Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Okenye


Okenye

Okwu asụsụ ahụ okenye, ka e jiri mee ihe n’ọtụtụ ụzọ n’ime Bible. N’ime Testament Ochie ọtụtụ mgbe a na-atụnyere ya ndị agadi nwoke n’ime otu agbụrụ ndị a na-aranye karị ihe omume nile nke ọchịchị n’aka ha (Jen. 50:7; Josh. 20:4; Rut 4:2; Mat. 15:2). Afọ ha gbara, na uche ha nwetara site n’ihe mere eme, mere ka ndụmọdụ ha baa uru, ọnọdụ ha abụgh ọkpụkpọ-oku ọkwa nchụ-aja.

Onwekwara ndị okenye e chiri echichi n’Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek n’oge nile Testament Ochie (Ọpụ. 24:9–11). N’ime Testament Ọhụrụ, a kpọtụrụ ndị okenye ọnụ dịka ọkwa-ọrụ n’ime ọkwa nchụ-aja n’ime Nzukọ-nsọ (Jemes 5:14–15). N’etiti ndị Nifaị e nwekwara ndị okenye e chiri echichi n’ime ọkwa nchụ-aja (Alma 4:7, 16; Moro. 3:1). N’ime ọgbọ nke a, Joseph Smith na Oliver Cowdery bụụrụ ndị okenye mbụ e chiri-echi (OznỌd. 20:2–3).

Okenye ugbua bụ ọkwa a na-enye ndị nile na-eji Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek. Ịma-atụ, ndị nkwusa ozi-ọma nile ndị nwoke ka a na-agwa okwu dịka ndị okenye. N’otu aka ahụ, Onye-ozi bụ onye okenye; o zikwara ezi ikwu banyere ndị otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Iri na Abụọ, ma-ọbụ otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nile nke Iri Asaa n’ọkwa nke a (OznỌd. 20:38; 1 Pita 5:1). Ọrụ nile nke ndị okenye e chiri echi na Nzukọ-nsọ taa ka e nyeworo n’ime mkpughe ụbọchị ikpe-azụ a OznỌd. 20:38–45; 42:44; 46:2; 107:12).