Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ime ka a mata


Ime ka a mata

Nduzi gaa na Akwụkwọ-nsọ nile na-akọwa ozizi nile a họrọ-ahọ, ụkpụrụ nile, ndị mmadụ, na ebe nile a chọtara n’ime Bible Nsọ, Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa. Ọ na-enyekwa gị ntụnyere nke akwụkwọ-nsọ nile dị mkpa ka ị mụọ maka isi-ọkwu ọbụla. Nduzi ahụ nwere ike nyere gị aka na-ọmụmụ ihe gị onwe gị na ezi na ụlọ nke akwụkwọ-nsọ nile. O nwere ike nyere gị aka ịza ajụjụ nile gbasara ozi-ọma ahụ, ịmụ isi-ọkwu nile dị n’ime akwụkwọ-nsọ nile, ịkwadobe okwu chukwu nile na ihe-ọmụmụ nile, na mụbaa mmata ihe gị na Testament nke ozi-ọma ahụ.

Nduzi ahụ nwere nkeji atọ: (1) Ndepụta n’usoro a bịị dịị nke isi-ọkwu nile (2) Nhọta nile sitere na ntụgharị asụsụ nke Bible nke Joseph Smith mere (3) Akụkọ Nzukọ-nsọ n’usoro oge na ebe nile na ihe-omume nile, map nile, na foto nile; na map nile nke Bible na foto nile.

  1. Ndepụta n’usoro a bịị dịị nke isi-ọkwu nile. Nkeji nke a na-enye mkpirisi nkọwa nke isi-ọkwu ọbụla na depụta ntụnyere nke akwụkwọ-nsọ nile dịkachasị mkpa banyere isi-ọkwu nke ahụ. Mkpirisi nụomi ma-ọbụ nchịkọta okwu nke akwụkwọ-nsọ na-ebu ntụnyere ọbụla ụzọ. Ntụnye nke akwụkwọ-nsọ ahụ na-apụta ìhè n’usoro nke a na-eso: Testament Ochie, Testament Ọhụrụ, Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa.

  2. Nhọta nile sitere na ntụgharị asụsụ nke Bible nke Joseph Smith mere. N’afọ 1830, Onye-nwe nyere Onye-amụma Joseph Smith ntụzi-aka ka ọ malite ọrụ na ngụgharị ma-ọbụ ntụgharị-asụsụ nke Ntụgharị-asụsụ nke Eze Jemes nke Bible ahụ. Nzube nke Onye-amụma ahụ bụ iweghachi ụfọdụ n’ime ezi-okwu dị mfe nghọta na oke mkpa ndị fuworọrị site na mbipụta nke Bible izizi. Ọ rụchara nke kachasị n’ọrụ ahụ na Julaị 1833. Otu o-sila-dị, tutu ọnwụ ya n’afọ 1844, ọ gara n’iru na-eme mgbanwetụ nile ebe o na-akwadobe ndepụta ahụ maka mbipụta. Na-agbanyeghị na ukwu akwụkwọ ahụ dum bụ nke na-emezuchaghị, ma-ọbụghịkwanụ na Nzukọ-nsọ anabatawo ya n’usoro, Ntugharị asụsụ Joseph Smith ahụ nwere ọtụtụ nleba-anya n’ime mpụtara nile nke akwụkwọ-nsọ nile na bụrụ enyem-aka bara uru maka ịghọta Bible. Ụfọdụ n’ime ngụgharị nile dị mkpa karịa ka e tinyere nime Nduzi gaa na Akwụkwọ-nsọ nile. (Maka inweta ozi karịa, hụ isi-ọkwu ahụ “Ntụgharị Asụsụ nke Joseph Smith [NAJS]” n’ime Nduzi ahụ.)

    Nzụkọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a na-eji Ntụgharị-asụsụ Eze Jemes nke Bible dịka ntụgharị asụsụ bekee a nabatara n’usoro. Ọ rụrụ ọrụ dị mkpa na mweghachi nke ozi-ọma na na-aga n’iru na-inwe ike na-esi n’ime arụ-ọrụ pụtara ìhè n’ọtụtụ mba nile gazuo ụwa.

  3. Akụkọ Nzukọ-nsọ n’usoro oge, na ebe nile, na ihe-omume nile, map nile, na foto nile na map nile nke Bible na foto nile. Site na-imara ọmụmụ ala nile na omume ya bụ ala ndị a tụlere n’ime akwụkwọ-nsọ nile, i nwere ike ghọta ihe omume nile nke akwụkwọ-nsọ nke ọma karịa. Nduzi ahụ gụnyere map 6 nke ebe nile dị mkpa n’akụkọ Nzukọ. Map 14 nke ala nile nke Bible na 1 map nke ụwa. Ị chọta otu ebe, ọbụla lee anya na ebe e depụtara usoro map nile nke inwere mmasị na ya. Ebe ndepụta ahụ ga atụrụ gị aka na map nke kwesịrị ekwesị na ntụnye nile nke ebe ahụ na map ahụ. Akụkọ Nzukọ-nsọ 18 ahụ na foto nile nke Bible nwekwara nkọwa nke ọma nke ga-enyere gị aka ịghọta nke ọma karịa ụfọdụ ihe omume nke akwụkwọ-nsọ nile.

    Akụkọ Nzukọ-nsọ usoro oge, na ebe nile, na ihe omume nile depụtara ụbọchị nile nke ihe omume nile dị mkpa nye mweghachi ahụ na ùtó nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.

Ị ga nirụ na inyere gị aka n’ọmụmụ ihe gị nke akwụkwọ-nsọ, Nduzi ahụ nwere ọtụtụ ihe enyem-aka ndị ọzọ. Iji maa-atụ, ọ bụrụ na ị tụgharịa gaa na ndeba ahụ “Jisus Kraịst,” ị ga-achọta ndepụta nile zuru oke nke isi-ọkwu ọbụla dị n’ime Nduzi ahụ nke na-enye ozi metụtara kpọm kwem Onye-nzọpụta ahụ na ije-ozị ya. Nke a bụ nanị isi-ọkwu dị n’ime Nduzi ahụ nke nwere ndepụta di ogologo otu ahụ, nke na-ekwusi ike ịdị mkpa nke Kraịst nye mmadụ nile. Tinyekwara ya, n’okpuru isi-ọkwu ahụ “Usoro oge na ebe nile na ihe-omume nile” ụfọdụ n’ime ihe omume ndị kachasị ịdị mkpa n’oge nile nke Bible na Akwụkwọ nke Mọmọn ka e depụtara na oge nile dịka oge ha jiri mee.Isi-ọkwu ahụ “Ozi-ọma nile” gụnyere nkwekọrịta nke Ozi-ọma nile. Nkwekọrịta nke a na-atule ihe dị-iche na nkụzi nile nke Onye-nzọpụta dịka a chọtara n’ime Matiu, Mak, Luk, Jọn na mkpughe ụbọchị-ikpeazụ.