Egwu nwere ike inwe mpụtara abụọ: (1) Ịtụ Chineke egwu bụ inwe nsọpụrụ na ụjọ nye ya na irubere iwu-nsọ ya nile isi; (2) Ịtụ-mmadụ egwu, ihe egwu nke arụ na-anwụ anwụ, mgbu, na ihe ọjọọ bụ ịtụ-egwu ụdị ihe ndị ahụ nile na itu ha oke egwu.
N’ezie ọdịghị egwu Chineke dị n’ebe a, Jen. 20:11 .
Onye-nwe Chineke gị ka ị ga-atụ egwu, Deut. 6:13 (Josh. 24:14 ; 1 Sam. 12:24 ).
Were nụ egwu fee Onye-nwe ofufe, Abụọma 2:11 .
Itụ-egwu Onye-nwe bụ mmalite amamihe, Abụọma 111:10 .
Tụọ egwu Onye-nwe, wee si n’ihe ọjọọ wezuga onwe gị, Ilu 3:7 .
Ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma, Ekl. 8:12 .
Were nụ itu-egwu na ima jijiji rụpụtara onwe unu nzọpụta nke onwe unu, Ndị-Fil. 2:12 .
Tụọ nụ egwu Chineke, ma nye ya otuto, Mkpu. 14:7 (OznỌd. 88:104 ).
Ndị amụma na-akpalite ndị mmadụ ahụ na-esepụghị aka ka e debe ha n’ịtụ-egwu nke Onye-nwe, Inọs 1:23 .
Alma na ụmụ ndịkom nke Mosaịa dara n’ala, n’ihi na egwu nke Onye-nwe bịakwasịrị ha, Alma 36:7 .
Rụpụta nzọpụta nke unu jiri egwu na ịma jijiji, Mọm. 9:27 .
Ha bụ ndị na-adịghị atụ m egwu, ọbụ ha ka m ga-enye nsogbu ma mee ka ha maa jijiji, OznỌd. 10:56 .
Onye na-atụ m egwu ga-na-elepụ anya n’ihi ihe iriba-ama nile nke ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ, OznỌd. 45:39 .
Atụla-egwu n’ihi na mụ na gị nọ, Jen. 26:24 (Aịsa. 41:10 ).
Onye-nwe nọ nyeere anyị, unu atụla-egwu ha, Ọnọgụ. 14:9 .
A tụla-egwu; n’ihi na ndị anyị na ha nọ di ọtụtụ karịa, 2 Ndez. 6:16 .
Agaghị m atụ-egwu ihe anụ arụ ga-eme, Abụọma 56:4 .
Unu atụla-egwu ita-ụta mmadụ, Aịsa. 51:7 (2 Nif. 8:7 ).
Chineke enyeghị anyị mụọ nke ụjọ, 2 Tim. 1:7 .
Ihụn, anya nke zuru-oke na-achụpụ egwu n’ezi, 1 Jọn 4:18 (Moro. 8:16 ).
Ụmụ ndịkom nke Hilaman atụghị-egwu ọnwụ, Alma 56:46–48 .
Ịtụ-egwu nke ọnwụ jupụtara obi nile nke ndị ajọọ omume, Mọm. 6:7 .
Atụla-egwu ihe mmadụ pụrụ ime, Moro. 8:16 .