Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Abraham


Abraham

Nwa-nwoke nke Tira, amụrụ na Ua nke ndị Kaldịa (Jen. 11:26, 31; 17:5). Onye-amụma nke Onye-nwe nke ya na Onye-nwe mere ọgbụgba-ndụ nile ebighi-ebi, nke esitere na ya gọzie mba nile nke ụwa. Aha akpọbuuru Abraham bụ Abram.

Akwụkwọ nke Abraham

Akụkọ ndekọta nile agba ochie nke Abraham dere nke batara n’aka nke Nzukọ-Nsọ na 1835. Akụkọ ndekọta ahụ nile na ụfọdụ anụ arụ ndị mmadụ e chekpọrọ echekpọ ka Antonio Lebolo chọpụtara na Ijipt n’ime ili nile dị n’okpuru ala, onye jiri mmasị ya mgbe ọ nwụrụ nye ya Michael Chandler. Chandler gosipụtara ha na United States n’afọ 1835. Ụfọdụ ndị enyi Joseph Smith zụtara ha site n’aka Chandler ma nye ha Onye-amụma, onye tụgharịrị asụsụ ha. Ụfọdụ n’ime akụkọ ndekọta ndị a ka a ga-achọta n’ime Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa.

Isi nke 1 dekọtara ihe nile Abraham gabigara na Ua nke ndị Kaldia, ebe ndị ajọ nchụ-aja gbara mbọ iji ya chụọ aja. Isi nke 2 na-ekwu maka ije njem ya gaa n’obodo Kenean. Onye-nwe pụtara ìhè nye ya ma ya na ya e mee ọgbụgba-ndụ. Isi nke 3 dekọtara na Abraham hụrụ ụwa nile na mara maka mmekọrịta nile dị n’etiti ihe nile nke elu-igwe. Isi nile nke 4–5 bụ nkọwasị nke okike.

Mkpụrụ nke Abraham

Ndị mmadụ ndị sitere na nrube isi nye iwu nile na emume-nsọ nile nke ozi-ọma nke Jisus Kraịst, nweta nkwa ahụ nile n’ọgbụgba-ndụ nile Chineke mere nye Abraham. Ndịkom na ndịnyom nwere ike inweta ngọzi ndị a nile ma ọbụrụ na ha bụ ezie ndị si n’agbụrụ Abraham ma-ọbụ na ha bụ ndị e doro ka ụmụ n’ime ezi na ụlọ site na imakụ ozi-ọma na bụrụ ndị e mere baptism (Ndị-Gal. 3:26–29; 4:1–7; OznỌd. 84:33–34; 103:17; 132:30–32; Abr. 2:9–11). Ngọzi nile nke ndị si n’agbụrụ Abraham n’ezie nwere ike ifunarị ha site na-erubeghị-isi (Ndị-Rom 4:13; 9:6–8).