Akwụkwọ nsọ
Abraham 5


Isi 5

Chi nile ahụ emesịa atụmatụ ha nke okike nke ihe nile—Ha eweta na mmezu okike ahụ dịka atụmatụ ha siri dị—Adam nyere ihe nile dị ndụ e kere eke aha.

1 Na si otua anyị ga-emesị elu-igwe nile na ụwa, na usuu ha nile.

2 Na Chi nile ahụ we sị n’etiti onwe ha: N’oge anke asaa anyị ga-akwụsị ọrụ anyị, nke anyị nweworo atụmatụ; anyị ga-ezukwa ike n’oge nke asaa site n’ọrụ anyị dum nke anyị nweworo atụmatụ ime.

3 Na Chi nile ahụ wee rụsịa n’elu oge nke asaa ahụ, n’ihi n’oge nke asaa ahụ ha ga-aezu ike site n’ọrụ ha nile nke ha (Chi nile ahụ) nweworo atụmatụ n’etiti onwe ha ịkpụ; na bdoo ya nsọ. Na otu ahụ ka mkpebi ha nile dịịrị n’oge ahụ nke ha nweworo atụmatụ n’etiti onwe ha ịkpụ elu-igwe nile na ụwa ahụ.

4 Na Chi nile ahụ wee gbadata na kpụọ ndị a dum bụ ọgbọ nile nke elu-igwe nile na nke ụwa, mgbe a kpụworo ha n’ụbọchị ahụ nke Chi nile ahụ kpụworo ụwa na elu-igwe nile.

5 Dịka ihe dum nke ha kwuworo gbasara ahịhịa ọbụla nke ọhịa atutu ya adịrị n’ụwa, na ihe ọkụkụ ọbụla nke ọhịa tutu ya etoo; n’ihi na Chi nile ahụ emebeghi ka mmiri zoo n’elu ụwa mgbe ha nweworo atụmatụ ime ha, na kpụbeghị mmadụ ga-akọ ala ahụ.

6 Mana igirigi siri n’ala kwụgo n’elu, na wee wụsa mmiri n’elu iru nke ala ahụ.

7 Na aChi nile ahụ wee kpụọ mmadụ site bn’uzuzu nke ala ahụ, na wee were cmụọ ya (nke bụ mụọ nke mmadụ), na tinye ya n’ime mmadụ ahụ; na kụnye ume n’ọghere imi ya ume nke ndụ, na mmadụ wee ghọọ dmkpụrụ-obi dị ndụ.

8 Na Chi nile ahụ wee kụọ otu ubi a gbara ogige, na mpaghara ọwụwa anyanwụ an’ Iden, na n’ebe ahụ ka ha tinyere nwoke ahụ, onye ha tinyeworo mụọ ya n’ime arụ ahụ nke ha kpụworo.

9 Na site n’ala ka Chi nile ahụ meworo ka osisi ọbụla too nke dị mma ile anya na dị mma maka ihe oriri; aosisi nke ndụ, dịkwa n’etiti ubi ahụ, na osisi nke ịmara ihe ọma na ihe ojọọ.

10 O nweere osimiri sitere n’Iden na-agbapụta, ịwụsa mmiri n’ubi ahụ, na site n’ebe ahụ ka e kewasịrị ha na ịghọ isi mmiri anọ.

11 Na Chi nile ahụ wee kpọrọ mmadụ ahụ na tinye ya n’ime Ubi nke Iden ahụ, ịkọ ya na idebe ya.

12 Na Chi nile ahụ wee nye mmadụ ahụ iwu na-asị: Site n’osisi ọbụla nke ubi ahụ ka i nwere onwe gị iri-eri.

13 Mana site n’osisi ahụ nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila ya; n’ihi n’oge ahụ ị ga-eri site na ya, ị ghaghị ịnwụ ọnwụ n’ezie. Ugbua mụ, Abraham, wee hụ na ọ bụụrụ n’ụdị aoge ahụ nke Onye-nwe, nke bụụrụ n’ụdị oge ahụ nke bKolab; n’ihi na ruo n’oge ahụ Chi nile ahụ e nyebeghị Adam ngụkọ oge nke ya.

14 Na Chi nile ahụ wee sị: Ka anyị mee onye inye-aka kwesịrị mmadụ ahụ, n’ihi na o zịghi-ezi na mmadụ ahụ ga-anọdụ nanị ya, ya mere anyị ga-akpụ onye inye-aka kwesịrị ya.

15 Na Chi nile ahụ mere ka ụra miri-emi dakwasị aAdam; na o wee rahụ ụra, na ha wee were otu n’ime ọgịrịga ya, na wee mechie ya jiri anụ arụ na ọnọdụ ya;

16 Na site na ọgịrịga nke Chi nile ahụ wewooro site na mmadụ ahụ, ka ha kpụrụ anwanyị, wetakwara ya mmadụ ahụ.

17 Na Adam wee sị: Nkea bụụrụ ọkpụkpụ nke ọkpụkpụ m nile, na anụ arụ nke anụ arụ m; ugbụ a a ga-akpọ ya Nwanyị, n’ihi na e sitere na nwoke ahụ wepụta ya;

18 Ya mere na nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, na aga-arapara n’arụ nwunye ya, na ha ga-abụ botu anụ arụ.

19 Na ha abụọ wee bụrụ ndị gba-ọtọ, nwoke ahụ na nwunye ya, na ihere adịghị eme ha.

20 Na site n’ala Chi nile ahụ wee kpụọ anụmanụ ọbụla nke ọhịa, na anụ-ufe ọbụla nke ikuku, na wee wetara ha Adam ka ahụ ihe ọ ga-akpọ ha; na ihe ọbụla Adam kpọrọ ihe ọbụla dị ndụ e kere eke, nke ahụ ga-abụ aha nye ya.

21 Na Adam wee nye anụ-ụlọ nile aha, nye anụ-ufe nke ikuku, nye anụmanụ ọbụla nke ọhịa, na maka Adam, enwewo onye inye-aka kwesịrị ya nke a chọtaara ya.