Ala nile nke Onye-nwe kwere nkwa dịka ihe nketa nye ndị nsiso ya nile nwere okwukwe, na n’ọtụtụ mgbe nye kwa ụmụ ụmụ ha. E nwere ọtụtụ ala nile e kwere na nkwa. Ọtụtụ mgbe n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, ala ahụ e kwere na nkwa nke e kwuru maka ya bụ Amerika nile.
Mkpụrụ gị ka m ga-ewere ala nke a nye, Jen. 12:7 (Abr. 2:19 ).
M ga-enye gị, nye kwa mkpụrụ gị ala Kenean, Jen. 17:8 (Jen. 28:13 ).
Moses kpara oke ala ahụ nile na Kenean maka Israel, Ọnọgụ. 34:1–12 (Ọnọgụ. 27:12 ).
A ga-edụga unu n’ala ekwere na nkwa, 1 Nif. 2:20 (1 Nif. 5:5 ).
Onye-nwe na-eduba ndị ezi-omume baa n’ime ala dị oke ọnụ ahịa, 1 Nif. 17:38 .
Ọbụrụ na ụmụ ụmụ Lihaị edebe iwu-nsọ nke Chineke, ha ga-enwe ọgan’iru n’ala nke ekwere na nkwa, 2 Nif. 1:5–9 .
Israel ga-alaghachi n’ala nile e kwere ha na nkwa, 2 Nif. 24:1–2 (Aịsa. 14:1–2 ).
Na mba ọbụla ga-enwere ala nke a e kwere na nkwa ga-ejere Chineke ozi, ma-ọbụ a ga-azachapụ ha, Ita 2:9–12 .
Nke a bụ ala ekwere na nkwa, na ebe bụ maka obodo-ukwu nke Zaịọn, OznỌd. 57:2 .
Juda nwere ike malite ịlọghachi n’ala nile nke Abraham, OznỌd. 109:64 .