Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Akwụkwọ nke Mọmọn


Akwụkwọ nke Mọmọn

Otu n’ime ùkwù akwụkwọ nsọ anọ ahụ nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a nabatara. Ọ bụ na mkpirisi ndekọta nile sitere n’aka onye-amụma mgbe ochie aha ya bụ Mọmọn nke ndị agba ochie biri na Amerika. E dere ya iji gbaa ama na Jisus bụ Kraịst-ahụ. Gbasara ndekọta nke a, Onye-amụma Joseph Smith, onye tụgharịrị asụsụ ya site n’onyinye na ike Chineke, sịrị “Agwara m ndị ụmụnna ahụ na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akwụkwọ a kachasịrị dezie edezie karịa akwụkwọ ọbụla n’elu ụwa na isi oke nkume nke okpukpe chi anyị, na mmadụ ga-abịa Chineke nso site na-ịnọgide n’usoro iwu ya, karịa n’akwụkwọ ọbụla ọzọ” (hụ okwu mmalite di n’iru Akwụkwọ nke Mọmọn).

Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ndekọta nke okpukpe chi nke òtù ndị mmadụ atọ ndị sitere n’ụwa ochie kwafee obi na nnukwu Ala Amerika nile. Òtù ndị a nile ka ndị amụma duuru bụ ndị dekọtara akụkọ nile nke okpukpe chi na nke ụwa ha n’epekele ọla igwe nile. Akwụkwọ nke Mọmọn dekọtara nleta nke Jisus Kraịst nye ndị nọ na Amerika n’isochi mbilite ya site na ọnwụ. Narị afọ abụọ nke udo sochiri nleta Kraịst ahụ.

Moronaị, onye ikpe-azụ n’ime ndị amụma ọkọ-akụkọ nile nke Nifaị rachiri nde kọta akụkọ a na mkpirisi nke ndị mmadụ a, ma zoo ha n’afọ dịka 421 mgbe a mụchara Kraịst. Na 1823, Moronaị onye biliworo n’ọnwụ letara Joseph Smith na mesịa nyefee ya akụkọ ndekọta ochie nile ndị a dị nsọ ka a tụgharịa asụsụ ha na weta ha nye ụwa dịka Ịgba-ama ọzọ nke Jisus Kraịst.