Akwụkwọ nsọ
Abraham 1


Akwụkwọ nke Abraham

A Tụgharịrị Asụsụ ya site na Papirọs, nke Joseph Smith Tụgharịrị

Otu ntụgharị asụsụ nke ụfọdụ Akụkọ-ndekọta mgbe ochie nke dabaworo n’aka anyị site n’ili-ozu a rụrụ arụ nile nke Ijipt. Edemede nile nke Abraham mgbe ọ nọọrọ na Ijipt, a kpọrọ Akwụkwọ nke Abraham, e dere site n’aka nke ya onwe ya, n’elu papịrọs. (History of the Church [Akụkọ nke Nzukọ-nsọ], 2:235–236, 348–351.)

Isi 1

Abraham wee chọọ ngọzi nile nke usoro nke onye-isi ezi na ụlọ—Ndị nchụ-aja ụgha kpagburu ya na Kaldea—Jehova wee zọpụta ya—Isi mmalite nile na ọchịchị nile nke Ijipt ka a kọwasịrị na nke-nke.

1 N’Ala nke andị Kaldea, n’ebe obibi nke ndị nna m ha, mụ, bAbraham, wee hụ na ọ dịịrị mkpa maka m inweta ebe cobibi ọzọ;

2 Na, n’ihi na-achọpụtawo m na-enwere aan̄ụrị karịa na udo na bizu-ike maka m, m wee chọọ maka ngọzi nile nke ndị nna ha, na ihe ruru m nye nke a ga-echi m echichi ka m wee lekọta anya; n’ihi na mụ onwe m abụrụwo onye na-eso cezi-omume, n’ihi na-achọwo kwa m ịbụ otu onye nke nwere oke dmmata ihe, na ịbụ onye na-eso ezi-omume karịa, na inwe oke mmata ihe karịa, na ịbụ nna nke ọtụtụ mba, ọkpara-eze nke ụdo, na na-achọ ịnata ntuzi-aka nile, na idobe iwu-nsọ nile nke Chineke, m wee ghọọ onye nketa-oke kwesịrị ekwesị, eOnye Isi Nchụ-aja, na-ejide fihe ahụ ruru ha bụ nke ndị nna ha.

3 E anyefere ya n’isi m site n’aka ndị nna ha, o wee gbadata site n’aka ndị nna ha, site na mmalite nke oge, e, ọbụna site na mmalite, ma-ọbụ tutu ntọ-ala nke ụwa, gbada ruo n’oge nke ugbua, ọbụna ihe ahụ ruru bonye e bu-ụzọ mụọ, ma-ọbụ nwoke mbụ ahụ, onye bụ cAdam, ma-ọbụ nna nke mbụ, gafere ndị nna ha rute m.

4 M wee chọọ ainye ọkwa nke m nye Ọkwa Nchụ-aja dịka ịnye ọkwa nke Chineke nye ndị nna ha siri dị banyere mkpụrụ ahụ.

5 aNdị nna m ha ebe ha tụgharịworo site n’ezi-omume ha, na site n’iwu-nsọ nile dị nsọ nke Onye-nwe Chineke ha nyewororị ha, baa n’elu bife chi nile nke ndị na-ekweghị ekwe, wee jụ kpam-kpam in̄a nti n’olu okwu m;

6 N’ihi n’obi ha nile ka e doworo ime ihe ọjọọ, na bụrụ ndị a tụgharịworo n’ozuzu nye achi nke Elkena, na chi nke Libna, na chi nke Mamakra, na chi nke Kọrash, na chi nke Fero, eze nke Ijipt;

7 Ya mere ha atụgharịwo obi ha nile nye ịchụ-aja nke ndị na-ekweghị-ekwe n’iji ụmụ ha chụlitere arụsị ndị a na-anaghị ekwu-okwu aja, na ghara ịn̄a-nti nye olu-okwu m, mana wee gbaa mbọ iwepu ndụ m site n’aka nke onye nchụ-aja nke Elkena. Onye nchụ-aja nke Elkena bụụrụ kwa onye nchụ-aja nke Fero.

8 Ugbua, n’oge nke a ọ bụụrụ omenala nke onye nchụ-aja nke Fero, eze nke Ijipt, ịchụlite aja n’elu ebe ịchụ-aja nke e wuru n’ime ala nke Kaldea; maka onyinye nye chi nile ndị a dị iche, ndịkom, ndịnyom, na ụmụ-ntakịrị.

