Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọdịda nke Adam na Iv


Ọdịda nke Adam na Iv

Usoro nke mmadụ siri bụrụ arụ na-anwụ anwụ n’elu ụwa nke a. Mgbe Adam na Iv riri mkpụrụ-osisi a sị erila, ha wee bụrụ arụ na-anwụ anwụ, nke bụ, ha abịa n’ọnọdụ mmehie na ọnwụ imegide ha. Adam wee bụrụ “anụ arụ nke mbụ” n’elu ụwa (Moses 3:7). Mkpughe nke ụbọchị ikpe-azụ a na-eme ka ọ pụta ìhè na ọdịda ahụ bụ ngọzi na kwa Adam na Iv kwesịrị ka enye ha nnukwu ugwu dịka nne na nna nke mbụ nke mmadụ nile.

Ọdịda ahụ bụụrụ nzọnye ụkwụ dị mkpa na oga-n’iru nke mmadụ. N’ihi na Chineke matara na Ọdịda ahụ ga-adị, ọ tụworị atụmatụ na ndụ tutu e nwee anụ arụ maka Onye-nzọpụta. Jisus Kraịst bịara n’etiti oge a kara-aka ịchụ aja mgbaghara mmehie maka ọdịda nke Adam na kwa maka mmehie nke mmadụ n’onwe ya n’ọnọdụ nchegharị site na mmehie nke mmadụ.