Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọpụpụ


Ọpụpụ

Otu akwụkwọ Moses dere n’ime Testament Ochie na-akọwa ọpụpụ nke ndị Israel site n’Ijipt. Mmalite akụkọ nke Israel dịka e dekọtara ya n’Ọpụpụ ka e nwere ike kewaa akụkụ ato: (1) Ịrụ oru nke ndị ahụ nye Ijipt, (2) ọpụpụ ha site n’Ijipt n’okpuru nduzi Moses, na (3) Itinyecha onwe ha n’Ofufe Chineke n’ime ndụ okpukpe chi ha na ndụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha.

Akụkụ nke mbụ, Isi nile nke 1–15, na-akọwa mmegide e megidere Israel n’Ijipt; mmalite akụkọ ahụ na ọkpụkpọ nke Moses; Ọpụpụ ahụ dum na nhiwe nke Ngabiga ahụ, na ịzọ njem gaa n’oke osimiri Uhie, mbibi nke ndị-agha Fero, na ábụ̀ nke Moses bụrụ maka mmeri.

Akụkụ nke abụọ, Isi nile nke 15–18 na-akọ maka mgbapụta Israel na ihe nile mere na njem ahụ site oke Osimiri Uhie rute na Sainai; Mmiri nile na-elu ilu nke Mara, onyinye nke nnụnụ quail nile na Manna, ndọbe nke ụbọchị izu-ike, ọrụ ebube nke onyinye mmiri na Refidim, na agha ndị Amalek busoro ha ebe ahụ; mbiaru nke Jetro n’ụlọ ikwuu na ndụmọdụ ya banyere ọchịchị nkịtị nke ndị ahụ.

Akụkụ nke atọ, isi nile nke 19–40 gbasara Ido Israel nsọ nyefee ofufe Chineke n’oge ihe omume nile dị ezigbo mkpa na Sainai. Onye-nwe doro ha iche ka ala-eze ndị nchụ-aja na mba dị nsọ; O nyere Iwu-nsọ Iri; ma onyekwara ntụzi-aka banyere ụlọ-ọfụfụ ahụ, ngwo-ngwo a ga-etinye na ya, na ofufe a ga-efe n’ime ya. Mgbe ahụ ihe sochiri bụ nkọwasị nke mmehie ndị ahụ banyere isekpuru otu nwa ehi ọla-edo, na n’ikpe-azụ nkọwasi nke iwu ụlọ-ofufe ahụ na ihe nile kwesịrị ofufe ya nile.