Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Manase


Manase

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke nke kachasị okenye nke Asenat na Josef onye nke e rere baa n’Ijipt (Jen. 41:50–51). Ya na nwanne ya nwoke Ifrem bụụrụ ụmụụmụ nke Jekọb (Israel) mana ha ka ọ kpọọrọ gụọ ka ụmụ ya na gọzie dịka ha bụụrụ ụmụ ndịkom nke ya (Jen. 48:1–20).

Agbụrụ nke Manase

A gụnyere ụmụ ụmụ Manase n’etiti agbụrụ nile nke Israel (Ọnọgụ. 1:34–35; Josh. 13:29–31). Ngọzi Moses nye agbụrụ Josef, nke e nyekwara Ifrem na Manase, ka e dekọtara na Deuteronọmị 33:13–17. Ala nke e nyefere ha dịịrị mpaghara na ọdịda-anyanwụ nke Jọdan na nke na-esota nke Ifrem. Ha nwekwara obodo ndị ọzọ ha na-achị ndị dị n’Ọwụwa anyanwụ nke Jodan n’ime ala ịkpa-akụ nke Bashan na Gilead. N’ụbọchị ndị ikpe-azụ, agbụrụ nke Manase ga-enyere agbụrụ nke Ifrem aka na-ikpọkọta Israel a gbasasịrị agbasa (Deut. 33:13–17). Onye-amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn Lihaị bụụrụ onye agbụrụ Manase (Alma 10:3).