Na mmalite nke oge otu puku afọ Jisus ga-abịa n’ụwa chịa eze, Kraịst ga alọghachi n’ụwa. Ihe omume a ga-abụ ihe iriba-ama nke ọgwụgwụ nke mnwale nke arụ na-anwụ anwụ nke ụwa nke a. A ga-ewepụ ndị ajọọ mmadụ site n’ụwa ma ndị ezi-omume ka a ga-ekulite n’ime igwe ojii mgbe a na-asacha ụwa. Ebe na-ọdịghị onye matara kpọm kwem mgbe Kraịst ga-abịa maka nke ugboro abụọ, o nyeworị anyị akara nile ilepụ-anya maka ha nke ga-egosi n’oge ahụ adịwala nso (Mat. 24 ; JS—Mat. 1 ).
A mawo m n’Onye-mgbapụta m ga-eguzo n’elu ala ahụ n’ụbọchị ikpeazụ, Job 19:25 .
Mụ onwe m ka ikpere nile ọbụla ga-egburu, mụ ka ire nile ọbụla ga-an̄ụrụ iyi, Aịsa. 45:23 (OznỌd. 88:104 ).
Ọkpara nke Mmadụ na-abịa n’igwe ojii nke elu-igwe, Dan. 7:13 (Mat. 26:64 ; Luk 21:25–28 ).
Ha ga-elegide kwa m anya bụ onye ha dụpuworo, Zek. 12:10 .
Otu onye ga-asị, gịnị bụ ntipụta ọnya ndị a n’etiti aka gị abụọ, Zek. 13:6 (OznỌd. 45:51 ).
Onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya? Ya onwe ya dịka ọkụ onye-nnụcha ihe, Mal. 3:2 (3 Nif. 24:2 ; OznỌd. 128:24 ).
Ọkpara nke Mmadụ gaje ịbịa n’ebube nke Nna ya, Mat. 16:27 (Mat. 25:31 ).
Ọdịghị onye ọbụla matara ụbọchị na oge awa ahụ, kama-ọbụ nanị Nna m matara, Mat. 24:36 (OznỌd. 49:7 ; JS—Mat. 1:38–48 ).
Jisus nke a kwa ga-abịa n’otu aka ahụ unu hụrụ ya ka ọ na-aga n’elu-igwe, Ọlndoz. 1:11 .
Onye-nwe n’onwe ya ga-esi n’elu-igwe rịdata, 1 Ndị-Tes. 4:16 .
Ụbọchị nke Onye-nwe ga-abịa dịka onye-ori n’ime abalị, 2 Pita 3:10 .
Onye-nwe na-abịa, ya na Ndị-nsọ ya dị puku iri nile, Jud 1:14 .
Ọ na-abịa ya na igwe ojii; anya nile ọbụla ga-ahuzu kwa ya, Mkpu. 1:7 .
Kwadobe nụ, kwadobe nụ, n’ihi n’Onye-nwe dị nso, OznỌd. 1:12 .
Aga m ekpughe onwe m site n’elu-igwe jiri ike ma biri n’elu ụwa otu puku afọ, OznỌd. 29:9–12 .
Welite olu gị elu ma tie mkpu nchegharị, na-edozi ụzọ nke Onye-nwe maka ọbịbịa ya nke ugboro abụọ, OznỌd. 34:5–12 .
Abụ m Jisus Kraịst, aga m abịakwa na mberede na temple m, OznỌd. 36:8 (OznỌd. 133:2 ).
Ụbọchị ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ na i ga-ahụ m ma mara na A Bụ M, OznỌd. 38:8 .
Onye na-atụ m egwu ga na-elepụ anya maka ihe iriba-ama nile nke ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ, OznỌd. 45:39 .
Iru nke Onye-nwe ka a ga-ekpughepụ, OznỌd. 88:95 .
Nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onye-nwe dị nso, OznỌd. 110:16 .
Mgbe Onye-nzọpụta ahụ ga-apụta ihe anyị ga-ahụ ya otu ọdị, OznỌd. 130:1 .
Onye nzọpụta ga-eguzo n’etiti ndị nke ya, ọ ga-achịkwa-eze, OznỌd. 133:25 .
Onye bụ nke a na-esi na Chineke na-arịdata yi uwe nile e tejiri eteji, OznỌd. 133:46 (Aịsa. 63:1 ).