma ire ha nile ga-akwụsị ha agaghị aekwu megide m; ma arụ ha ga-adapụ site na ọkpụkpụ nile ha ma anya ha site na oghere ha nile;

20 Ma ọ ga-eru na ụmụ aanụ ọhịa na anụ ufe nke elu ga-erichapụ ha.

21 Ma nnukwu nzukọ aihe arụ, nke bụ bakwụnakwuna nke ụwa nile ka a ga-ebibi site n’ọkụ cna-erepịa, dịka onye-amụma Ezikiel kwuru n’ọnụ ya, onye kwuru maka ihe ndị a nile, ndị n’emezubeghi kama ọ dgarịrị, ebe mụ na adi ndụ, n’ihi na ihe arụ nile agaghị achị.

22 Ma ọzọ, n’ezie, n’ezie, a sị m unu na mgbe apuku afọ ahụ gasịrị, ma ndị mmadụ ebidokwa ị gọnarị Chineke ha, mgbe ahụ ka m ga-arapụ ụwa kama maka bnwa-obere oge;

23 Ma aọgwụgwụ ga-abịa, ma elu-igwe na ụwa ga-erepịa ma bgafee, ma a ga-enwe elu-igwe ọhụrụ na cụwa ọhụrụ.

24 N’ihi na ihe ochie nile aga-agabiga, ma ihe nile ga-aghọ ihe ọhụrụ, ọbụna elu-igwe na ụwa, na ihe nile n’uju ya, ma mmadụ na anụ ọhịa nile, anụ ufe nile nke ikuku, na azụ nile nke oke osimiri;

25 Ma ọbụghị otu aagịrị-isi ma-ọbụ irighiri, ga-efu n’ihi ọbụ ọrụ-aka nke aka m.

26 Mana, lee, n’ezie a sị m unu tutu ụwa a gafee, aMaikel, bonye-isi-mụọ-ozi m, ga-afụ copi ike ya, mgbe ahụ ka ndị nile nwụrụ anwụ dga-ebili, n’ihi na ili ha nile ga-emehecha, ma ha ega-apụta, ọbụna ha nile.

27 Ma andị ezi-omume ka a ga-akpọkọta bn’aka nri m nye ndụ ebighi-ebi, ma ndị ajọọ mmadụ n’aka ekpe m ka ọ ga-eme m ihere inwe n’iru Nna;

28 Ya mere a ga m a sị ha—aSi n’iru m pụọ, unu ndị abụrụ ọnụ, n’ime bọkụ mgbe nile na-adigide, akwadoro maka cekwensu na ndị mụọ ozi ya nile.

29 Ma ugbụ a, lee, a sị m unu, onweghị mgbe m kwupụtara site n’ọnụ nke m na ha ga-alaghachi, n’ihi na aebe m nọ ha onwe ha agaghị enwe-ike ịbịa, n’ihi ha enweghi ike.

30 Kama cheta na ikpe m nile abụghị nke mmadụ, ma dịka okwu ndị a siworo n’ọnụ m pụọ ọbụna otu a ka ha ga-emezu, ka andị bu ụzọ bụrụ ndị-ikpe-azụ, na kwa ndị ikpe-azụ ga-abụ ndị mbụ na ihe nile bụ ihe ọbụla m kesiworo site n’okwu nke ike m, nke bụ ike nke Mụọ m.

31 N’ihi site n’ike nke Mụọ m ka m akere ha; e, ihe nile ma bnke mụọ ma nke arụ—

32 Nke mbụ anke mụọ nke abụọ nke arụ, nke bụ mmalite nke ọrụ m, ma ọzọ, nke mbụ nke arụ ma nke abụọ nke mụọ, nke bụ ihe ikpe azụ nke ọrụ m.

33 Na-ekwuru unu okwu ka unu nwe ike ighọta ya n’ụdị okike unu, kama nye onwe m ọrụ m enweghi aọgwụgwụ, ma-ọbụ mmalite, kama e nyere unu ya ka unu nwe ike ịghọta, n’ihi unu arịọwo m ya ma nwekwa nkwekọrịta.

34 Ya mere, n’ezie a si m unu na ihe nile n’iru m bụ nke mụọ, ma onweghị ọge ọbụla m nyere gị iwu nke bụ nke arụ; ma-ọbụ mmadụ ọbụla, ma-ọbụ ụmụ nke ndị mmadụ, ma-ọbụ Adam, nna unu, onye m kere.

