Akwụkwọ nsọ
Abraham 4


Isi 4

Chi nile ahụ a tụọ atụmatụ okike nke ụwa na ndụ nile dị n’elu ya—Atụmatụ ha nile maka ụbọchị isii nke okike ka e zipụtara.

1 Na mgbe ahụ Onye-nwe wee sị: Ngwa k’anyị gbada nụ. Na ha wee gbadata na ammalite, na ha, ya bụ Chi nile ahụ, wee bhazie na kpụọ elu-igwe nile na ụwa.

2 Na ụwa mgbe a kpụsịrị ya gheere oghe na tọgbọrọ n’efu, n’ihi na ha akpụbeghị ihe ọbụla ma ọbụghị ụwa; na ọchịchịrị chịrị-eze n’elu iru nke ebe ahụ miri emi, na Mụọ nke Chi nile wee ana-erugharị n’elu iru mmiri nile ahụ.

3 Na ha (Chi nile ahụ) wee sị: Ka ìhè dị; na ìhè wee dị.

4 Na ha (Chi nile ahụ) wee hụ, ghọta ìhè ahụ nke ọma, n’ihi na ọ na-amuke; na ha wee kewaa ìhè ahụ, ma-ọbụ kpaa oke n’etiti ya, site n’ọchịchịrị.

5 Na Chi nile ahụ wee kpọọ ìhè ahụ Ehihie, na ọchịchịrị ahụ ka ha kpọrọ Abalị. Na o wee ruo na site na mgbede ruo ụtụtụ ka ha kpọrọ abalị; na site n’ụtụtụ ruo mgbede ka ha kpọrọ ehihie; na nke a bụụrụ nke mbụ, ma-ọbụ mmalite ahụ, nke ihe ahụ ha kpọrọ ehihie na abalị.

6 Na Chi nile ahụ wee sị kwa: Ka ambara dị n’etiti mmiri nile, na ọ ga-ekewa mmiri nile site na mmiri nile.

7 Na Chi nile ahụ wee nye mbara ahụ iwu, ka ọ kpaa oke n’etiti mmiri nile ahụ nke dị n’okpuru mbara ahụ site na mmiri nile nke dị n’elu mbara ahụ, na o wee dị otu ahụ, ọbụna dịka ha nyere n’iwu.

8 Na Chi nile ahụ wee kpọọ mbara ahụ, aElu-igwe. Na o wee ruo na ọ bụụrụ site na mgbede ruo ụtụtụ ka ha kpọrọ abalị; na o wee ruo na ọ bụụrụ site n’ụtụtụ ruo mgbede ka ha kpọrọ ehihie; na nke a wee bụrụ boge nke abụọ nke ha kpọrọ abalị na ehihie.

9 Na Chi nile ahụ wee nye iwu, na-asị: Ka ammiri ahụ nile nọ n’okpuru elu-igwe chịkọta bn’otu ebe, na ka ala kpọrọ nkụ si n’ime mmiri ahụ pụta; o wee dịkwa otu ahụ dịka ha nyere n’iwu;

10 Na Chi nile ahụ wee kpọọ ala ahụ kpọrọ nku ụwa; na nchịkọta nke mmiri nile ahụ, ka ha kpọrọ, aNnukwu Mmiri nile; na Chi nile ahụ wee hụ na e rubeere ha isi.

11 Na Chi nile ahụ wee sị: Ka anyị kwadobe ala iwepụta aahịhịa; ihe ọkụkụ na-amịta mkpụrụ ọghịgha; osisi na-amị mkpụrụ na-amịta mkpụrụ, n’ụdị nke ya, nke mkpụrụ nke ya, n’onwe ya na-amịta mkpụrụ na oyiyi nke ya n’elu ala ahụ; o wee dịkwa otu ahụ, ọbụna dịka ha nyeworo n’iwu.

12 Na Chi nile ahụ wee hazie ụwa iwepụta ahịhịa site na mkpụrụ nke onwe ya, na ihe ọkụkụ iwepụta ihe ọkụkụ site na mkpụrụ nke onwe ya, na-amịta mkpuru n’ụdị nke ya; na ka ala wepụta osisi site na mkpụrụ nke onwe ya, na-amịta mkpụrụ nke mkpụrụ ya nwere ike iwepụta nanị ụdị mkpụrụ ahụ n’ime onwe ya, n’ụdị nke ya; na Chi nile ahụ wee hụ na e rubeere ha isi.

13 Na o wee ruo na ha nyere ọnụ-ọgụgụ ụbọchị nile ahụ; site mgbede ruo n’ụtụtụ ka ha kpọrọ abalị; na o wee ruo, site ụtụtụ ruo mgbede ha kpọrọ ehihie; na ọ bụụrụ oge nke atọ.

14 Na Chi nile ahụ wee hazie aìhè nile dị na mbara nke elu-igwe, na wee mee ka ha kpaa oke ehihie site na abalị na wee hazie ha ị bụ ihe iriba-ama nile na maka oge nile, na maka ụbọchị nile na maka afọ nile;

15 Na wee hazie ha ịbụ maka ìhè nile n’ime mbara nke elu-igwe inye ìhè n’elu ụwa; na o wee dị otu ahụ.

16 Na Chi nile ahụ wee hazie nnukwu ìhè abụọ ahụ, ìhè nke aka ukwuu ịchị ehihie ahụ, na ìhè nke ka nta ịchị abalị; tinyere ìhè nke ka nta ha debekwara kpakpando nile.

