Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Gbaghara


Gbaghara

Dịka e jiri ya n’akwụkwọ-nsọ nile, ịgbaghara n’ọha putara otu n’ime ihe abụọ: (1) Mgbe Chineke gbaghaara ndị mmadụ, ọ na-akagbu ma-ọbụ wezuga ntaram-ahụhụ a chọrọ ita n’ihi mmehie. Site n’aja mmehie ahụ nke Kraịst, mgbaghara mmehie ka a na-eme ka o rute ndị nile na-echegharị, ewezuga ndị ahụ a mara ikpe maka igbu mmadụ ma-ọbụ mmehie ahụ na-enweghị mgbaghara nke e mere megide Mụọ Nsọ. (2) Ka ndị mmadụ na-agbaghara onye na ibe ya, ha na-eji ụdị ihụnanya ahụ nke Kraịst na-emeso onye ọbụla na ibe ya na ghara inwe nnyocha nile dị njọ n’ebe ndị ahụ bụ ndị mehiere ha nọ (Mat. 5:43–45; 6:12–15; Luk 17:3–4; 1 Nif. 7:19–21).