Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ekwensu


Ekwensu

Setan. Ekwensu ahụ bụ onye iro nke ezi omume na nke ndị ahụ na-achọ ime uche-obi Chineke. Ọ bụ nwa-nwoke Chineke mụrụ na mụọ, na o nwekwara otu mgbe ọ bụụrụ mụọ-ozi nwere ikike n’iru Chineke (Aịsa. 14:12; 2 Nif. 2:17). Otu o sila di, o nupuru isi n’ụwa nke ndụ tutu e nwee anụ arụ na kwagide otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụ Nna ahụ mụrụ na mụọ ka ha soro nupu-isi (OznỌd. 29:36; Moses 4:1–4; Abr. 3:27–28). Chineke chụpụrụ ha site n’elu-igwe, a gọnariri ha ohere inweta arụ na-anwụ anwụ na inweta uche banyere ndụ nke arụ na-anwụ anwụ, na a ga-ama ha ikpe ọkụ ala mụọ ebighi-ebi. Site n’oge ahụ a chụpụrụ ekwensu, ọ na-achọ na-akwụsịghị akwụsị iduhie ndịkom na ndịnyom nile na duru ha pụọ site n’ọrụ nke Chineke iji mee ka mmadụ nile nọdụ n’ọnọdụ nhuju anya dịka ya onwe ya dị (Mkpu. 12:9; 2 Nif. 2:27; 9:8–9).

Nzukọ nke ekwensu

Ajọọ ọgbakọ ụwa nile nke na-eduhie ụzọ nke ozi-ọma na-enweghi ntụpọ zuru oke, ma na-alụ ọgụ megide Nwa-atụrụ nke Chineke.