17 Na Chi nile ahụ wee debe ha n’ịme mbara nke elu-igwe nile ahụ, inye ìhè n’elu ụwa, na ịchị n’ehihie na n’abalị, na ime ka ịkpa-ókè dịrị n’ìhè site n’ọchịchịrị ahụ.

18 Na Chi nile ahụ wee chee ihe ndị ahụ nile nche bụ ndị nke ha nyeworo iwu ruo mgbe ha rubere isi.

19 Na o wee ruo na ọ bụụrụ site na mgbede ruo ụtụtụ na ọ bụụrụ abalị; na o wee ruo na ọ bụụrụ site ụtụtụ ruo mgbede na ọ bụụrụ ehihie; na o wee bụrụ oge nke anọ.

20 Na Chi nile ahụ wee sị: Ka anyị kwadobe mmiri nile ahụ iwepụta ebe ọ dị ukwuu ihe nile na-akpagharị akpagharị nke na-enwe ndụ na anụ-ufe, ka ha nwee ike na-efegharị n’elu ụwa n’ime mbara ahụ ghere oghe nke elu-igwe.

21 Na Chi nile ahụ wee kwadobe mmiri nile ahụ ka ha nwee ike wepụta nnukwu aogologo anụ ukwu nile, na anụ nile dị ndụ na-akpagharị akpagharị, nke mmiri ahụ nile ga-ewepụta n’ebe ọ dị ukwuu n’ụdị nke ha. Na Chi nile ahụ wee hụ na a ga-erubere ha isi, na n’atụmatụ ha dị mma.

22 Na Chi nile ahụ wee sị: Anyị ga-agọzi ha, na mee ha ka ha mịta mkpụrụ na baa ụba, na jupụta mmiri nile n’ime oke osimiri nile ma-ọbụ annukwu mmiri nile, na mee ka anụ-ufe baa ụba n’ime ụwa.

23 Na o wee ruo na ọ bụụrụ site na mgbede ruo ụtụtụ nke ha kpọrọ abalị; na o wee ruo na ọ bụụrụ site ụtụtụ ruo mgbede nke ha kpọrọ ehihie; na o wee bụrụ oge nke ise.

24 Na aChi nile ahụ wee kwadobe ụwa iwepụta anụ dị ndụ n’ụdị nke ya, anụ-ụlọ na ihe nile na-akpụ akpụ, na anụ ọhịa nile nke ụwa n’ụdị nke ha; na o wee dịrị otu ahụ, dịka ha kwuru.

25 Na Chi nile ahụ wee hazie ụwa iwepụta anụ ọhịa nile n’ụdị nke ha, na anụ-ụlọ n’ụdị nke ha, na ihe nile na-akpụ akpụ n’elu ala n’ụdị nke ya: na Chi nile ahụ wee hụ na ha ga-erube isi.

26 Na Chi nile ahụ wee nwee aatụmatụ n’etiti onwe ha na wee sị: Ka anyị gbada na wee bkpụọ mmadụ cn’onyinyo anyị, n’oyiyi nke anyị; na anyị ga-enye ha ike ọchịchị n’elu azụ nke oke osimiri, na n’elu anụ-ufe nke ikuku, na n’elu anụ-ụlọ, na n’elu ụwa dum, na n’elu ihe dum na-akpụ akpụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.

27 Si otu a aChi nile ahụ wee gbada ịhazi mmadụ n’onyinyo nke ha, n’onyinyo nke Chi nile ahụ ha ịkpụ ya, nwoke na nwanyị ka ha wee kpụọ ha.

28 Na Chi nile ahụ wee sị: Anyị ga-agọzi ha. Na Chi nile ahụ wee sị: Anyị ga-eme ka ha mịta mkpụrụ na baa ụba, na jupụta ụwa, na buda ya n’okpuru ha, na inwe ike ọchịchị n’arụ azụ nke oke osimiri, na n’arụ anụ-ufe nke ikuku, na n’arụ ihe dum dị ndụ nke na-akpagharị n’elu ụwa.

29 Na Chi nile ahụ wee sị: Lee, anyị ga-enye ha ihe ọkụkụ dum na-amịta mkpụrụ ọghịgha nke ga-abịa n’elu iru nke ụwa nile, na osisi ọbụla nke ga-enwe mkpụrụ osisi n’elu ya, e, mkpụrụ nke osisi na-amịta mkpụrụ ọghịgha ha ka anyị ga-enye ya; ọ ga-abụrụ ha aihe oriri.

30 Na nye anụ ọhịa ọbụla nke ụwa, na nye anụ ufe ọbụla nke ikuku, na nye ihe ọbụla na-akpụ akpụ n’elu ala, lee, anyị ga-enye ha ndụ, na kwa anyị ga-enye ha ihe ọkụkụ ọbụla nwere akwụkwọ ndụ maka ihe oriri, na ihe ndị a nile ka a ga-esi otu a hazie.

31 Na Chi nile ahụ wee sị: Anyị ga-eme ihe nile nke anyị kwuworo, na ga-ahazi ha; na lee ha ga-erube isi nke ọma. Na o wee ruo na ọ bụụrụ site na mgbede ruo ụtụtụ ka ha kpọrọ abalị, na o wee ruo na ọ bụụrụ site ụtụtụ ruo mgbede ka ha kpọrọ ehihie; na ha wee gụta oge anke isii.