Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Hosea


Hosea

Otu onye-amụma Testament Ochie onye buru amụma na mpaghara elu elu ala-eze nke Israel n’oge ikpe-azụ nke ichi-eze nke Jeroboam II. O biri ndụ n’oge e nwere ịla azụ na mbibi nke mba, nke bụ ihe na-eso mmehie nke Israel.

Akwụkwọ nke Hosea

Isi okwu akwụkwọ ahụ bụ ihụnanya nke Chineke maka ndị ya. Nnukwu ahụhụ nile ya ka o nyere n’ime ihụnanya, na ndozighari nke Israel ga-abụ n’ihi ịhụnanya ya (Hosea 2:19; 14:4). N’itule, Hosea gosiri aghụghọ nke Israel na ekweghị-ekwe ya. Na-agbanyeghị Chineke nwekwara ike na-elepụ anya n’iru maka mgbapụta nke Israel n’ikpe-azụ (Hosea 11:12–14:9).