35 Lee, e nyere m ya ka ọbụrụ onye anwere onwe ya na mkpebi; ma e nyere ya iwu-nsọ, kama onweghị iwu-nsọ nke arụ nke e nyere ya, n’ihi na biwu-nsọ m nile bụ nke mụọ; ha adịghị n’udi okike ma-ọbụ nke ụwa nke a, ma-ọbụ nke anụ arụ ma-ọbụ otu osiri metụ ha.

36 Ma o wee ruo na Adam, mgbe ekwensu nwara ya—n’ihi na, lee, aekwensu dị tutu Adam, n’ihi na ọ bnupuru-isi megide m, na-asị, Nye m cnnukwu ugwu gị nke bụ dike m; ma kwa eotu ụzọ n’ụzọ atọ nke fusuu ndị agha nke elu-igwe ka ọ tụgharịrị megide m site na gnhọrọ ha;

37 Ma a chụdara ha n’ala, ma otu a ka aekwensu na bndị mụọ ozi ya si bịa;

38 Ma, lee, o nwere ebe akwadooro ha site na mmalite, ebe ahụ bụ aala-mụọ.

39 Ma ọdịrịrị mkpa na ekwensu aga-anwa ụmụ nke mmadụ, ma-ọbụ ha agaghị abụ ndị nwere onwe ha; n’ihi ọbụrụ na ha enweghi ihe bilu ha a gaghị enwe ihe ụtọ—

40 Ya mere, o wee ruo na mgbe ekwensu nwara Adam, na o riri mkpụrụ-osisi a sị aerila ma dahie iwu-nsọ ahụ site na nke a ya abịa bn’okpuru uche nke ekwensu, n’ihi na o merighị ọnwụnwa.

41 Ya mere, mụ Onye-nwe Chineke mere ka a achụpụ ya site na Ubi bIden, site n’iru m, n’ihi njehie ya, nke o sitere na ya bụrụ onye nwụrụ ọnwụ cnke mụọ, nke bụ ọnwụ nke mbụ; ọbụna otu ọnwụ ahụ nke bụ dọnwụ nke ikpe-azụ, nke bụ nke mụọ, nke a ga-akpọkwasị n’elu ajọọ onye mgbe m ga-asị: Pụọ, unu ndị eabụrụ ọnụ.

42 Kama, lee, a si m unu na mụ, Onye-nwe Chineke, nyere Adam na kwa mkpụrụ ya, ka ha ghara ainwụ-ọnwụ nke arụ, ruo mgbe mụ, Onye-nwe Chineke ga-ezipụ bndị mụọ-ozi ka ha kwusara ha cnchegharị na dmgbapụta, site na okwukwe n’aha nke eỌkpara m Mụrụ Nanị ya.

43 Ma otu a ka m mere, Onye-nwe Chineke, họpụtaara mmadụ ụbọchị nile nke amnwale ya—ka site n’ọnwụ nke arụ ya a bga-ekulite ya na canwụgh-anwụ ruo na dndụ ebighi-ebi, ọbụna ka ha ra bụ ndị kwere;

44 Ma ndị n’ekwenyeghị ruo na aọmụma ikpe ala-mụọ ebighi-ebi, n’ihi ha apụghị inwe mgbapụta site na ọdịda nke mụọ ha n’ihi ha e chegharịghị kwa;

45 N’ihi ha hụrụ ọchịchịrị n’anya karịa ìhè ma aomume ha nile bụ ihe ọjọọ, ma ha na-anata bụgwọ-ọrụ nke onye ha họọrọ ịrụbere isi.

46 Kama lee, a sị m unu na aụmụ-ntakịrị abụrụwo ndị bagbapụtara site na ntọ-ala nke ụwa site n’aka Ọkpara nke m amụrụ nanị ya;

47 Ya mere, ha enweghị-ike ime imehie, n’ihi e nyeghị Setan ike aịnwa ụmụ-ntakịrị, ọnwụnwa tutu ha amalite ịbịa bnwewa nkọwasị n’iru m;

48 N’ihi na e nyere ha ọbụna dịka m chọrọ, dịka inwe mmasị nke m, ka nnukwu ihe nile bụrụ nke a chọrọ n’aka andị nna ha.

49 Ma, ọzọ, a sị m unu, na onye ọbụla nke nwere amamihe enyeghị m ya iwu icheghari?

50 Ma onye na-enweghị anghọta, ọ fọdụrụ nime m ime dịka edeworo ya n’akwụkwọ. Ma ugbụ a anaghị m enye unu mkwupụta ọzọ n’ọge nke a. Amen.