Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Josef, Nwa-nwoke nke Jekọb


Josef, Nwa-nwoke nke Jekọb

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke mbụ nke Jekọb na Rechel mụrụ (Jen. 30:22–24; 37:3).

Josef nwetara ọnọdụ ọkpara n’Israel n’ihi Ruben, nwa-nwoke mbụ nke nwunye mbụ Jekọb mụrụ, tufuru ohere ahụ site na njehie (1 Ihem. 5:1–2). N’ihi na o tozuru oke, Josef dịka nwa-nwoke mbụ nke nwunye nke abụọ Jekọb, bụụrụ onye ọzọ na-eso maka ngọzi ahụ. Josef natakwara ngọzi site n’aka nna ya mgbe nta tutu Jekọb a nwụọ (Jen. 49:22–26).

Josef bụụrụ nwoke nwere nnukwu omume, otu onye “na-akpachapụ-anya na nweekwa amamihe” (Jen. 41:39). Ọjụjụ nke ọ jụrụ nwunye Potifa bụ otu ịma-atụ nke okwukwe, ịdị-ọcha mmekọrịta na izu-oke nke onwe ya (Jen. 39:7–12). N’Ijipt mgbe Josef kpugheere ụmụnne ya onye ọbụ n’ezie, o kelere ha ekele kama ịta ha ụta n’ihi otu ha siri meso ya. O kwenyere na omume ha nile nyere aka imezu uche nsọ Chineke (Jen. 45:4–15).

Mkpughe ụbọchị-ikpeazụ kpughere ịdị ukwuu karịa nke mgbasa-ozi nke ezi na ụlọ Josef n’ụbọchị ndị ikpe-azụ (2 Nif. 3:3–24; 3 Nif. 20:25–27; NAJS, Jen. 50).