Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Temple, Ụlọ nke Onye-nwe-anyị


Temple, Ụlọ nke Onye-nwe-anyị

Ụlọ nke Onye-nwe n’ezie. Onye-nwe oge nile na-enye ndị ya iwu ka ha wuo temple nile, ụlọ nile dị nsọ nke Ndị-nsọ tozuru oke na-eme mmemme nile dị nsọ na emume-nsọ nke ozi-ọma n’ime ya maka onwe ha na maka ndị nwụrụ anwụ. Onye-nwe na-eleta temple ya nile, ha bụkwa ebe nile kachasị nsọ maka ofufe.

Ụlọ-ofufe ahụ nke Moses na ụmụ nke Israel wulitere bụụrụ otu temple dị nke nke. Ndị Israel jigidere ya n’ime oge ọpụpụ ha site n’Ijipt.

Temple kachasị mma a maara nke ọma a kpọtụrụ aha n’ime Bible bụ nke ahụ Solomọn wuru na Jerusalem (2 Ihem. 2–5). E bibiri ya n’afọ 600 tutu a mụọ Kraịst site n’aka ndị Babịlọn ma Zerubabel weghachiri ya ọfọdụ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ mgbe e mesịrị (Ezra 1–6). Mpaghara temple a ka a gbara ọkụ n’afọ 37 tutu a mụọ Kraịst, Nnukwu Eze Herọd wugharịrị ya mgbe e mesịrị. Ndị Rom bibiri temple ahụ n’afo 70 mgbe a mụsịrị Kraịst.

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, ndị ezi-omume na-eso Chineke ka e duziri ka ha wuo ma fee ofufe n’ime temple nile (2 Nif. 5:16; Mosa. 1:18; 3 Nif. 11:1). Iwu na iji temple mee ofufe n’ụzọ ziri-ezi bụ ihe iriba-ama nile nke ezi Nzukọ-nsọ n’ime ọgbọ ọbụla, tinyere Nzukọ-nsọ e weghachiri-azụ n’ụbọchị nke anyị. Temple nke Kirtland bụụrụ temple nke mbụ e wuru ma tinye n’ọrụ chukwu nye Onye-nwe n’ime ọgbọ nke a. Ke mgbe oge ahụ e nyefewo n’ọrụ chukwu temple nile n’ime ala nile gazuo elu ụwa.