Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụlọ-akwụkwọ nke ndị amụma


Ụlọ-akwụkwọ nke ndị amụma

Na Kirtland, Ohio (United Steeti nile nke Amerika), n’oge oyi na-atụ nke 1832–1833, Onye-nwe nyere Joseph Smith iwu ka ọ hazie otu ụlọ-akwụkwọ maka nzube nke ịzụ ụmụ nna n’ihe nile gbasara ozi-ọma ahụ na ala-eze Chineke. Site n’ụlọ akwụkwọ a ka ọtụtụ ndị ndu gboo nke Nzukọ-nsọ siri bịa. Ụlọ akwụkwọ ọzọ nke ndị-amụma ma-ọbụ ndị okenye ka Parley P. Pratt haziri na Ógbè Jackson, Missouri (OznỌd. 97:1–6). Ụdị ụlọ akwụkwọ nile dị otua ka e nwekwara, mkpirisi oge Ndị-nsọ kwafesịrị na mpaghara Ọdịda-anyanwụ; otu o sila dị o teghị anya a kwụsịrị ndị a. Nkụzi nke ozi-ọma taa ka a na-eme n’ebe obibi, ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nile nke ọkwa nchụ-aja, na ọtụtụ ọgbakọ enyem-aka nile, na site na ụlọ akwụkwọ nile nke Nzukọ-nsọ na seminary na ebe ịmụ akwụkwọ nile nke institute.