Okwu ma-ọbụ ihe aka-ebe ọzọ n’ihe bụ ezi-okwu; otu ịgba-ama. Onye aka-ebe nwekwara ike ịbụ onye ahụ nke na-ekwu ụdị okwu ahụ ma-ọbụ ihe aka-ebe gbadoro ụkwụ na mmata ihe nke onwe; nke bụ, onye ahụ nke na-agba-ama.
A ga-ekwusa kwa ozi-ọma nke a n’elu ụwa dum, ka ọ bụrụ aka-ebe nye mba nile, Mat. 24:14 (JS—Mat. 1:31 ).
Unu ga-abụrụ m ndị aka-ebe, Ọlndoz. 1:8 .
Mụọ Nsọ n’onwe ya soro mụọ anyị n’agba ama, Ndị-Rom 8:16 (1 Jọn 5:6 ).
Unu dị na njikere iguzo dịka ndị aka-ebe nke Chineke n’oge nile, Mosa. 18:8–9 .
Anyị na-eso keta oriri-nsọ iji gbaara Nna ahụ aka-ebe n’anyị ga e dobe iwu-nsọ nile ahụ, na n’echeta Jisus oge nile, 3 Nif. 18:10–11 (Moro. 4, 5 ; OznỌd. 20:77–79 ).
Unu enwetaghị aka-ebe ruo mgbe a nwalesiworo okwukwe unu, Ita 12:6 .
Iwu nke aka-ebe: n’ọnụ ndị aka-ebe abụọ ma-ọbụ atọ ka a ga-ehiwe okwu ọbụla, OznỌd. 6:28 (Deut. 17:6 ; Mat. 18:16 ; 2 Ndị-Kọ 13:1 ; Ita 5:4 ; OznỌd. 128:3 ).
E chiwo m unu echichi ma mee unu Ndị-ozi, na ndị aka-ebe pụrụ iche nke aha m, OznỌd. 27:12 (OznỌd. 107:23 ).
Ndị Iri Asaa ahụ ka a kpọrọ ka ha bụrụ ndị aka-ebe pụrụ iche nye ndị Jentaịlụ na n’ime ụwa nile, OznỌd. 107:25 .
Ka e nwee onye na-edekọta akụkọ ka ọ bụrụ onye aka-ebe na baptism nile unu, OznỌd. 127:6 (OznỌd. 128:2–4 ).