Ime ka a dị nwayọọ ma kwe inata nkuzi, ma-ọbụ ọnọdụ nke ị dị nwayọọ ma-ọbụ inata nkuzi. Ịdị umeala gụnyere imata ndabere anyị na Chineke na nwee agụụ inye onwe anyị n’okpuru uche-obi ya.
Chineke mere gị ka i jee ịrị afọ anọ n’ọzara ka O wee mee gị umeala, Deut. 8:2 .
Emere m mkpụrụ obi m umeala site n’obubu-ọnụ, Abụọma 35:13 .
Ọ ka mma bụ nwata nke bụ ogbenye ma maara ihe, karịa eze nke bụ okenye na Onye nzuzu, Ekl. 4:13 .
Onye-nwe na-ebinyere onye dị umeala, Aịsa. 57:15 .
Onye ọbụla ga-eme onwe ya umeala dịka nwantakịrị, onye ahụ dịkarịrị ukwuu na ala-eze elu-igwe, Mat. 18:4 .
Onye ọbụla nke ga-eme onwe ya umeala a ga-eweli ya, Mat. 23:12 (Luk 14:11 ; 18:14 ).
Jisus mere onwe ya umeala ma rubere isi ruo n’onwu, Ndị-Fil. 2:8 (Luk 22:42 ; 23:46 ).
Chineke na-edo onwe ya megide ndị mpako, ma na-enye ndị dị ume ala n’obi amara, 1 Pita 5:5–6 (2 Nif. 9:42 ).
Idi umeala bụ otu ntozu-oke maka baptism, OznỌd. 20:37 .
Mee onwe unu umeala n’iru m ma unu ga-ahụ ma mata na A Bụ M, OznỌd. 67:10 .
Ka Ị dịrị umeala, ma Onye-nwe ga-enye gị ọzịza nke ekpere gị nile, OznỌd. 112:10 .
Ka onye ahụ nke na-amaghị ihe mụta amamihe site na-ime onwe ya umeala, OznỌd. 136:32 .
Mụọ ahụ ka e zipuworo inye ndị di umeala ìhè, OznỌd. 136:33 .