Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Timọti, Akwụkwọ-ozi e degaara


Timọti, Akwụkwọ-ozi e degaara

Akwụkwọ abụọ dị n’ime Testament Ọhụrụ. Ha abụọ bụụrụ n’izizi leta nile nke Pọl degaara Timọti.

1 Timọti

Pọl dere akwụkwọ-ozi ahụ nke mbụ mgbe a tụsịrị ya mkpọrọ nke mbụ. Ọ hapụrụrịị Timọti n’Efesọs, na-ezube ịlọghachi ma e mesịa (1 Tim. 3:14). Otu o sila dị Pọl nwere mmetụ na e nwere ike igbu ya oge, nke a mere o ji deere Timọti akwụkwọ, eleghị-anya site na Masedonịa (1 Tim. 1:3), iji nye ya ndụmọdụ na agbam-ume n’ime-jupụta ọrụ ya.

Isi nke 1 mbụ nwere ekele nke Pọl na kwa nkụzi ya nile banyere nkata nzuzu nile ndị a na-ewebata n’ime Nzukọ-nsọ. Isi nile nke 2–3 na-enye nduzi-ụzọ banyere ofufe na mbara na banyere ịkpa-àgwà na omume nke ndị-ozizi nke ozi-ọma. Isi nile nke 4–5 nwere otu nkọwa nke ọma nke ngọnarị okwukwe ụbọchị-ikpeazụ na ndụmọdụ e nyere Timọti n’otu ọ ga-esi kwusaa ozi-ọma nye ndị ahụ ọ na-edu. Isi nke 6 bụ otu agbam-ume igosi ikwesị ntụkwasị obi na izere akụ na ụba nile nke ụwa.

2 Timọti

Pọl dere leta nke abụọ n’ime oge ọ nọ na mkpọrọ nke ugboro abụọ, obere oge tutu e gbuo ya n’ihi okwukwe ya. O nwere okwu nile nke ikpeazụ nke Onye-ozi ahụ na-egosi kwa ịdị ebube nke agbam-ume na ntụkwasị-obi nke o jiri nagide ọnwụ.

Isi nke 1 nwere ekele nke Pọl na iwu nye Timọti. Isi nile nke 2–3 na-enye ọtụtụ ịdọ aka na ntị dị iche iche na nduzi ụzọ nile, tinyere otu ịma-aka n’iru iche ihe egwu nile na-abịa iru. Isi nke 4 bụ otu ozi nye ndị enyi Pọl, nke nwere ndụmọdụ banyere otu e si e lebara ndị na-agọnarị okwukwe anya.