Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Onye-amụma


Onye-amụma

Onye Chineke kpọrọ oku ma na-ekwuta ọnụ Chineke. Dịka onye oje-ozi nke Chineke, onye-amụma na-anata iwu-nsọ nile, amụma nile, na mkpughe nile site n’aka Chineke. Ọrụ ya bụ ime ka a mata uche-obi Chineke na ezi agwa ya nye mmadụ na igosi mpụtara mmeso ya nile n’ebe ha nọ. Onye-amụma na akatọ mmehie na n’ebu-ụzọ kwuo ihe nile n’eso ya. Ọ bụ onye na-ekwusa ozi-ọma nke ezi-omume. Oge ụfọdụ ndị amụma nwere ike nwee nkwalite nke mụọ ikwu gboo ọdịn’iru maka ọdị mma nke mmadụ. Ọrụ mbụ ya bụ igba aka-ebe maka Kraịst. Onye-isi nduzi nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nso Ụbọchị-Ikpeazụ a bụ onye-amụma Chineke n’elu ụwa taa. Ndị Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na Ndị-ozi Iri na Abụọ ka a kwadoro dịka ndị amụma, ndị ọhụ-ụzọ na ndị mkpughe.