Onye na etolite etolite, onye na erubeghị iwara-akwa. Ndị nna na ndị nne ga-azụ ụmụ-ntakịrị ka ha na-erubere uche-obi Chineke isi. Ụmụ-ntakịrị enweghi mmehie tutu ha eruo n’afọ nkọwasị (Moro. 8:22 ; OznỌd. 68:27 ).
Ewezuga ọdịda ahụ, Adam na Iv a gaaraghị enwe ụmụ-ntakịrị, 2 Nif. 2:22–23 .
Kuziere ụmụ-ntakịrị ka ha na-aga n’ụzọ nke ezi-okwu na anya-udo, Mosa. 4:14–15 .
Ụmụ-ntakịrị nwere ndụ ebighi-ebi, Mosa. 15:25 .
Jisus wee kuru ụmụ-ntakịrị ma gọzie ha, 3 Nif. 17:21 .
Ụmụ-ntakịrị gị nile ka a ga-akụziri ihe site n’aka Onye-nwe, ma ukwuu ka udo nke ụmụ gị ga-adị, 3 Nif. 22:13 (Aịsa. 54:13 ).
Ụmụ-ntakịrị achọghị nchegharị ma-ọbụ baptism, Moro. 8:8–24 .
Ụmụ-ntakịrị ka a gbapụtaworo site na ntọ-ala nke ụwa site n’onye nke m Mụrụ Nani ya, OznỌd. 29:46–47 .
Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ikuziri ụmụ-ntakịrị ha ụkpụrụ nile nke ozi-ọma na omume ya, OznỌd. 68:25, 27–28 .
Ụmụ-ntakịrị dị nsọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst, OznỌd. 74:7 .
Ndị mụrụ ụmụ ka e nyere iwu ka ha na-azụlite ụmụ-ntakịrị n’ihè na ezi-okwu, OznỌd. 93:40 .
Ụmụ-ntakịrị ndị na-anwụ tutu afọ nke nkọwasị ka a zọpụtara n’ime ala-eze Selestịal, OznỌd. 137:10 .