Otu àkàrá nke ikwu-okwu. Ndị-nsọ ga-achịkwa ire ha nile, nke pụtara na ha ga-achịkwa ikwu okwu ha. Ire na kwa atụnyere asụsụ nile na mmadụ nile. Mgbe emesịrị, ikpere ọbụla ga-ehulata ma ire ọbụla ekwupụta nye Chineke (Aịsa. 45:23 ; Ndị-Rom 14:11 ).
Chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, Abụọma 34:13 (1 Pita 3:10 ).
Onye na-edebe ọnụ ya na ire ya na-edebe mkpụrụ-obi ya site na nsogbu nile, Ilu 21:23 .
Ọ bụrụ na onye ọbụla adịghị akwa ire ya nga, okpukpe Chineke nke onye a bụ ihe-efu, Jemes 1:26 .
Ọ bụrụ na onye ọbụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru oke, Jemes 3:1–13 .
Ozi-ọma ahụ ka a ga-ezisara mba nile ọbụla, ebo nile ọbụla ire, na ndị mmadụ, Mkpu. 14:6–7 (2 Nif. 26:13 ; Mosa. 3:13, 20 ; OznỌd. 88:103 ; 112:1 ).
Onye-nwe na-enye mba nile, site na mba nke onwe ha na ire ikuzi okwu ya, Alma 29:8 .
Epekele nile ndị a ga-aga ruo mba ọbụla, ebo, ire, na ndị mmadụ, Alma 37:4 .
Nweta okwu m, mgbe ahụ kwa ka a ga-atọghepụ ire gị, OznỌd. 11:21 .
Onye ọbụla ga-anụrụ uju nke ozi-ọma n’ire nke ya, OznỌd. 90:11 .