9 Na o wee ruo na onye nchụ-aja ahụ nyere chi nke Fero onyinye, na kwa nye chi nke Shegril, ọbụna na-ịgbaso omume nke ndị Ijipt. Ugbua chi nke Shegril bụụrụ anyanwụ.

10 Ọbuna onyinye-inye-ekele nke nwantakịrị ka onye nchụ-aja ahụ na-achụ n’elu ebe ịchụ-aja ahụ nke guzo n’agiga ugwu ahụ a kpọrọ Ugwu Potifa n’isi mbara ala nke Olishem.

11 Ugbua, onye nchụ-aja a a chụworị n’elu ebe ịchụ-aja a ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke atọ n’otu oge, ndị bụụrụ ụmụ ndịnyom nke Onita, otu n’ime ndị agbụrụ ọkwa-eze kpọmkwem site n’úkwù nile nke aHam. Ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke ka a chụlitere n’aja n’ihi ezigbo omume ha; ha enweghị ike bịkpọ isi ala ife chi nile nke osisi ma-ọbụ nke nkume, ya mere e gburu ha n’elu ebe ịchụ-aja nke a, na e mere ya na-ịgbaso omume nke ndị Ijipt.

12 Na o wee ruo na ndị nchụ-aja ahụ tụkwasịrị nnukwu ike n’arụ m jigide m, ka ha wee nwee ike gbuo kwa m, dịka ha mere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ahụ n’elu ebe ịchụ-aja nke a; na ka i nwee mmata ihe nke ebe ịchụ-aja nke a aga m atụnyere gị gaa na nnọchite-anya dị na mmalite nke akụkọ ndekọta nke a.

13 A rụrụ ya na-igbaso ụdị nke àkwà ndina, dịka ndị e nwere n’etiti ndị Kaldea, na o guzooro n’iru chi nile nke Elkena, Libna, Mamakra, Korash, na kwa na otu chi dịka nke ahụ bụ nke Fero, eze nke Ijipt.

14 Ka unu wee nwee nghọta nke chi nile ndị a, Enyewo m gị nnọchite anya nke ha n’ime ihe e sere-ese dị na mmalite, nke ụdị esere-ese ndị a nke ndị Kaldea kpọrọ Raleenịs, nke na-egosi hiroglifiks.

15 Na dịka ha welitere aka ha nile n’arụ m, ka ha wee chulite m ma wepụ ndụ m, lee m wee welite olu-okwu m elu nye Onye-nwe Chineke m, na Onye-nwe wee an̄aa nti ma nụrụ, na o mejupụta m jiri ọhụ nke Onye Pụrụ Ime Ihe nile, na mụọ-ozi nke iru ya wee guzogide m, na otu ntabi-anya ọ btọhapụrụ agbụ m nile.

16 Na olu-okwu ya na-adara m: Abraham, Abraham, lee, aaha m bụ Jehova, na anụwo m olu gị, na gbadawo ịnapụta gị, na ikpọrọ gị pụọ site n’ụlọ nke nna gị, na site na ndị ikwu gị nile, baa n’ime otu bmba dị iche nke gị onwe gị na-amataghị maka ya;

17 Na nke a bụ n’ihi na ha a tụgharịwo obi ha nile pụọ site na m, ife chi nke Elkena, na chi nke Libna, na chi nke Mamakra, na chi nke Korash, na chi nke Fero, eze nke Ijipt; ya mere a gbadatawo m ileta ha, na ibibi ya bụ onye ahụ nke weliteworo aka ya imegide gị, Abraham, nwa m nwoke, iwepụ ndụ gị.

18 Lee, aga m eduzi gị ụzọ site n’aka nke m, na aga m e were gị, ịtụkwasị aha nke m n’elu gị ọbụna aỌkwa Nchụ-aja nke nna gị, na ike m ga-adị n’arụ gị.

19 Dịka ọ diiri n’ebe Noa nọ otu ahụ ka ọ ga-adị n’ebe ị nọ; mana site n’ije-ozị gị a ga-amara aaha m n’ime uwa ruo mgbe nile, n’ihi na Abụ m Chineke gị.

20 Lee Ugwu Potifa dịịrị n’ala nke aUa, nke Kaldea. Na Onye-nwe kụdara ebe ịchụ-aja nke Elkena, na nke chi nile nke ala ahụ, na bibie ha kpam kpam, na tie onye nchụ-aja ihe otiti nke na ọ nwụrụ; na e wee nwee nnukwu iru-uju na Kaldea, na kwa n’ime obi-ikpe nke Fero; nke “Fero” na-egosị “ịbu-eze site n’ọbara nke ọkwa-eze.”

