Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ezra


Ezra

Otu onye nchụ-aja na ede akwụkwọ nke Testament Ochie, onye kpọghachiri ụfọdụ ndị Juu azụ gaa na Jerusalem site na ndọkpụ n’agha ndị Babịlọn (Ezra 7–10; Neh. 8, 12). N’afọ 458 tutu a mụọ Kraịst, O nwetara nkwenye site n’aka Ataksakses, Eze nke Pesia ịkpọrọ ndị Juu ọbụla a chụpụrụ chọrọ igaru Jerusalem jee (Ezra 7:12–26).

Tutu oge Ezra, ndị nchụ-aja ka ọ fọdụrụ obere ka ha nwerechaa ike ituzi-aka banyere Ịgụputa nchịkọta akwụkwọ-nsọ nile e dere ede nke a kpọrọ “iwu”. Ezra nyere aka ime ka akwụkwọ nsọ nile ahụ na-erute onye Juu ọbụla. Ngụpụta nke “akwụkwọ nke iwu” ahụ na mbara mechara bụrụ etiti obibi ndụ nke mba ndị Juu. Ikekwe, nkụzi Ezra kachasị ukwuu sitere na-ima atụ nke onwe ya site na-ikwado-be obi ya ịchọ iwu nke Onye-nwe, irubere ya isi, na ikuziri ya ndị ọzọ (Ezra 7:10).

Akwụkwọ nke Ezra

Isi nile nke 1–6 na-akọwa nke ọma ihe nile mere site n’Iri afọ isii ruo Iri afọ asatọ tutu Ezra a bịaruo na Jerusalem. Iwu-ọkụ nke Sairọs n’afo 537 tutu a mụọ Kraịst na kwa nlọta nke ndị Juu n’okpuru Zerubabel. Isi nile nke 7–10 na-egosi otu Ezra si garuo Jerusalem. Ya, tinyere ndị ha na ya so buru ọnụ na kpee ekpere maka nchekwa. Na Jerusalem ha chọtara ọtụtụ ndị Juu ndị na-agawori Jerusalem gboo n’okpuru Zerubabel na lụkwaarị ndịnyom na-abụghị n’ime ọgbụgba-ndụ ahụ, na si otu a merụọ onwe ha nile. Ezra kpere ekpere maka ha na tinye ha n’okpuru ọgbụgba-ndụ ịchụpụ ndị nwunye nile ahụ. Akụkọ ikpe-azụ nke Ezra ka a ga-achọta n’akwụkwọ nke Nehemaia.