Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile n’adigide


Ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile n’adigide

Uju nke ozi-ọma nke Jisus Kraịst (OznỌd. 66:2). Ọ na-adị ọhụrụ oge ọbụla e kpughere ya ọhụrụ isochi oge nke ngọnarị okwukwe. Ọ dị mgbe nile na-adigide n’uche na ọ bụ Ọgbụgba-ndụ nke Chineke, na a na-ekpori ya n’ime ọgbọ a kara aka nke Ozi-ọma nile ebe ndị mmadụ dị na njikere inata ya. Jisus Kraịst kpughere ọgbụgba-ndụ ohụrụ na mgbe nile na-adịgide ọzọ nye ndị mmadụ n’elu ụwa site n’aka Joseph Smith onye amụma. O nwere emume-nsọ nile dị nsọ nke a na-ekwusa site n’ikike nke ọkwa nchụ-aja-dịka baptism na alụlụ di na nwunye nke-temple—nke na-enye ọnọdụ nke nzọpụta nke mmadụ, anwụghị-anwụ, na ndụ ebighi-ebi. Mgbe ndị mmadụ na-anata ozi-ọma ahụ na kwe-nkwa idobe iwu-nsọ nile nke Chineke, Chineke na-agba ndụ ya na ndị ahụ inye ha ngọzi nile nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na adịgide.