21 Ugbua eze nke a nke Ijipt bụụrụ nwa nwa sitere n’úkwù nile nke aHam, na bụụrụ onye nketa oke nke ọbara nke bndị Kenean site n’ọmụmụ.

22 Site n’agbụrụ nke a ka ndị Ijipt kulitere, na si otua ka e chekwara ọbara ndị Kenean n’ime ala ahụ.

23 Ala nke aIjipt bụ nke otu nwanyị chọpụtara na mbụ, onye bụụrụ nwa nwanyị nke Ham, na nwa nwanyị nke Ijpitus, nke pụtara Ijipt n’asụsụ ndị Kaldea, nke na-egosị nke ahụ e gbochiri;

24 Mgbe nwanyị a chọpụtara ala ahụ ọ dịịrị n’okpuru mmiri, onye mgbe e mesịrị mere ka ụmụ ya ndịkom biri n’elu ya; na si otua, site na Ham, ka agbụrụ ahụ kulitere nke chekwara ịbụ-ọnụ ahụ n’ala ahụ.

25 Ugbua ọchịchị mbụ nke Ijipt bụ Fero hiwere ya, nwa nwoke nke kachasị okenye nke Ijiptus, ada nwanyị nke Ham, na ọ bụụrụ na-ịgbaso omume nke ọchịchị nke Ham, nke bụụrụ nke onye-isi ezi na ụlọ.

26 Fero, n’ihi na ọ bụụrụ onye ezi-omume, hiwere ala-eze ya na kpee ndị ya ikpe n’amamihe na izi-ezi ụbọchị nile nke ya, chọsiri ike in̄omi usoro ahụ nke ndị nna ha hiwere n’ọgbọ nile nke mbụ, n’ụbọchị nile nke ọchịchị ndị isi ezi na ụlọ mbụ, ọbụna n’ọchịchị nke Adam, na kwa nke Noa, nna ya, onye gọziworo ya jiri angọzi nile nke ụwa, na jiri ngọzi nile nke amamihe, kama bụrụ ya ọnụ gbasara ọkwa nchụ-aja ahụ.

27 Ugbua, Fero n’ihi na o si na agbụrụ ahụ nke na ọ gaghị enwe ihe ruru ya site an’Ọkwa Nchụ-aja, na-agbanyeghị ndị Fero nwekwara mmasị iweghara ya site n’aka Noa, site na Ham, ya mere ha duhiere nna m site na-ife arụsị ha;

28 Mana a ga m agba mbọ, ma e mesịa ugbua, ịkọwadaru-ala usoro oge, ebe nile, na ihe omume nile na-agbaghachi azụ site na mụ onwe m ruo na mmalite nke okike, n’ihi na aakụkọ ndekọta nile ahụ a bịawo n’aka m nile, bụ nke m jidere ruo oge nke ugbụ a.

29 Ugbụ a, mgbe e tisịrị onye nchụ-aja nke Elkena ihe otiti nke na ọ nwụrụ, ebe ahụ ka ọ bịara na mmezu bụ ihe ndị ahụ nile nke e kwuworo nye m gbasara ala ahụ nke Kaldea, na a ga-enwe ụnwụ n’ime ala ahu.

30 Dịka-ọdị ụnwụ gara n’iru wee dị gazuo ala ahụ nile nke Kaldea, na nna m ka a tara nnukwu ahụhụ n’ihi ụnwụ ahụ, na o wee chegharịa maka ihe ọjọọ nke ọ zubeworo megide m, bụ iwepụ andụ m.

31 Mana akụkọ nke ndị nna ha, ọbụna ndị-isi ezi na ụlọ, gbasara ịhe ruru onye nke Ọkwa N̄chụ-aja, Onye-nwe Chineke m chekwara ya n’ime aka nke mụ onwe m; ya mere mmata ihe nke mmalite nke okike, na kwa nke aurukpu nile, na nke kpakpando nile, dịka ekpughere ha nye ndị nna ha, ka m debeworo ruo ụbọchị nke taa, na aga m agba mbọ ide ụfọdụ n’ihe ndị a n’elu akụkọ ndekọta nke a, maka ọdị-mma nke ụmụụmụ m nke ga-esochi m.